Jeroboam N’ime Testament Ochie, Jeroboam bụụrụ onye eze nke mbụ nke mpaghara elu-elu Israel e kere abụọ. Ọ bụụrụ onye agbụrụ Ifrem. Ajọọ mmadụ Jeroboam duru nnupụ-isi megide ụlọ nke Juda na ezi na ụlọ nke Devid. Jeroboam wuwara arụsi-apiri-apị nile ka ndị bi na Dan na Betel na efe ha ofufe, 1 Ndez. 12:28–29. Ahija baara Jeroboam mba, 1 Ndez. 14:6–16. Echetara Jeroboam n’ihi na o wetara mmehie jọrọ njo n’Israel, 1 Ndez. 15:34 (1 Ndez. 12:30).