Ndidi Hụ kwa Dị nwayọ, Ịdị nwayọ; Nọgide Inọgide na-idi juu; inwe ike nke ịnọgide na mkpagbu, mkparị, ma-ọbụ mmeru-arụ na-enweghị mkpesa ma-ọbụ imegwara. Nọdụ n’arụ Onye-nwe, ma nwee kwa ntachi-obi na-echere ya, Abụọma 37:7–8. Onye ahụ na-adịghị ewe iwe ọsọ-ọsọ nwere nnukwu nghọta, Ilu 14:29. N’ime ntachi-obi unu, unu ga-anata mkpụrụ-obi unu, Luk 21:19. Anyị nwere olile-anya site na ntachi-obi na nkasi-obi n’ihe e dere n’akwụkwọ nsọ nile, Ndị-Rom 15:4. Bụrụ nụ ndị na-eso ndị ahụ, ndị ji okwukwe na ntachi-obi na-eketa nkwa nile ahụ, Ndị-Hib. 6:12–15. Ka ntachi-obi rụzuo ezi ọrụ ya, ka unu wee tozuo oke dizuo kwa mma, Jemes 1:2–4. Unu nụrụ ihe banyere ntachi-obi nke Job, Jemes 5:11. Ha nyere onwe ha n’ọ́n̄ụ̀ na were ndidi ruo n’ọchịchọ nile nke Chineke, Mosa. 24:15. Ị nagidere ihe ndịa nile na ndidi n’ihi na Onye-nwe nọnyeere gị, Alma 38:4–5. Gaa n’iru na ndidi ruo mgbe unu zuru oke, OznỌd. 67:13.