Ogbugbu n’ihi okwukwe, Onye e gburu n’ihi okwukwe ya na Jisus Kraịst Onye na-enye ndụ ya kama ọ ga-ajụ Kraịst, ozi-ọma ahụ ma-ọbụ nkwenye ma-ọbụ ụkpụrụ ya nile nke ezi-omume. Ọbara ndị ezi-omume nile site na Ebel ruo na Zakaraịa ga-agba ama megịde ndị ajọọ mmadụ, Mat. 23:35 (Luk 11:50). Onye ọbụla nke ga-etufu ndụ ya n’ihi Kraịst na n’ihi ozi-ọma ahụ a ga-azọpụta ya, Mak 8:35 (OznỌd. 98:13). Ha wee tụọ Stifen nkume, Ọlndoz. 7:59 (Ọlndoz. 22:20). Ebe Testament dị, a ga-enwerịrị ọnwụ nke onye gbara ya, Ndị-Hib. 9:16–17. Abịnadaị dara, ebe Ọ tawororị ahụhụ ọnwụ site n’ọkụ, Mosa. 17:20. Ndị Amọnaịha ahụ a gbanwere ka a tụbara n’ime ọkụ, Alma 14:8–11. Ọtụtụ ka e gburu, n’ihi na ha gbara-ama maka ihe ndịa, 3 Nif. 10:15. Onye ọbụla nke tọgbọrọ ndụ ya n’ihi ụzọ nke m ga-achọta ndụ ebighi-ebi, OznỌd. 98:13–14. Joseph Smith na Hyrum Smith bụụrụ ndị e gburu n’ihi okwukwe ha nye mweghachi nke Ozi-ọma ahụ, OznỌd. 135. Joseph Smith jiri ọbara ya rachie ịgba-ama ya, OznỌd. 136:39.