Nwa-atụrụ nke Chineke Hụ kwa Aja mgbaghara mmehie, Ịchụ aja mgbaghara mmehie; Jisus Kraịst; Ngabiga Aha nke Onye Nzọpụta ahụ nke na-atụnyere Jisus dịka onyinye ịchụ-aja nke e nyere n’ihi anyị. A kpọtara ya dịka nwa atụrụ jee na-ogbugbụ ya, Aịsa. 53:7 (Mosa. 14:7). Lee, Nwa-atụrụ nke Chineke, nke na-ebupu mmehie nke ụwa, Jọn 1:29 (Alma 7:14). E ji ọbara nke dị oke ọnụ ahịa nke Kraịst gbapụta anyị, dịka nke nwa-atụrụ nke ntụpọ na-adịghị ya n’arụ, 1 Pita 1:18–20. O kwesịrị bụ Nwa-atụrụ ahụ nke e gbuworo egbu, Mkpu. 5:12. Anyị na-emeri Satan n’ihi ọbara Nwa-atụrụ, Mkpu. 12:11. E mere ka ndị a dị ọcha n’ime ọbara nke Nwa-atụrụ ahụ, n’ihi okwukwe ha nwere na ya, 1 Nif. 12:11. Nwa-atụrụ Chineke bụ Ọkpara nke Nna nke Ebighi-ebi, na Onye-nzọpụta nke ụwa, 1 Nif. 13:40 (1 Nif. 11:21). Kpọkuo Nna nnukwu mkpọku n’aha nke Jisus, na mgbe ụfọdụ e wee sachaa unu site n’ọbara nke Nwa-atụrụ ahụ, Mọm. 9:6 (Mkpu. 7:14; Alma 34:36). Ọkpara nke Mmadụ bụ Nwa-atụrụ ahụ ka e gbuworo site na ntọ-ala nke ụwa, Moses 7:47.