Ndụ ebigh-ebi Hụ kwa Aja mgbaghara mmehie, Ịchụ aja mgbaghara mmehie; Ebube Selestịal; Mbuli-elu; Ndụ; Okpu-eze Ibi ndụ ruo mgbe nile n’iru Chineke (OznỌd. 132:19–20, 24, 55). Ndụ ebighi-ebi bụ onyinye kachasị onyinye nile Chineke nyere mmadụ. I nwere okwu nile nke ndụ ebighi-ebi, Jọn 6:68. Nke a bụ ndụ ebighi-ebi, ka ha wee mara gị, Onye nanị gị bụ ezi. Chineke, na Jisus Kraịst, Jọn 17:3 (OznỌd. 132:24). Na-alụsi ọgụ ọma nke okwukwe ike, jide ndụ ebighi-ebi aka, 1 Tim. 6:12. Ndị mmadụ nwe onwe ha ịhọrọ inwere onwe na ndu ebighi-ebi, 2 Nif. 2:27 (Hil. 14:31). Itinye uche n’ihe nke mụọ bụ ndụ ebighi-ebi, 2 Nif. 9:39. Mgbe ahụ ka unu nọ n’ụzọ ahụ dị mkpafa nke na-eduba na ndụ ebighi-ebi, 2 Nif. 31:17–20. Ikwere na Kraịst ma nọgide ruo n’ọgwụgwụ bụ ndụ ebighi-ebi, 2 Nif. 33:4 (3 Nif. 15:9). Onye ahụ nke nwere ndụ ebighi-ebi bụ ọgaranya, OznỌd. 6:7 (OznỌd. 11:7). Ndụ ebighi-ebi bụ nke kachasị ukwuu n’ime onyinye nile nke Chineke, OznỌd. 14:7 (Ndị Rom 6:23). Ndị ezi-omume ga-anata udo n’ime ụwa nke a, na ndụ ebighi-ebi n’ụwa nke na-abịa, OznỌd. 59:23. Ndị ahụ na-anọgide ruo n’ọgwụgwụ ga-enwe okpu-eze nke ndụ ebighi-ebi, OznỌd. 66:12 (OznỌd. 75:5). Ka ha ra bụ ndị nwụworo na-amaghị maka ozi-ọma nke a, ndị gaara enweta ya ma ọbụrụ na-ekwere ka ha nọgide ga-abụ ndị nketa-oke nke ala-eze Selestịal, OznỌd. 137:7–9. Ọrụ na otuto nke Chineke ịbụ iweta na mmezu anwụghị-anwụ na ndụ ebighi-ebi nke mmadụ, Moses 1:39. Chineke na-enye ndụ ebighi-ebi nye ndị nile na-erubere ya isi, Moses 5:11.