Ọrụ mgbasa ozi-ọma Hụ kwa Kwusaa; Ozi-ọma Ikerịta ozi-ọma nke Jisus Kraịst site n’okwu na site n’ịma-atụ. Lee ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu ukwu bụ ụkwụ nke onye na-eme ka a nụrụ okwu nzọpụta, Aịsa. 52:7. Aga m achọkwa igwe atụrụ nke m ma chọpụta ha, Ezik. 34:11. Kwusaara ihe nile e kere eke ozi-ọma ahụ, Mak 16:15 (Mọm. 9:22). Ubi nile ha chara acha ugbụ a ka e weere ihe di n’ime ha, Jọn 4:35. Olee ka ha ga-esi kwusa ewezụga ma ezigara ha, Ndị-Rom 10:15. Kuziere ha okwu nke Chineke site na-ịrụsi ọrụ nile ike, Jekọb 1:19. Onye-nwe na-enye mba nile ikuzi okwu ya, Alma 29:8. Ka e nwee ike ima-ọkwa ozi-ọma ahụ site n’aka ndị na-adịghị ike na ndị dị mfe, OznỌd. 1:23. Ọrụ dị ịtụ n’anya na-aga ịpụta ìhè, OznỌd. 4:1. Ọ bụrụ na i ga-arụsi ọrụ ike n’ụbọchị gị nile ma kpọta otu mkpụrụ-obi nye mụ, Olee otu ịdị ukwuu nke on̄u gị ga-adị, OznỌd. 18:15. Ndị nke m a họpụtara na-anụ olu m ma ha a naghị eme ka obi ha sie ike, OznỌd. 29:7. Unu ga-apụ na-ezisa ozi-ọma m, abụọ abụọ, OznỌd. 42:6. Ụda ya a ghaghị ịpụ site n’ebe a, OznỌd. 58:64. Unu ga-emepe ọnụ unu n’ima-ọkwa nke ozi-ọma m, OznỌd. 71:1. Na-ama ọkwa ezi-okwu ahụ dịka mkpughe nile na iwu-nsọ nile siri dị, OznỌd. 75:4. Onye ọbụla a dọworo aka na ntị kwesịrị ka ọ dọọkwa onye agbata obi ya aka na ntị, OznỌd. 88:81 (OznỌd. 38:40–41). Onye-nwe ga-arọpụta maka ezi na ụlọ nke ndị ahụ na-ekwusa ozi-ọma, OznỌd. 118:3. Ndị odibo nile nke Chineke ga-aga n’iru, OznỌd. 133:38. Ndị okenye nile kwesịrị ntụkwasị obi, mgbe ha na-ahapụ ndụ nke arụ na-anwụ anwụ, na-aga n’iru n’ọrụ ha nile, OznỌd. 138:57.