Ebu-ụzọ chie echichi Hụ kwa Ndụ tutu e nwee anụ arụ Echichi Chineke chiri ụmụ ya na mụọ dị ike ka ha mejupụta ụfọdụ mgbasa ozi nile n’oge ndụ ha n’arụ na-anwụ anwụ. Chineke hiwere ókè nile nke ndị nile, Deut. 32:8. Tutu akpụọ m gị n’ime afọ E chiwo m gị echichi ịbụ onye amụma, Jer. 1:5. Chineke e debesiwo oge a kaworo aka, Ọlndoz. 17:26. N’ihi na ndị o buru ụzọ mara, o bụ kwara ụzọ kaa ha àkà, Ndị-Rom 8:28–30. Ọ họpụtara anyị n’ime ya tutu a tọọ ntọ-ala nke ụwa, Ndị-Efe. 1:3–4. Jisus Kraịst ka eburu ụzọ chie echichi ịbụ onye mgbapụta ahụ, 1 Pita 1:19–20 (Mkpu. 13:8). A kpọrọ ha ma kwadowe ha site na ntọ-ala nke ụwa, Alma 13:1–9. M wee leta ndị a maara ama na ndị dị ukwuu ndị a họọworo na mmalite, OznỌd. 138:55–56. Ọkpara m Hụrụ n’Anya ma họrọwo site na mmalite, Moses 4:2. Abraham ka a họrọworị tutu a mụọ ya, Abr. 3:23.