Chineke Kpọrọ, Kpọọ-oku, Ọkpụkpọ-oku Hụ kwa Chie echichi, Echichi; Họpụtaworo (nkọwa-aha ma-ọbụ aha); Họrọ, Họọrọ, Họrọworo (ngwaa); Ikike; Ọkwa-ọru, Onye-ọrụ Ịbụ onye Chineke kpọrọ bụ inweta ọkwa ma-ọbụ ọkpụkpọ-oku site na ya ma-ọbụ ndị ndu nke Nzukọ-nsọ o nyere ikike ijere ya ozi n’ụzọ pụrụ iche. O wee bikwasị aka ya nile n’isi ya ma nye ya iwu, Ọnọgụ. 27:23. M wee chie gị ịbụ onye-amụma, Jer. 1:5. Ahọpụtawo m unu ma chie unu echichi, Jọn 15:16. Pọl ka a kpọrọ ịbụ Onye-ozi, Ndị-Rom 1:1. Ọdịghị onye na-ewere ùgwù nke a nye onwe ya ma ọ bụghị onye Chineke kpọrọ, Ndị-Hib. 5:4. Jisus bụ onye Chineke kpọrọ dịka usoro Melkizedek siri dị, Ndị-Hib. 5:10. A kpọwo m ikwusa okwu Chineke dịka mụọ nke mkpughe na ibu amụma, Alma 8:24. Ndị nchu-aja ka a kpọrọ ma kwadobe site na ntọ-ala nke ụwa, Alma 13:3. Ọ bụrụ na i nwere ọchichọ nile ijere Chineke ozi, Ị bụ onye akpọrọ, OznỌd. 4:3. Guzo sie ike n’ọrụ ahụ nke m kpọọrọ gị nye, OznỌd. 9:14. Ị kwesighi iche na-akpọrọ gị ikwusa ozi-ọma rue mgbe a kpọrọ gị, OznỌd. 11:15. Ndị Okenye ka a kpọrọ iweta na mmezu mkpọkọta nke ndị a họrọ ahọ, OznỌd. 29:7. Ọ dịghị onye ọbụla ga-ekwusa ozi-ọma m ma-ọbụ wulie Nzukọ Nsọ m elu ma-ọbụghị onye echiri echichi, OznỌd. 42:11. Ọtụtụ bụ ndị a kpọrọ ma ole na ole ka a họọrọ, OznỌd. 121:34. A ga-akpọ mmadụ site na Chineke, Ndep. Ok 1:5.