Ije-ozị Hụ kwa Ịhụ n’anya; Ọdịmma Nlekọta anya e nyere ma-ọbụ ọrụ arụrụ maka ọdịmma nke Chineke na ndị-ọzọ. Dịka anyị na-ejere ndị-ọzọ ozi, anyị na kwa ejere Chineke ozi. Họpụtara nụ onwe unu n’ụbọchị taa onye unu ga-efe ofufe, Josh. 24:15. Ọbụrụraa na unu emewo ya nye otu n’ime ndịa dịkasịrị nta, mụ ka unu mere ya nye, Mat. 25:35–45. Chee nụ arụ unu nile n’iru Chineke dịka aja dị ndụ, nke bụ ije-ozị unu nke uche zuru oke, Ndị-Rom 12:1. Were nụ ịhụnanya jerịtara nụ ibe unu ozi, Ndị-Gal. 5:13. Ụbọchị gị nile ka ị ga-eji jeere Chineke gị ozi, 2 Nif. 2:3. Mgbe unu na-ejere mmadụ ibe unu ozi, unu nọ nanị n’ije-ozị nke Chineke, Mosa. 2:17. Ndị ahụ ga-enwere ala nke e kwere na nkwa garịrị ejere Chineke ozi ma-ọbụ a zachapụ ha, Ita 2:8–12. Ndị ahụ na-esonye n’ije-ozị nke Chineke, kwesịrị ije-ozị jiri obi ha nile, OznỌd. 4:2. Onye-nwe nyere iwu-nsọ nile na mmadụ kwesịrị ịhụ ya n’anya fee kwa ya ofufe, OznỌd. 20:18–19. N’aha nke Jisus Kraịst ị ga na-ejere Chineke ozi, OznỌd. 59:5. Mụ, Onye-nwe, enwere m mmasị inyere ndị na-efe m ofufe nnukwu ugwu, OznỌd. 76:5. Kpọọrọ Chineke isi ala n’ihi nanị ya ka ị ga-efe ofufe, Moses 1:15.