Fee ofufe Hụ kwa Chineke, Chukwu Ihụnanya, nsọpụrụ, ije-ọzi, na inyefe kpam kpam maka Chineke (OznỌd. 20:19). Ife ofufe gụnyere ekpere, ibu-ọnụ, okpukpe chi na nzukọ-nsọ, isonye n’emume-nso nile nke ozi-ọma, na omume ndị ọzọ na-egosi inyefecha kpam kpam na ịhụnanya maka Chineke. Gi enwela chi ọzọ tinyere m, Ọpụ. 20:3 (Ọpụ. 32:1–8, 19–35; Abụọma 81:9). Kpọọ isi ala nye Nna ahụ n’ime mụọ na n’ime ezi-okwu, Jọn 4:23. Kpọọ nụ isi ala nye ya bụ onye mere elu-igwe na ụwa, Mkpu. 14:7 (OznỌd. 133:38–39). Na-efe ya site n’ike unu nile, uche na ume, 2 Nif. 25:29. Ha kwere na Kraịst ma na-efe Nna ahụ ofufe n’aha ya, Jekọb 4:5. Zinọs kụziri na ndị mmadụ kwesịrị ikpe ekpere ma fee ofufe n’ebe nile, Alma 33:3–11. Fee nụ Chineke ofufe, n’ebe ọbụla unu ga-anọ, n’ime mụọ na n’ezi-okwu, Alma 34:38. Ndị ahụ dara n’ụkwụ Jisus, ma fee ya, 3 Nif. 11:17. Mmadụ nile garịrị echegharị, kwere n’aha nke Jisus Kraịst, na n’efe Nna ahụ ofufe n’aha ya, OznỌd. 20:29. E nye m unu okwu ndị a nile ka unu wee nwee ike ghọta ma mata otu kwesịrị iji fee-ofufe, na mata ihe ị na-efe-ofufe, OznỌd. 93:19. Otu Chineke nke a nanị ka m ga-efe ofufe, Moses 1:12–20. Anyị chọrọ ka a mata na ohere ahụ bụ nke anyị nke ife Chineke Pụrụ Ime Ihe nile, Ndep. Ok 1:11.