N’oke Hụ kwa Umeala, Ịdị umeala Ịkpa agwa ma-ọbụ mpụta ìhè nke dị umeala, dị n’oke, na dị mma n’anya. Onye mmeru-ihe n’oke na-ezere imebiga ihe oke na ime dịka a ga-asị nile. Chineke wee were akpụkpọ anụ meere Adam na Iv uwe wee yibe ha, Jen. 3:21 (Moses 4:27). Ka ndịnyom were ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, 1 Tim. 2:9. Bụrụ ndị uche ha zuru oke, ndị dị ọcha mmekọrịta, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ, Taịtọs 2:5. Ọtụtụ na-afụli onwe ha elu n’ime mpako n’ihi oke ọnụ ahịa nke uwe ha, Jekọb 2:13. Ka uwe gị nile bụrụ nke dị n’oke, OznỌd. 42:40. Anyị kwere n’ịdị ọcha mmekọrịta na ezigbo omume, Ndep. Ok 1:13.