Ndị nchụ-aja aghụghọ Ndị mmadụ na-ekwusa ozi-ọma na na-ewulite onwe ha elu dịka ìhè nye ụwa ka ha wee nweta uru na ọjịja mma nke ụwa; ha a naghị achọ ọdịmma nke Zaịọn (2 Nif. 26:29). Na-azụnụ igwe atụrụ nta Chineke, ọ bụghị kwa n’ihi uru na-eweta ihere, 1 Pita 5:2. Nzukọ nile e wuru maka inweta uru, a ga-ewedatarịrị ha ala, 1 Nif. 22:23 (Mọm. 8:32–41). N’ihi nchụ-aja aghụghọ nile na ajọọ-omume nile, ka a ga-akpọgide Jisus n’obe, 2 Nif. 10:5. Ọ bụrụ na enwere ike imanye nchụ-aja aghụghọ n’etiti ndị a ọ ga-apụta mbibi ha kpam kpam, Alma 1:12. Ndị Jentaịlụ ga ejupụta n’ụdị nchụ-aja aghụghọ nile, 3 Nif. 16:10.