Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọmnaị


Ọmnaị

Otu onye Nifaị na-edebe akụkọ ndekọta n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn onye dere ihe n’afọ dịka 361 tutu a mụọ Kraịst (Jarọm 1:15; Ọmnaị 1:1–3).

Akwụkwọ nke Ọmnaị

Otu akwụkwọ a tụgharịrị asụsụ ya site n’obere epekele nile nke Nifaị n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Akwụkwọ ahụ nwere nani otu isi, nke nwere nkọwasị nke agha nile dịịrị n’etiti ndị Nifaị na ndị Leman. Ọmnaị dere nanị ama okwu atọ mbụ nke akwụkwọ ahụ. Mgbe ahụ e nyefere epekele nile ndị ahụ n’aka Amarọn, Kemish, Abinadọm, na n’ikpe-azụ Amalakaị. Amalakaị nyefere epekele nile ahụ n’aka Eze Benjamịn, eze nke Zarahemla.

Bipụta