Ndụ Hụ kwa Ìhè, Ìhè nke Kraịst; Ndụ ebigh-ebi Ịdị-adị nke arụ na nke mụọ nke ikwe omume ya bụ site n’ike Chineke. Etinyewo m n’iru gị taa ndụ na ezi ìhè, Deut. 30:15–20. I ga-eme ka m mara ụzọ nke ndụ, Abụọma 16:11. Onye na-agbaso ezi-omume na-achọta ndụ, Ilu 21:21. Onye chọtara ndụ ya ga-etufu ya, onye tufuru ndụ ya n’ihi m ga-achọta ya, Mat. 10:39 (Mat. 16:25; Mak 8:35; Luk 9:24; 17:33). Ọkpara nke Mmadụ abịaghị ịla ndụ mmadụ n’iyi, kama ka o wee zọpụta ha, Luk 9:56. N’ime ya ka ndụ dịịrị, ma ndụ ahụ bụụrụ ìhè nke mmadụ, Jọn 1:4. Onye na-ekwere na Onye zitere m, e sitewo n’ọnwụ baa na ndụ, Jọn 5:24. Mụ onwe m bụ ụzọ, ezi-okwu ahụ, na ndụ ahụ, Jọn 14:6. Asị na-ọbụ nanị na ndụ a ka anyị nweworo olile-anya anyị n’ime Kraịst, anyị bụ ndị na-enweghị an̄ụrị karịchaa, 1 Ndị-Kọ 15:19–22. Ndụ iyi Chineke nwere nkwa nke ndụ nke ugbụ a, ma nke ahụ gaje ịbịa, 1 Tim. 4:8. Ka ụmụ anyị wee lekwasị anya na ndụ ahụ nke dị n’ime Kraịst, 2 Nif. 25:23–27. Ndụ nke a bụ oge ahụ dịịrị ndị mmadụ ịkwadobe ijekwuru Chineke, Alma 34:32 (Alma 12:24). Abụ m ìhè na ndụ nke ụwa, 3 Nif. 9:18 (Mosa. 16:9; 3 Nif. 11:11; Ita 4:12). Ngọzi na-adịrị ha bụ ndị kwesịrị ntụkwasị-obi ma-ọbụ na ndụ ma-ọbụ n’ọnwụ, OznỌd. 50:5. Nke a bụ ndụ ebighi-ebi nile—ka a mara Chineke na Jisus Kraịst, OznỌd. 132:24. Nke a bụ ọrụ m na ebube nke m iweta na mmezu anwụgh-anwụ na ndụ ebighi-ebi nke mmadụ, Moses 1:39.