Ikike Hụ kwa Chie echichi, Echichi; Chineke Kpọrọ, Kpọọ-oku, Ọkpụkpọ-oku; Ike; Ọkwa nchụ-aja; Ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja Nkwenye e nyere ndị nwoke n’ụwa ndị a kpọrọ ma-ọbụ chie echichi ime omume maka na n’ọnọdụ nke Chineke Nna ma-ọbụ Jisus Kraịst na-irụ ọrụ Chineke Mụ onwe m ezigawo gị, Ọpụ. 3:12–15. Ị ga-ekwu ihe m na-enye gị n’iwu, Ọpụ. 7:2. O wee nye ndị na-eso ụzọ iri na abụọ ahụ ike, Mat. 10:1. Ọbụghi unu onwe unu họpụtara m, kama-ọbụ mụ onwe m họpụtara unu ma chie unu echichi, Jọn 15:16. Nifaị na Lihai kwusaara ndị Leman ozi-ọma jiri nnukwu ike na ikike, Hil. 5:18. Nifaị nwa-nwoke nke Hilaman bụ onye nke Chineke, ebe o nwere nnukwu ike na ikike site na Chineke, Hil. 11:18 (3 Nif. 7:17). Jisus nyere ndị Nifaị iri na abụọ ike na ikike, 3 Nif. 12:1–2. Joseph Smith onye nke Chineke kpọrọ ma chie ya echichi, OznỌd. 20:2. Onye ọbụla a gaghị ezisa ozi-ọma, ma-ọbụ iwulite Nzukọ-nsọ m elu, ma ọbụghị ma echiri ya echichi, ma amatara n’ime Nzukọ-nsọ na onye ahụ nwere ikike, OznỌd. 42:11. Ndị okenye ga-ekwusa ozi-ọma, na-arụ ọrụ n’ikike, OznỌd. 68:8. Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek nwere ikike ilekọta ihe nile nke mụọ, OznỌd. 107:8, 18–19. Ihe ọbụla e mere n’ikike nke Onye-nwe abụrụwo iwu, OznỌd. 128:9. Onye obula na-ekwusa ozi-ọma ma-ọbụ na-elekọta maka Chineke ka a ga-akpọ rịrị site na Chineke site na ndị ahụ bụ ndị ji ikike, Ndep. Ok 1:5.