Jeriko Otu nnukwu obodo dị n’ime ndagwurugwu Jọdan nke e wuru mgbidi gburu gburu, mita 245 n’okpuru elu oke osimiri. Jeriko dị nso n’ebe ahụ ndị Israel gafere osimiri mgbe ha buru ụzọ bata na ala e kwere na nkwa (Josh. 2:1–3; 3:16; 6). Ndị Israel lụrụ agha na Jeriko, Josh. 6:1–20. Joshua dobere ọbụbụ ọnụ n’elu Jeriko, Josh. 6:26 (1 Ndez. 16:34). Jeriko nọọrọ n’etiti ala e kenyere Benjamịn, Josh. 18:11–12, 21. Onye-nwe letara Jeriko n’ije ikpe-azụ ya ịga Jerusalem, Mak 10:46 (Luk 18:35; 19:1).