Anụ Arụ Hụ kwa Arụ; Ịnwụ anwụ, N’anwụ anwụ; Mmadu n’ụdị okike; Nke anụ-arụ Anụ arụ nwere ọtụtụ mpụtara: (1) mpe mpe ihe dị ndụ dị nro na-emejupụta arụ nile nke mmadụ, anụmanụ nile, anụ ufe nile, ma-ọbụ azụ; (2) ịnwụ anwụ; ma-ọbụ (3) ụdị okike nke a na-ahụ anya ma-ọbụ nke anụ arụ nke mmadụ. Mpe mpe ihe dị ndụ nke arụ Anụmanụ nile ga-abụrụ unu ihe oriri, Jen. 9:3. Ekwesighị ka e gbuo anụmanụ nile ma e nweghị mkpa, NAJS, Jen. 9:10–11 (OznỌd. 49:21). Anụmanụ nile na anụ ufe bụ maka mmadụ iri ha dịka nri na iji ha dịka uwe, OznỌd. 49:18–19 (OznỌd. 59:16–20). Anyị kwesịrị iri anụ nke nta nke nta, OznỌd. 89:12–15. Ịnwụ-anwụ Jisus bụ nanị onye ahụ Nna mụrụ baa n’ime ndụ nke pụrụ Ịnwụ-anwụ, Jọn 1:14 (Mosa. 15:1–3). Adam wee bụrụ anụ arụ nke mbụ, Moses 3:7. Ụdị okike nke anụ arụ nke mmadụ Onye a bụrụ-ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke na-eme ka anụ arụ bụrụ ogwe aka ya, Jer. 17:5. Mụọ ahụ dị na njikere, mana anụ arụ adighị ike, Mak 14:38. Agụụ ihe ọjọọ nke anụ arụ esiteghị na Nna ahụ, 1 Jọn 2:16. Nifaị na-eru-uju n’ihi anụ arụ ya na oke ajọọ omume ya nile, 2 Nif. 4:17–18, 34. Unu emekwala udo unu na ekwensu na anụ arụ, 2 Nif. 10:24.