Mosaịa, Nna nke Benjamịn Hụ kwa Benjamịn, Nna nke Mosaịa; Zarahemla N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, otu onye amụma Nifaị onye e mere eze n’elu ndị nọ n’ime Zarahemla. A dọrọ Mosaịa aka na ntị ka ọ gbapụ site n’ala nke Nifaị, Ọmnaị 1:12. Ọ chọpụtara ndị mmadụ ndị Zarahemla, Ọmnaị 1:14–15. O mere ka a kuziere ndị Zarahemla ihe n’asụsụ nke ya, Ọmnaị 1:18. A họpụtara ya ịbụ eze nke ndị ahụ jikọtara onwe ha, Ọmnaị 1:19. Nwa ya nwoke, Benjamịn chịrị mgbe ọ nwụsịrị, Ọmnaị 1:23.