Getsemane
Ogige ubi e kwuru okwu ya n’ime Testament Ọhụrụ na ọ dị Ugwu Olive nso. N’asụsụ Aramaik, okwu ahụ Getsemane pụtara “ebe i nara olive” Jisus gara n’ubi ahụ n’abalị ahu nke Judas raara ya nye. Ebe ahụ ka o kpere ekpere na taa ahụhụ na Getsemane maka mmehie nile nke mmadụ (Mat. 26:36, 39; Mak 14:32; Jọn 18:1; Alma 21:9; OznỌd. 19:15–19).