Izu-ori, Ori I were ihe site n’aka onye-ọzọ n’ụzọ na-akwụghị ọtọ ma-ọbụ na-enweghị nkwado nke iwu. Oge nile Onye-nwe na-enye ụmụ ya iwu ka ha ghara izu-ori (Ọpụ. 20:15; Mat. 19:18; 2 Nif. 26:32; Mosa. 13:22; OznỌd. 59:6). Kpado nụ akụ unu n’elu-igwe, ebe ndị-ori na-adịghị egbupe kwa ma-ọbụ zuo ori, Mat. 6:19–21. Mmeri nile e meriri ndị Nifaị n’agha bịara n’ihi mpako, akụ na ụba ha nile, ịpụnarị ihe, izu-ori, Hil. 4:12. Onye ahụ nke zuru ori na-agaghị echegharị ka a ga-achụpụ, OznỌd. 42:20. Ndị ahụ zuru ori, a ga-enyefe ha n’aka iwu nke ala ahụ, OznỌd. 42:84–85.