Dụọ Ọdụ (ngwaa) Dịka e jiri ya n’akwụkwọ nsọ nile, dụọ ọdụ bụ inye ndụmọdụ ma-ọbụ ntụzi-aka. Adụọ m gị ọdụ ka Ọ zụrụ n’aka m ọla-edo nke erechaworo n’ọkụ, Mkpu. 3:18. Achọla ka inye Onye-nwe ndụmọdụ, Jekọb 4:10. Ọ na-enye ndụmọdụ na amamihe n’ebe ọrụ ya nile dị, Alma 37:12. Mmehie unu nile abiarutewo m n’ihi na unu na-achọ ịdụ onwe unu ọdụ n’ụzọ nile nke onwe unu, OznỌd. 56:14.