Na-atụnyere mmadụ nile, ma oke na nne. Ndị nwoke na ndị nwanyị nile bụ ụmụ nke Nna nke Elu-igwe mụrụ na mụọ. Mgbe a mụbatara ha n’ime ịnwụ anwụ, ha na-enweta arụ na-anwụ anwụ nke a na-ahụ anya. Arụ ndị a ka e kere n’onyinyo nke Chineke (Jen. 1:26–27 ). Ndị nwoke na ndị nwanyị ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-anata emume nsọ nile dị mkpa, na-edobe ọgbụgba-ndụ ha nile, ma na-erubere ịwu nile nke Chineke isi ga-aba n’ime mbuli-elu ha na bịabụrụ dịka Chineke.
Amaara m na mmadụ enweghị ihe ọ bụ, Moses 1:10 .
Ọrụ Chineke na ebube ya bụ iweta na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighi ebi nke mmadụ, Moses 1:39 .
Mmadụ, nwa nke Nna nke Elu-igwe na mụọ
Ha wee daa kpube iru ha n’ala, sị, O Chineke, bụ Chineke nke mụọ nile nke anụ arụ nile, Ọnọgụ. 16:22 (Ọnọgụ. 27:16 ).
Unu onwe unu bụ ụmụ nke Onye-nwe Chineke unu, Deut. 14:1 .
Chi ka unu bụ, ma-ọbụ kwa ụmụ nke Onye Kachasị ihe nile elu ka unu bụ, Abụọma 82:6 .
Ụmụ Chineke dị ndụ ka unu bụ, Hosea 1:10 .
Ọbụghị otu Nna ka anyị nile nwere? Ọbụghị otu Chineke keworo anyị? Mal. 2:10 .
Ndị nile bi n’ụwa nile bụ ụmụ ndịkom na ụmụ ndị inyom nke Chineke mụrụ, OznỌd. 76:24 .
Mmadụ nọkwarịị na mmalite ya na Nna ahụ, OznỌd. 93:23, 29 .
Chineke kere mmadụ nile na mụọ tutu ha adịrị n’ụdị okike ya, n’elu iru nke ụwa, Moses 3:5–7 .
Abụ m Chineke; m mere ụwa na mmadụ tutu ha adịrị n’anụ arụ, Moses 6:51 .
Mmadụ, nwere ike ịdị ka Nna nke Elu-igwe
Ya mere, zuo nụ oke ọbụna dịka Nna unu, Mat. 5:48 (3 Nif. 12:48 ).
Ọbụ na-edeghị ya n’iwu unu na chi ka unu bụ? Jọn 10:34 (OznỌd. 76:58 ).
Ka anyị bụrụ ndị nketa nke Chineke na ndị ha na Kraịst na-ekekọ oke, Ndị-Rom 8:17 .
Ị bụ nwa-nwoke, ma ọ bụrụ na ị bụ nwa-nwoke, ị bụkwa onye nketa nke Chineke site na Kraịst, Ndị-Gal. 4:7 .
Mgbe e mere ka Ọ pụta ìhè, anyị ga-abụ ndị yiri ya, 1 Jọn 3:2 .
Onye na-emeri emeri, ya ka m ga-ekwenye ka o soo m nọdụ ala n’oche-eze m, Mkpu. 3:21 .
Ndị ahụ bụ ndị na-eketa ala-eze Selestịal bụ chi nile, ọbụna ụmụ ndịkom nke Chineke, OznỌd. 76:50, 58 .
Mgbe ahụ ha ga-abụ Chi nile, n’ihi na ha ji ike nile, OznỌd. 132:20 .