Onye nkasi-obi
Akwụkwọ nsọ nile na-ekwu maka ndị nkasi-obi abụọ. Nke mbụ bụ Mụọ Nsọ (Jọn 14:26–27; Moro. 8:26; OznỌd. 21:9; 42:17; 90:11). Onye nkasi-obi nke abụọ bụ Onye-nwe Jisus Kraịst (Jọn 14:18, 21, 23). Mgbe onye ọbụla nwetara onye nkasi-obi nke abụọ, Jisus Kraịst ga-apụtakwute ya site n’oge ruo n’oge, ga-ekpughere ya Nna ahụ, na kuziekwara ya ihe iru n’iru, (OznỌd. 130:3).