Abụ Hụ kwa Égwú; Ịbụ abụ Uri nke ịja Chineke mma. Ndị-ozi Iri na Abụọ bụrụ otu abụ tutu Onye-nwe alakpuo na Getsemane, Mat. 26:30. Onye-nwe kpọrọ Emma Smith, ịhọpụta abụ-nsọ nile, OznỌd. 25:11. Abụ nke onye ezi-omume bụ ekpere nye m, ma a ga-eji ngọzi a wụsara n’isi ha zaa ya, OznỌd. 25:12. Jaa Onye-nwe mma jiri ịbụ abụ, ma jiri egwu, OznỌd. 136:28.