Isi 3
(Jun–Oktoba 1830)
Chineke kere ihe nile na mụọ tutu ha adịrị n’ụdị okike n’elu ụwa—O kere mmadụ, anụ arụ nke mbụ, n’elu ụwa—Nwanyị bụ onye inye-aka kwesịrị nwoke ahụ.
1 Otua ka esi wee mesịa elu-igwe na ala na ụsụụ ha nile.
2 Na n’ụbọchị nke asaa, mụ, Chineke, kwụsịrị ọrụ m, na ihe nile nke m mewororị; ma m wee zuo ike n’ụbọchị nke asaa site n’ọrụ m nile, ma ihe nile nke m meworo wee gwụsịa, na mụ, Chineke, wee hụ na ha dị mma;
3 Na mụ, Chineke, wee gọzie ụbọchị nke asaa, dookwa ya nsọ; n’ihi n’ime ya ka m zuworo ike site n’ọrụ m nke mụ, Chineke keworo na meworo.
4 Na ugbua, lee, asị m gị, na nke a bụ ọgbọ nile nke elu-igwe na nke ụwa, mgbe e kere ha, n’ụbọchị ahụ nke mụ, Onye-nwe Chineke, meworo elu-igwe na ụwa ahụ,
5 Na osisi nta ọbụla nke ọhịa tutu ya adịrị n’ụwa, na ihe ọkụkụ ọbụla nke ọhịa tutu ya e too. N’ihi na mụ, Onye-nwe Chineke, kere ihe nile, ndị m kwuworo maka ha, na mụọ, tutu ha adịrị n’ụdị okike ya, n’elu iru nke ụwa. N’ihi mụ, Onye-nwe Chineke, emebeghị ka mmiri zoo n’elu iru nke ụwa. Ma mụ, Onye-nwe Chineke, ekeworị ụmụ nile nke mmadụ, ma ọ dịbeghị kwa mmadụ dị ga-arụ ọrụ ubi; n’ihi n’ime elu-igwe ka m keworo ha; ma ọ dịbeghịkwa anụ-arụ dị n’elu ụwa, ọ dịghị kwa n’ime mmiri, ọ dịbeghị kwa n’ime ikuku;
6 Mana mụ, Onye-nwe Chineke, wee kwuo okwu, ma igirigi siri n’ala kwụgo n’elu ma wụsa mmiri n’iru ala nile.
7 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee kpụọ mmadụ site n’uzuzu ala ahụ, ma kunye ume n’oghere imi ya nile ume nke ndụ; ma mmadụ wee bụrụ mkpụrụ-obi dị ndụ, anụ arụ nke mbụ n’elu ụwa, nwoke mbụ kwa; na-agbanyeghị, ihe nile dị tutu e kee ha; kama na mụọ ka e keworo ha na mee ha dịka okwu m siri dị.
8 Na mụ, Onye-nwe, Chineke, wee kụọ ubi nke a gbara ogige na mpaghara ọwụwa-anyanwụ na Iden, na n’ebe ahụ ka m tinyere nwoke ahụ nke m kpụworo.
9 Na site n’ala ka mụ, Onye-nwe Chineke, mere ka osisi ọbụla pupụta n’ụdị okike ya, nke dị mma nye anya nile nke mmadụ; mmadụ wee nwekwa ike ịhụ ya. O wee bụrụkwa mkpụrụ obi dị ndụ, n’ihi na o dị na mụọ n’ụbọchị ahụ nke m keworo ya, n’ihi na ọ nọgidere n’ime ụdị ahụ nke mụ, Chineke, kere ya, e, ọbụna ihe nile nke m kwadobere maka mmadụ iji mee ihe; ma mmadụ wee hụ na ọ dị mma na-iri eri. Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee kụọkwa osisi nke ndụ n’etiti ogige ubi ahụ, nakwa osisi nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.
10 Na mụ, Onye-nwe Chineke, mere ka osimiri site na Iden pụọ ị wụsa mmiri n’ubi ahụ, na site ebe ahụ e kewasịrị ya, ma o wee ghọọ isi mmiri anọ.
11 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee kpọọ nke mbụ Paịshon, ma ọ na-agafe ala nile nke Havila, gburu gburu, ebe mụ, Onye-nwe Chineke, keworo ọla-edo ebe ọdị ukwuu.
12 Ma ọla-edo nke ala ahụ dị mma, ebe ahụ kwa ka bdellium na nkume onyx dị.
13 Na aha osimiri nke abụọ ka a kpọrọ Gaịhọn; nke ahụ bụ nke na-agafe ala nile nke Etiopịa gburu gburu.
14 Na aha osimiri nke atọ bu Hidekel, nke ahụ bụ nke na-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Asirịa. Na osimiri nke anọ bụ Yufretis.
15 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee were mmadụ ahụ, tinye kwa ya n’ime ubi Iden ahụ a gbara ogige, ịrụ ọrụ ya na idebe ya.
16 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee nye mmadụ ahụ iwu, na-asi: Site n’osisi ọbụla nke dị n’ubi ahụ a gbara ogige ka ị ga na-eri nri.
17 Mana site n’osisi nke ima ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila ya, na-agbanyeghị, i nwere ike ịhọrọ n’onwe gị, n’ihi na-enyere gị ya; mana, cheta na m megidere ya, n’ihi n’ụbọchị ahụ ị ga-eri site na ya Ị ga-anwụ n’ezie.
18 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee sị Onye ahụ m Mụrụ Nanị Ya, na-ọdịghị mma ka mmadụ ahụ nọdụ nanị ya, ya mere, aga m emere ya onye inye aka kwesịrị ya.
19 Ma site n’ala mụ, Onye-nwe Chineke, wee kpụọ anụ ọhịa nile ọbụla, na anụ ufe nile nke ikuku, ma nye ha iwu ka ha bịakwute Adam; ka a hụ ihe ọ ga-akpọ ha; na ha bụkwa mkpụrụ obi nile dị ndụ; n’ihi na mụ, Chineke, kunyere n’ime ha ume nke ndụ, na nye iwu na ihe ọbula Adam kpọrọ ihe ekere eke ọbụla dị ndụ nke ahụ ga-abụ aha nye ya.
20 Ma Adam wee nye anụ ụlọ nile aha, na anụ ufe nke ikuku, na anụ ọhịa ọbụla; mana nye Adam, ọ dịghị onye inye-aka kwesịrị ya nke a chọtara.
21 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee mee ka ụra miri emị dakwasị Adam, na o wee rahụ ụra, na m wee were otu n’ime ọgịrịga ya nile mechiekwa anụ arụ na-ọnọdụ ya;
22 Na ọgịrịga ahụ nke mụ, Onye-nwe Chineke weworo site na mmadụ ahụ ka m ji wee mee nwanyị, ma kpọta ya nye mmadụ ahụ.
23 Na Adam wee sị: Nke a ka m mataworo ugbụ a bụ ọkpụkpụ nke ọkpụkpụ m nile, na anụ-arụ nke anụ-arụ m; a ga-akpọ ya Nwanyị, n’ihi na-esi na nwoke ahụ wepụta ya.
24 Ya mere na nwoke ga-ahapụ nna na nne ya ma rapara n’arụ nwunye ya; ma ha ga-abụ otu anụ-arụ.
25 Na ha abụọ wee bụrụ ndị gba ọtọ, nwoke ahụ na nwunye ya, ma ihere emeghị ha.