Site na Inwekọrịta Mmetụta Anyị Enweta Ike si n’aka Chineke
Dị ka anyị na-achọ inwekọrịta mmetụta, anyị ga-akpọdata ike nke Chineke ime ka mbọ anyị dị mma.
Nne Gordon gwara ya na ọ bụrụ na ọ ga-ejecha ozi ya, na ya ga-emere ya pie. Ihe nke ọ kachasị enwe mmasị. Ọ ga-eme ya nanị maka ya. Gordon malitere ọrụ ijecha ozi ndị ahụ, nne ya malitere imere ya pie ahụ. Nwanne ya nwanyị Kathy nke tọrọ ya na enyi ya batara n’ụlọ ha. Ọ hụrụ pie ahụ wee jụọ ma ya na enyi ya ha ga-enweta otu ibe.
Gordọn sịrị “Mba,” “ọ bụ pie m. Mama meere m ya, ọ bụ ụgwọ ọrụ m.”
Kathy gbọjara nwata nwanne ya nwoke. Ọ bụ onye aka ike maara naanị onwe ya. Olee otu ọ ga-esi nwee ihe niile a naanị ya?
Ka awa ole na ole gasịrị mgbe Kathy meghere ụzọ ụgbọala i bula enyi ya n’ebe obibi, e nwere napkịn abụọ a pịara nke ọma nọ n’elu oche ahụ, a tụkwasịrị ya ngaji eze abụọ, na obosara ibe pie abụọ nọcha n’efere. Kathy kọrọ akụkọ a na olili Gordon igosị ka o si dị na njikere ịgbanwe ma gosị ịhụnaanya n’ebe ndị ọzọ na-okwesịghị nọ.
Na afọ 1842, Ndị nsọ nọrịị arụsi ọrụ ike iwu Tempụl Nauvoo. Ka e hiwachara Otu Enyem aka na Maachị, ọtụtụ mgbe Onye amụma Joseph na abịa ọgbakọ ha iji kwadoo ha maka ọgbụgba ndụ dị nsọ, na-ejikọta ha ga-eme mgbe na-adịghị anya na tempụl.
Na Jun 9, Onye amụma “sịrị na ọ na-aga ikwu okwu ihe banyere udo[.] Asịgodu na Jizọs Kraist na ndị mmụọ ozi [ahụ] ajụ anyị n’ihi ihe ndị na-enweghị isi, olee otu ọ ga-adị anyị? Anyị aghaghị ime ebere ma leghara ụmụ obere ihe anya.” Onyeisi Smith garaniihu kwuo na, “Ọ na-ewute m na-enweghị ọdịmma karara zuo oké—ma ọ bụrụ na otu onye otú nwee nsogbu ya emetụta mmadụ niile—site na-inwekọrịta mmetụta anyị enweta ike si n’aka Chineke.”1
Obere ahịrị okwu ahụ metụrụ m n’ahụ ka amụma-igwe. Site na inwekọrịta mmetụta anyị enweta ike si n’aka Chineke. Ụwa nke a abụghị ihe m chọrọ ka ọ bụrụ. Enwere ọtụtụ ihe m chọrọ ime ka a na-eme ma mee ya adịmma karịa. Na-eziokwu, e nwere ekweghị ekwe karịrị akarị megidere ihe m tụrụ anyị ya, mgbe ụfọdụ ọ dị m ka onweghị ihe m pụrụ ime. Na nso nso a, a nọ m na-ajụ onwe m ajụjụ dị iche iche: Kedụ otu kacha mma m ga-esi aghọta ndị nọ m nso? Olee otu m ga-esi ehiwe “inwekọrịta mmetụta” ahụ mgbe mmadụ niile dịcha iche iche? Olee ike si n’aka Chineke m nwere ike inweta ma ọ bụrụ na mụ na ndị ọzọ adị n’otu karịa ka ọ dị na mbụ? Site na ntụgharị uche m, e nwere m ụzọ ero atọ. Elemanya, ha ga-enyekwara gị aka.
Mee Ebere
Jakọb 2:17 na-asị, “Na-eche nụ maka [ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị] dịka onwe unu, ma nwee nụ mmetụta unu na mmadụ nile ma na-emepu nụ aka n’ihe unu nwere, ka ha wee baa ụba dịka unu.” Ka anyị were mkpụrụ okwu a ebere dochie ụmị—meere onye ọbụla ebere ka ha wee nwee ike baa ọgaranya dị ka gị.
Ọtụtụ mgbe anyị na-eche na ụmị dị ka nri ma ọbụ ego, kama ikekwa ihe anyị kacha chọọ n’ozi anyị bụ ebere.
Onyeisi Otú Enyemaka nke m kwuru na nso nso a na: “Ihe m … na-ekwe … unu nkwa bụ na aga m echekwa aha unu. … A ga m ahụta unu na otu unu dị kachasị mma. … Enweghị m ike ekwu ihe ọjọọ ọbụla banyere unu, nke ga-ebutu unu ala. A na m asị unu meekwara m otu ahụ n’ihi na egwu na-atụ m, na-eziokwu, i me ihe na-agaghị akwanyere unu ugwu.”
Joseph Smith gwara ụmụnne nwanyị ahụ okwu na ụbọchị Jun 1842 sị:
“Mgbe ndị mmadụ gosịrị m obi ọma na ịhụnaanya n’ụzọ ọbụla kachasị nta, O, ọ na-enye mmụọ m ike. …
“… Mgbe ọbụla anyị kacha ruo Nna anyị nke eluigwe nso, mgbe ahụ ka anyị kacha nwee ohere ijiri ọmịiko leta mkpụrụ obi ndị na-ala n’iyi—[anyị chere na anyị chọrọ] ibukwasị ha n’ubu aka anyị ma chefuo ihe gbasara mmehie ha. [Okwu m nke a bụ maka] Otu a niile—ọ bụrụ na ị chọrọ ka Chineke mere gị ebere, meere onye ọbụla n’ime unu ebere.”2
Ndụmọdụ a bụ nnọọ maka Otú Enyem aka. Ka anyị hapụ ikpe onye ọbụla n’ime anyị ikpe ma ọbụ kwuo okwu ọjọọ. Ka anyị chekwaa aha onye ọbụla n’ime anyị ma nye onyinye ebere.3
Mee ka Ụgbọ Gị Na-atụgharị
N’afọ 1936, ndị ọkwọ ụgbọ ana-amaghị ama si na Mahadum Washington gara Germany iso mee Egwuregwu Olympic. Ọ bụ na n’oge ahụ ụwa nile nọ nime Nnukwu Ụkọ ego. Ndị a bụ ụmụ okorobịa na-arụ ọrụ, nke ndị obodo ha na-arụ obere ọrụ ịmị akụ níme ala na igbu osisi nyere onyinye obere ego, ka ha wee nwee ike ga njem ruo Berlin. Ihe ọbụla niile gbasara ịsọ mpi ahụ yiri ihe karịrị ha, mana o nwere ihe mere na agbam ọsọ ahụ. N’ihe banyere ịkwọ ụgbọ, ha na-akpọ ya “ịtụ akpọ.” Gee ntị na nkọwa nkea e nyere dị n’akwụkwọ akpọrọ Ụmụ Okorobịa nọ n’ụgbọ mmiri ahụ:
O nwere otu ihe na-eme mgbe ụfọdụ na-ara ahụ inweta ma na-ara ahụ ịkọwa. A na-akpọ ya “ịtụ akpọ.” Ọ na-eme naanị mgbe ndị niile na-akwọ ụgbọ na-ịdị n’otu n’ụzọ kachasị mma ruo na ihe niile ga-agakọ ọnụ.
Ndị na-akwọ ụgbọ ga-eji ike ha niile mee ihe ruuru ha ma n’otu aka ahụkwa jisiekwa aka ike na ihe nke onye ọbụla n’ime ha maara eme n’onwe ya. Anaghị enweta mmeri na-ọsọ site n’iji ihe nnọchi anya. Ezigbo ndị otú bụ otú ahazikọtara nke ọma—otu onye ga-anọ n’isi, onye ọzọ ga-ejide ihe adịghị ama ama a chọọ ya, onye ọzọ ga-alụ ọgụ dị na ya, onye ọzọ ga-eme udo. O nweghị ọkwọ ụgbọ ka baa uru karịa ibe ya, ha niile baara ụgbọ ahụ uru, kama ọ bụrụ na ha ga-akwọkọ ụgbọ ọnụ nke ọma, onye ọbụla nime ha ga-enye ohere maka mkpa na ike ime ihe nke ndị ọzọ—onye aka ya dị mkpụkpụ na-ewelitetụ aka, onye aka ya dị ogologo ana adọbatụ ya obere obere.
Ọdịiche niile nwere ike ghọọ uru kama ọghọm. Naanị mgbe ahụ ka ọ ga-adị ka ugbọ mmiri ahụ ọ na-agara onwe ya. Naanị mgbe ahụ ka ihe mgbu na-enye ohere kpam kpam maka inwe ọńụ. Ezigbo “ịtụ akpọ” na-adị ka mbem.4
Na-agbanyeghị oke ọgbachi ha nwere, ndị otú nke a chọpụtara ịtụ akpọ zuru oké ma nweta mmeri. Ọla edo olympic nyere ọńụ, mana ịdị na-otu nke onye ọkwọ ụgbọ ọbụla nwetara ụbọchị ahụ bụ oge dị nsọ nọgidere n’ime ha n’oge ndụ ha niile.
Kpochapụ Ihe ọjọọ Ọsịsọ dị ka otu Ihe ọma Nwere ike Ito
Na nkọniilu mafere mma oké dị na Jekọb 5, Onyenwe ubi vaịn ahụ kụrụ ezigbo osisi na-ezigbo ala, mana ka oge gara ya agbakaa wee mịa mkpụrụ ọhịa. Onyenwe ubi vaịn ahụ kwuru ugboro asatọ: “Ọ na-ewute m [i] gbutu osisi a.”
Nwa-oru ahụ sịrị Onyenwe ubi vaịn ahụ: Hapụ ya nwa ntịntị oge. Onyenwe ya sịrị: Ee e, aga m ahapụtukwa ya obere oge.”5
Nke a bụ ntụzi aka gbasara anyị niile na-agba mbọ igwugharị ala na-achọ mkpụrụ ọma n’obere ubi vaịn nke anyị: “Ị ga-ekpochapụ nke ọjọọ dị ka otu nke ọma ga-esi eto.”6
Ịdị n’otu anaghị eme ka ihe awantịrọ; ọ na-eji ọrụ. Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya, mgbe ụfọdụ ọdịchaghị mma, ma were nwayọ nwayọ na-eme mgbe anyị kpochapụrụ ihe ọjọọ ọsịsọ dị ka otu ihe ọma nwere ike ito.
Ọ bụghị naanị anyị so na mbọ anyị na-agba ihiwe ịdị n’otu. Jekọb 5 garaniihu na-asị, “Ndị odibo ahụ agaghị rụọ ọrụ n’ikike ha; Onyenwe ubi vaịn ahụ sokwa ha rụọ ọrụ.”7
Onye ọbụla n’ime anyị na-aga iwe nhụmiihe ga-enye mmerụ ahụ dị oke omimi, ihe ndị na-ekwesịghị ime. Onye ọbụla n’ime anyị gakwa, n’oge dị iche iche, ekwe ka mpako na mfụli elu imebi mkpụrụ ahụ anyị na-amị. Mana Jịzọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị nime ihe niile. Ike Ya na-erucha n’ebe kachasị ala ma o guzosịrị ike ebe ahụ eche anyị mgbe anyị kpọkuru Ya. Anyị niile na-arịọ maka ebere maka mmehie anyị na ihe ndị anyị emetaghị. Ọ na-enye n’efu. Ma Ọ na-ajụ anyị ma anyị ọ ga-enwe ike nye otu ụdịrị ebere ahụ na ịnwe nghọta nye onye obụla na ibe ya.
Jizọs kwuru ya hoohaa sị: “Dị nụ n’otu; ma ọ bụrụ na unu a dịghị n’otu unu a bụghị ndị m.”8 Mana ọ bụrụ na anyị a bụrụ otu—ọ bụrụ na anyị e nwee ike nye otu ibe pie anyị ma ọ bụkwanụ tinye akaraka nke onye ọbụla n’ime anyị n’ọrụ ụgbọ mmiri ahụ nwere ike ịtụkọta akpọ ọnụ n’ụzọ zuru oké—mgbe ahụ ka anyị ga-abụ ndị Ya. Ọ ga-enyere anyị aka kpochapụ ihe ọjọọ ọsịsọ dị ka otu ihe ọma nwere ike ito.
Nkwa niile E buru na amụma
E nwere ike anyị erutachabeghị ebe anyị chọrọ ị nọ, ma ugbu a anyị anọghị ebe anyị ga-anọ. E kwere m na mgbanwe ahụ anyị na-achọ n’ime onwe anyị nakwa n’ime otú ndị ahụ anyị nọ, agaghị abịasi ike site na ndọrọ ndọrọ ma ọ ga-aka abịa site na ị na-agbalisiike agba mbọ kwa ụbọchị ịghọta onye ọbụla na ibe ya. Maka Gịnị? N’ihi na anyị na-ewu Zayọn—ndị “nwere otu obi na otu echiche.”9
Dị ka ndị inyom gbara ndụ, anyị nwere mmetụta sara mbara. A na-etinye mmetụta ahụ n’ọrụ oge ụbọchị niile mgbe anyị na otu enyi na-amụ ihe, mgbe anyị na-akpọba ụmụaka ịrahụ ụra, mgbe anyị na onye anyị na ya nọketere n’oche n’ime bọs na-akpa nkata, mgbe anyị na-akwado nkuzi anyị na onye ọrụ anyị. Anyị nwere ike iwepụ akpamoké ma wulite ịdị n’otu.
Otu Enyem aka na Ndị inyom nta a bụghị nnọọ klas dị iche iche. Ha nwekwara ike bụrụ nhụmiihe na-enweghị nchefu ebe ndị inyom dị iche iche niile na-abakọta ọnụ n’otu ụdịrị ụgbọ ahụ ma kwọwa ya tutu anyị a chọta ịtụ akpọanyị. A na m enye ọkpụkpọ oku a: bụrụ ndị so arụkọta ọrụ na-agbanwe ụwa maka ịdị mma. Ọrụ nke ọgbụgba ndụ anyị bụ ije ozi, iwelite aka ndị dara mba, ị kwọrọ ndị ike na-adịghị na azụ anyị ma ọbụ n’aka anyị ma buru ha. Ọ gbagwojughị anya ịma ihe aga eme, kama ọtụtụ mgbe ọ na-emegide echiche ọdịmma nke onwe anyị, ma anyị ga-agba mbọ. Ndị inyom Nzukọ nsọ nke a nwere ike ime ihe na-enweghị nsọtụ ị gbanwe ụzọ ndị mmadụ si na-ebi ndụ. E nwere m n’uju ntụkwasị obi nke ime mmụọ na, dị ka anyị na-achọ inwekọrịta mmetụta, anyị ga-akpọdata ike nke Chineke ime ka mbọ anyị dịkarịa mma.
Mgbe Nzukọ nsọ ahụ mere emume ncheta mkpughe nke ọkwa nchụaja na afọ 1978, Onyeisi Russell M. Nelson nyere ngọzi nke onye amụma dị egwu: “Ọ bụ ekpere m na ngọzi m ka m na-enye ndị niile na ańa ntị na anyị ga-enwe ike gabiga ibu arụ ọbụla nke akpamoké ma na-eje ije n’iguzosi ike anyị na Chineke—nakwa onye na ibe ya—na udo na nkwekọrịta zuru oke.”10
Ana m arịọ ka anyị keta oké na ngọzi nke onye amụma nke a ma tinye mbọ nke onwe anyị na nke anyị zuruoké nwee n’ọrụ ịmụbawanye ịdị n’otu n’ụwa a. A na m agba ama m site iji okwu nke Jizọs Kraịst jiri kpee ekpere dị umeala na-enwekwaghị nsọtụ: “Ka ha niile wee bụrụ otu; dị ka gị onwe gị, Nna, nọ nime m, ma Mụ nọ nime gị, ka ha n’otu aka ahụ nọrọ nime anyị.”11 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.