Ọgbakọ Zuru ọha
E nwererịị Achịcha
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


E nwererịị Achịcha

Dị ka anyị na-achọ ịnwe nkwado nke ndụ, anyị nwere ike izute ihe mnwale niile nke ndụ site n’ijide ntụkwasị obi bara ụbara.

Tupu e nwee mmachibido ime njem nke okoro ụwa dị ugbu a, a naara m alọta n’ebe obibi m site n’ozi fere mba ọzọ m jere, nke ihe ndị a nọ na-ahazi kpatara m ji nọrọ ruo na Sọnde. E nwere m oge na-etiti mgbe m ga-agba ụgbọ elu ị ga nzukọ oriri nsọ n’ebe ahụ, ebe m nwekwara ohere zie ozi dị nkenke. Ka emesịrị nzukọ ahụ, otu onye dikọn nwere mmasị bịakwutere m wee jụọ ma m maara Onyeisi Nelson nakwa ma mụ onwetụgo ohere ikwe ya n’aka. A zara m na m maara ya, na e kwego m ya n’aka, nakwa dị ka onye otú Bishọp Nduzi e nwere m ohere izute Onyeisi Nelson na ndị ndụmọdụ ya ọtụtụ mgbe kwa izu ụka.

Nwata dikọn ahụ nọdụrụ ọdụ n’oche oge ahụ, gbasaa aka ya n’ikuku, wee tipu, “Nke a bụ ụbọchị kachasị mkpa na ndụ m!” Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, agaghị m enwe ike ịgbasa aka m n’ikuku wee tie mkpu, kama obi juru m na-ekele ruo ebighị ebi maka onye amụma dị ndụ na maka ntụzi aka anyị na-anata site n’aka ndị amụma, ndị ọhụ ụzọ, na ndị mkpughe, nke ka nke n’oge ndị a ihe ụwa chere anyị aka mgba.

Site na mmalite oge, Onyenwe anyị enyewo ntụzi aka maka ịnyere ndị Ya aka kwadoo n’ihe nke ime mmụọ na nke anụ ahụ, megide ọdachi na mnwale ndị Ọ maara ga-abịa dị ka akụkụ ihe ga-eso na nhụmiihe nke ndụ nke a. Ọdachi ndị a nwere ike bụrụ nke onwe onye ma ọbụ ihe dịịrị mmadụ niile, kama ntụzi aka nke Onyenwe anyị ga-eweta nchekwa na nkwado ruo na anyị ga-ańa ntị ma rube isi na ndụmọdụ Ya. E nwere ihe ọmụmaatụ dị egwu na-akụkọ si na akwụkwọ nke Jenesis, ebe anyị mụtara ihe banyere Josef nọ na Ijipt na ntapịa nrọ nke Fero o mere site na nkwalite nke mmụọ.

Ma Josef wee sị Fero, … Chineke eziwo Fero ihe ọ na-aga ịme. …

“Lee, a ga-enwe nnukwu ihe oriri afọ asaa na gburugburu ala Ijipt niile:

“Ọ gasịa a ga-enwe ụnwụ afọ asaa; ma a ga-echefu nnukwu ihe oriri ahụ nọbu n’ala Ijipt.”1

Fero ńara Josef ntị ma, mee ihe ahụ Chineke gosịrị ya na nrọ, ma ozugbo ahụ malite ime nkwado maka ihe na-aga abịa. Akwụkwọ nsọ mere ka amata:

“N’ime afọ asaa ahu e nwere ihe oriri n’uju n’elu ụwa.

O kpokọtara ihe oriri niile nke afọ asaa. …

“Josef wee kpokọta ọka ruru ka aja nọ na oke osimiri, … tutu ọ pụghị ịgụta ya n’ọnụọgụgụ; maka na-apụghị ịgụta ya agụta.”2

Ozugbo afọ asaa nke ojuju akụ gasịrị, a gwara anyị na “ihe ụkọ nke afọ asaa malitere ịbịa, dị ka Josef siri kwuo: ụkọ ihe ahụ zuru ala ahụ niile; mana ala Ijipt niile e nwerịị achịcha.”3

Ụbọchị taa, anyị bụ ndị a gọziri agọzi ịbụ ndị ndị amụma na-edu ndị na-aghọta mkpa ọ dịịrị anyị iji mee nkwado merie ọdachi niile “ga-abịa”4 ma matakwa ezughị oké niile ma ọbụ ihe mgbochi niile anyị nwere ike izute n’ịgba mbọ ị soro ndụmọdụ ha.

O doro anya nke ọma na ihe ndị COVID-19 butere, gụnyekwara oke ajọọ ọgbaaghara eke niile, na-amaghị onye bụ onye, hefee agbụrụ, agbata ọha na okpukperechi nke mba ụwa niile. Ọtụtụ ọrụ a kwụsịwo ma mkpata ego agbadatawo dị ka o siri metụta ohere ịrụ ọrụ site n’ịchụ ndị mmadụ n’ọrụ nke nsogbu ahụ ike ndị metụtara nsogbu nkwagide iwu.

Na ndị niile o metụtara, anyị ghọtara ma ọnọdụ unu na-ewute anyị, ọbụladị anyị kwesịrị ike na ụbọchị ọma na-abịa n’ọdịniihu. Unu a bụrụwo ndị a gọziri agọzi inwe ndị bishọp na ndị isi ngalaba nta ndị na-achọpụta ndị otu ọgbakọ ha nwere mkpa ihe nke anụ ahụ na ndị nwere ike inweta ngwa ọrụ na akụrụ ngwa niile nwere ike ịnyere unu aka wughachi ndụ unu ma dote unu n’okporo ụzọ ịnwe ndabere onwe dị ka unu na-etinye ụkpụrụ nke ime nkwadobe n’ọrụ.

Na-agbata ụbọchị nke taa, site n’ọrịa mkpochapụ nke na-egbuola usoro mkpata akụ niile tinyekwara ndụ ndị mmadụ, ọ gaghị ekwe mee na Onye Nzọpụta nwere ọmịiko, ga-agba nkịtị n’ihe doro anya na ọtụtụ ndị na-ata ahụhụ ma sị ha bido iwu ebe ana echekwa nri na ego maka ọdịniihu. Ka osila dị, nke ahụ apụtaghị na anyị ga-agba nkịtị kpamkpam ma jụ ụkpụrụ niile nke nkwado … naanị na aga etinye ụkpụrụ niile ndịa n’ọrụ ma tinyekwa “amamiihe nakwa usoro,”5 nke ọ ga-abụ na-ọdịniihu anyị wee nwee ike sị, dị ka Josef mere na Ijipt, “e nwererịị achịcha.”6

Onyenwe anyị a tụghị anya n’aka anyị ime ihe karịa ka anyị nwere ike ime, mana Ọ tụrụ anya na anyị ga-eme ihe anyị nwere ike ime, mgbe anyị nwere ike ime ya. Dị ka Onyeisi Nelson chetaara anyị na ọgbakọ zuru ọha anyị gara aga na, “Onyenwe anyị hụrụ mbọ na-anya.”7

Akwụkwọ Nhazi ego e dere na-asụsụ niile

Ndị ndu Nzukọ nsọ ọtụtụ mgbe enyewo Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a mgbam ume “ime nkwado maka ihe ọjọọ dị na ndụ site na-ịnwe nri na mmiri otu a chọrọ na idokwa ụfọdụ ego na nchekwa.”8 N’otu aka ahụkwa, anyị nwere mgbam ume i, “nwe akọ” ma “hapụ imebiga ihe n’oke”9 na mbọ anyị ihiwe ebe ndokwa ihe oriri n’ebe obibi na idowe ego. Akwụkwọ a kpọrọ Ego nke Onwe maka Ndabere Onwe, e bipụtara na 2017 e nwere ugbu a na website Nzukọ nsọ na-asụsụ dị 36, ji ozi si n’aka Otu Ndịisi Mbụ bido, nke sịrị na:

“Onyenwe anyị e kwuwo na, Ọ bụ nzube m ị rọpụta ihe maka ndị nsọ m’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 104:15]. Mkpughe nke a bụ nkwa si n’aka Onyenwe anyị na Ọ ga-enye anyị ngọzi niile nke anụ ahụ ma mghee ọnụ ụzọ nke ịnwe ndabere onwe. …

“… Ịnakwere na idobe ụkpụrụ ndị a niile ga-aka akwado gị ịnata ngọzi niile nke anụ ahụ nke Onyenwe anyị kwere nkwa ya.

“Anyị na-akpọku unu ịkpachapụ anya mụọ ihe ọmụmụ ma tinye ụkpụrụ ndị a niile n’ọrụ ma kụziere ha ndị otú ezi na ụlọ unu. Ka ị na-eme otu a, ndụ gị ga-enwe ngọzi … [n’ihi na]… ị bụ nwa Nna anyị nke eluigwe. Ọ hụrụ gị naanya ma ọ gaghị agharịpụ gị. Ọ maara gị, ma dịkwa na njikere ịme ka ngọzi niile nke ndabere onwe dị n’ihe nke ndụ na nke ime mmụọ rute gị.”10

Akwụkwọ nke a gụnyere isi ndị nke ewepụtara iche maka ikewapụta na ibi ndụ n’usoro atụmatụ ego amawapụtara, na-echekwa ezi na ụlọ gị megide ihe isi ike, ịchịkọtanwu orurugbana gbasara ego, na itinye ego n’ọrụ maka ọdịniihu na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ma ọ nọ ya maka onye ọbụla na website Nzukọ nsọ ma ọbụ site na ndị ndu nọ na mpaghara unu.

Mgbe a na-atụle ụkpụrụ nke nkwadobe, anyị nwere ike leghachi anya n’ebe Josef nọ na Ijipt nọ maka nkwalite nke mmụọ. Ịmata ihe ga-eme a garaghị ezuoké idu ha n’afọ niile nke “ụkọ” na-enweghị aja ọbụla a chụrụ n’oge uju. Kama irichapụ ihe niile ndị Fero na-achị nwere ike ịkọpụta, e hiwere oké, ma gbasoro ya, na-enye ha nke zuuru ha izute mkpa ha mgbe ahụ, nakwa ihe ndị ga-akpa ha, na-ọdịniihu. O zuchaghị oké ịma na oge ihe isi ike ga-abịa. Ha rụrụ ọrụ ma, n’ihi mbọ ha,“e nwererịị achịcha.”11

Nke a na-eduba n’ajụjụ dị mkpa: “Ya mere, gịnị?” Ebe ka mma ibido bụ ịghọta na ihe niile bụ ihe nke mmụọ nyere Onyenwe anyị, “ma onwetụghị mgbe ọbụla” O nyere anyị iwu nke bụ nke anụ arụ.”12 Ihe niile, mgbe ahụ, chuwara ihu n’ebe Jizọs Kraist nọ dị ka ntọala nke anyị ahaghị iwu ịhe n’elu ya ọbụna nkwadobe nke ndụ anụ ahụ anyị.

Inwe nkwadobe nke ime mmụọ na nke anụ ahụ pụtara “ikwere na site na amara ahụ, ma ọbụ ike nke Jizọs Kraịst na mbọ nke anyị, anyị nwere ike i nwete ihe niile na-akpa anyị na ndụ ma nke ime mmụọ ma nke anụ ahụ anyị chọrọ maka onwe anyị nakwa ndị ezi na ụlọ anyị.”13

Ihe ndị ọzọ agbakwunyere gbasara ntọala nke ime mmụọ maka nkwadobe ihe nke anụ ahụ gụnyere: ime ihe “n’usoro na amamiihe,”14 nke pụtara iji nwayọọ ehiwe ebe a na-edokwa ihe oriri na nchekwa ego ogologo oge, tinyekwara ịnabata ụzọ, “dị nta ma dị mfe”15 nke na-egosịpụta okwukwe na Onyenwe anyị ga-ebuli mbọ anyị dị nta ma na-anọgide elu.

Site na ntọala nke ime mmụọ e hiwere, anyi nwere ike tinye n’ọrụ akụrụ ngwa abụọ dị mkpa maka nkwadobe ihe nke anụ ahụ— na-ahazi ihe niile gbasara ego na idobe ihe oriri n’ebe obibi.

Isi ụkpụrụ nile maka ịhazi ihe gbasara ego gị nke ọma gụnyere ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye niile, ịhapụ ma gbanahụ iji ụgwọ, ịkwado ma n’ebi ndụ n’oke nhazi ego e mere; na idokwa ego maka ọdịniihu.

Isi ụkpụrụ nile nke idokwa ihe oriri n’ebe obibi gụnyere ndokwa nke ihe oriri, ndokwa mmiri, na ndokwa ihe ndị ọzọ dị mkpa dị ka o si na-akpa mmadụ na ihe ndị na-akpa ezi na ụlọ, n’ihi na “ụlọ nchekwa kachasị mma”16 bụ ebe obibi, nke na-aghọ “ebe kachasị dị mfe inweta ihe edokwara n’oge mkpa.”17

Ka anyị nabatara ụkpụrụ niile nke ime mmụọ ma chọọ nkwalite nke mmụọ si n’aka Onyenwe anyị, a ga-eduzi anyị ịma nzube Onyenwe anyị nwere banyere anyị, n’otu n’otu na dị ka ndị ezi na ụlọ, na ụzọ kachasị mma esi etinye ụkpụrụ niile dị mkpa gbasara ime nkwadobe ihe nke anụ ahụ. Usoro kachasị mkpa n’ihe niile bụ i bido.

Okenye David A. Bednar kuziri ụkpụrụ nke a mgbe ọ sịrị na: “Ime ihe kwesịrị ekwesị bụ itinye okwukwe n’ọrụ. … Ezi okwukwe dabeere n’ime na n’elu Onyenwe anyị Jizọs Kraist nke na-edu anyị mgbe niile ime ihe.”18

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, n’ime ụwa nkea na-atụgharị atụgharị, anyị aghaghị ịkwado maka ihe ndị na-atụwaghị anya ha. Ọbụladị nihi na ụbọchị ndị ka mma na-abịa n’ihu, anyị maara na nime ndụ nke anụ ahụ nkea. a ga n’enwe oge ụba juru na-oge ụkọ nọ. Dị ka anyị na-achọ ụzọ ịnwe nkwado n’ihe nke ndụ anụ ahụ, anyị nwere ike zute ihe nnwale niile nke ndụ site na ntụkwasị obi bara ụbara, udo dị anyị n’obi, ma dị ka Josef nọ na Ijipt, anyị ga-enwe ike ị sị, ọbụladị na-ọnọdụ nsogbu, “E nwererịị achịcha.”19 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.