Anyị nwere ike ikpọkọta Izrel!
Enwere m obisike na ununwa bụ ndị ntorobịa ga-emenwu nkea nihi enwere ịhe nọ nime ejirimara unu ma enwere nnukwu ike dị unu nime.
Ịhe ruru afọ atọ gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson kpọrọ ndị ntorobịa ndị Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ụbọchị Ikpeazụ a okú, “ka ha bata nime ndị agha-ntorobịa nke Ọnye Nwe-anyị maka mkpọkọta nke Izrel” maka ndị dị ndụ makwa ndị nwụrụ anwụ. O kwuru, “mkpọkota nke ahụ bụ ịhe kachasị mkpa nke n’eme n’ụwa taa.”1 Enwere m obisike na ununwa bụ ndị ntorobịa ga-emenwu nkea—ma mee ya nke ọma—nihi nke a (1) enwere ịhe nọ nime ejirimara unu ma (2) enwere nnukwu ike dị unu nime.
Afọ iri anọ n’otu gara aga, ndị mgbasa oziọma abụọ si na Nzụkọ nsọ anyị nwere mmetụta nke duuru ha gaa na otu ụlọ dị na New Jersey nime United States. Ka oge gara, nihi ọrụ ọrụebube, nne na nna na ụmụaka ha ruru 10 ka emere baptizim. N’okwu nile nke onye amụma, ha “dị njikere ịkwe ka Chineke merie” na ndụ ha”2 Ekwesịrị m ikwu “ndụ anyị.” A bụ m nwa nke atọ. Agbara m afọ 17 mgbe m kpebiri ịgba ndụ na agam esoro Jizọs Kraịst. Kama ị nwere ike ịkwu ịhe mmkpebiri n’obi? A gaghị m eje ozi nke mgbasa oziọma. Nke ahụ dị nnukwu. Ọkwa nke ahụ ekwesịghị ịbụ ịhe achọrọ n’aka m? A bubụrụ m onye otú dị ezigbote ọhụụ. Enweghi m ego. Ọzọkwa, nagbanyeghi na otebeghi aka m sị na sekọndịrị kacha sie ike gụchaa nke nọ n’akụkụ West Philadelphia ma zute ma merie ọtụtụ aka mgba ndị dị egwu, nime obim ọtụrụ m ụjọ ị hapụ ụlọ m nọruo afọ abụọ.
Ezigbo Ejirimara Gị
Mana otebeghi aka m matara na Mụ na mmadụ nile bibụrụ anyị na Nna nke Igwe dịka ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị nke mụọ tupu ọmụmụ anyị. Ndị ọzọ kwesịrị ịma nke a, dịka otu m si mara, na Ọ chọrọ ka ya na ụmụ Ya nile bikọta ndụ ebighi ebi. Nihi nkea, tupu ọnye ọbịla abịa n’ụwa, Ọ gosiri onye nile atụmatụ Ya zuru oké nke nzọpụta na añụrị ma Jizọs Kraịst dịka onye Nzọpụta anyị. N’obi mwute, Setan anabataghị atụmatụ nke Chineke.3 Dịka otu akwụkwọ nke Mkpughe si kwuo, “alụrụ agha nime eluigwe”!4 Setan jiri aghụghọ ghọgbuo ọtụtụ ụmụ nke mụọ nke Nna nke Eluigwe ma mee ka ọ bụrụ ya nwetere mmeri n’abụghị Chineke.5 Mana i soghi ha! Onye ozi Jọn hụrụ na ị meriri Setan “site na okwu nke ịgba ama [gị].”6
Nihi na m maara ezigbo ejirimara m, ma nwete enyemaka site na ngọzi nke patriarch m, ọ nyere m ume na okwukwe iji nabata ọkpụkpọ okú Onyeisi Spencer W. Kimball kpọrọ maka ịkpọkọta Izrel.7 Ọ ga-adịkwara unu otu ahụ, ndị ezigbo enyi m. Nihi ị mata na ị meriri Setan site n’okwu nke ịgba ama gị gepu-ụzọ nyere gị aka hụ mmadụ n’anya, kesaa ịhe ma kpọ ha okú8ugbua ma mgbe nile,—ka ha bịa ma hụụ, ka ha bịa ma nye aka, ma ka ha bịa ma sonye, nihi agha ahụ alụrụ na mbụ maka mkpụrụ obi ụmụ nke Chineke ka n’aga nihu n’ike.
Ike Okwukwe ahụ di nime Gị
Kedụ maka nnukwu ike ahụ dị nime gị? Cheegodi maka nkea: itiri mkpu maka ọñụ9 maka ị bịa n’ụwa nke dara ada ebe ọnwụ nke anụ arụ na nke mụọ g’erute onye nile. Anyị agaghị enwe ike imeri ha abụọ n’aka anyị. Anyị agaghị ata nanị ahụhụ nke si na mmehie onwe anyị, kama nke sitekwara na mmehie ndị ọzọ. Mmadụ nile g’enweterịrị nhụmịhe nile nke metụtara ịhe isi ike ma ịhe ngharịpụ10—onye nile ka akwa mkpuchi ahụ g’ekpuchi uche anyị ma mee k’anyị chefuo, ma onye iro ọjọọ nke ụwa ga-aga n’ihu n’eshiri anyị ọnya ma na anwa anyị ọnwụnwa. Olileanya ịlaghachi site na mbilite nọnwụ ma dịrị ụcha n’irụ Chineke dabere nanị n’elu otu Ọnye idobe nkwa Ya.11
Kedụ ịhe nyere gị ike ị ga n’ihu? Onyeisi Henry B. Eyring kuziri na “Ọ bụ site n’inwe okwukwe na Jizọs Kraịst ka eji akwado atụmatụ nke ańụrị na ọnọdụ nke Jizọs Kraịst na ya mgbe unu maara nwa obere nke aka mgba ndi unu ga ezute n’ime ndụ anụ ahụ.”12 Mgbe Jizọs Kraịst kwere nkwa na Ọ ga-abịa n’ụwa ma nyefe ndụ Ya maka ịkpọkọ13 ma zọpụta anyị, ị kwenyere na Ya n’ụzọ di ukwu. Ununwa bụ “mụọ ama ama”14 nweburu “nnukwu okwukwe karịrị akarị” nke mere unu ji kwere n’ọga emezu nkwa Ya.15 Ọ gaghị atụ asị mọlị, nihi nkea unu ahụwo Ya dịka Ọ kwafuworịị ọbara Ya maka unu nagbanyeghi na-amụbeghi Ya.16
Dịka Jọn siri kwuo, unu “meriri [Setan] site na ọbara nke nwa atụrụ.”17 Onye-isi Dallin H. Oaks kụziri na nime ụwa ahụ, “[unu] na ahụ mgwụcha ịhe site na mbido ya”18
Ọ bụrụkwanụ na otu ụbọchị tupu ị jewe ụlọakwụkwọ, otu nime nne-na-nna gị kwere otu ezigbo nkwa na ị g’eri nrị ahụ ị kacha nwee mmasị mgbe ị lọtara ụlọ! Obi n’atọ gị ụtọ! Mgbe ị nọ n’ụlọakwụkwọ, ị n’eche otu isi wee n’eri nri ahụ ma ụtọ ya anọrọ gị n’ọnụ. Dịka otu esi eme ịhe, ị ga-ekesara ndị ọzọ ozi ọma nkea. Mgbe ọbụla ịchetara ị laa ụlọ, obi atọ gị ụtọ nke mere mwale na aka mgba nile nke ụlọakwụkwọ adịziere gị mfe. Enweghi ịhe ga-ewere ọñụ gị m’ọbụ mee ka ịnwe obi abụọ nihi na nkwa ahụ bụ nke ezigbote ya! N’otu aka ahụ, tupu a mụọ unu “mụọ ama ama”, unu mụtara otu esi ahụ nkwa nile nke Kraịst n’ụzọ nkea ziri ezi, ma unu anụwo ụtọ nke nzọpụta Ya n’ọnụ unu.19 Nnukwu okwukwe unu dịka akwara ahụ nke ike ya na-abawanye karịịa mgbe ọbụla ejiri ya rụọ ọrụ, mana ha adiwo mbụ nọrọ nime unu.
Kedụ otu ị g’esi akpọlite nnukwu okwukwe gị nke ị nwere na Kraịst ma jiri ya kpọkọta Izrel ugbua ma merie Setan ọzọ? Site n’ịmụtakwa ọzọ otu isi elepụ anya n’ihu, ma hụta n’ezie nkwa ahụ nke Ọnyenwe anyị kwere maka ịkpọkọta ma zọpụta taa. Ọ n’ejikarị Akwukwọ nke Mọmọn na ndị amụma Ya iji kuziere anyị otu esi eme ya. Tupu oge Kraịst, ndị Nịfaị bụ “ndị amụma, ma … ndị ụkọchukwu, ma ndị … nkụzi … [rịọrọ ndị mmadụ] ka ha lee anya chee Mesaịa iru, ma kwere na ya ịbịa ka a ga-asị na ọ bịaworịị.”20 Ọnye amụma Abinadaị kụziri, “Ma ugbua ọbụrụ na Kraịst abịaghị n’ime ụwa, na-ekwu maka ihe ndị ga-abịa dịka a ga-asị na ha abịawọrịị, a garaghị enwe mgbapụta.”21 Dịka Alma, Abinadi “lepụrụ anya n’iru jiri anya nke okwukwe ”22ma hụ nkwa dị iré nke Chineke kwere maka nzọpụta, dịka ịhe emezuworo. Ha “megidere [Setan] site n’ọbara nke Nwa atụrụ ma … okwu nke ịgba ama ha” tupụrịị oge ọmụmụ nke Kraịst, dịka otu isi wee mee. Ma Onyenwe anyị nyeworo ha ike ha ji akpọ okú ma kpọkọta Izrel. Ọ g’emere gị otu ahụ dịka ị na-elepụ anya n’iru nokwukwe, dịka ị na-ahụta mkpọkọta nke Izrel—gburugburu ụwa ma nime “akụkụ” nke gị23—ma kpọ onye nile okú!
Narị kuru narị ndị mgbasa oziọma wuru okwukwe nke ha nwere tupu ndụ anụ arụ nke ha n’elu Kraịst site n’ịhụta ndị ha zutere mọbụ kụziere ka ha yi uwe baptizim na nke tempụl ha. N’otu okwuchukwu akpọrọ “Begin with the End in Mind,”24 Onyeisi Nelson kwuru maka otu ịma atụ nke ya ebe ọ mere ihea ma tuziere ndi ndụ mgbasa oziọma ka ha kuziere ndi mgbasa oziọma ha ka ha mekwa otu ahụ. Nihi ha mara na ha jiri nnukwu okwukwe ha nwere nime Jizọs Kraịst rụọ ọrụ n’oge ndụ tupu nke anụ arụ, ọ nyere ndị mgbasa oziọma anyị aka nke ọma “ị nụ olu Ya”25ma kpalie nnukwu okwukwe ha iji kpọkọta Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa.
N’ezie ịtụle uche banyere okwu-asị n’egbu okwukwe.26 Ndị enyị m, ịkpacha anya n’eche n’obi mọbụ n’ele ịhe ndị n’adabaghị n’okwukwe anyị, tụmadị ịhe ngosi ndị gba ọtọọ, n’eme ka okwukwe ị nwere na Kraịst ghara isi ike, ma ọ g’ebibi ya m’ọbụrụ n’enweghi nchegharị. Biko jiri uche gị iji mụbaa okwukwe ị nwere na Kraịst ma ghara ị merụ ya.
Atụmatụ Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa
Atụmatụ Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa bụ ngwa ọrụ eburu n’amụma maka ị nyere unu ndị ntoroọbịa aka mụbaa okwukwe unu. Onyeisi Oaks kụziri, “Atụmatụ nkea ka arọpụtara maka ị nyere unu aka dịrị ka Kraịst karịa n’ụzọ anọ: nke mụọ, nke mmekọrịta mmadụ na mmadụ, nke ahụ isi ike, na nke amamịhe.”27 Dịka unu ndị ntorọbịa n’edụ—duo nụ— n’ibi ndụ nke oziọma, n’elekọta ndị ọzọ, n’akpọ ndị ọzọ ka ha nata oziọma ahụ, n’ejikọ ezinụlọ ruo ebighi ebi, na ahazi egwuruegwu nke neme obi ọ ụtọ,28nnukwu okwukwe ịnwere na Kraịst n’oge tupụ ndụ anụ arụ g’apụtagharịa ọzọ ma nye gị ike iji rụọ ọrụ nke Ya ndụ nke a!
Ọzọkwa, ebumnuche nke onwe, “tụmadị ebumnuche nke ugbua”29n’enyere gi aka ị kpali nnukwu okwukwe gị. Mgbe ọbụla i ropụtara ezigbo ebumnuche ị na-elepụ anya n’iru, dịka ị mere na mbụ, ma dịka ị n’ahụ ịhe Nna gị nke Eluigwe chọrọ ka gị mọbụ ọnye ọzọ bụrụ.30 Mgbe ahụ ị ga-arọpụta atụmatụ gị rụsie ọrụ ike i ji nwete ya. Okenye Quentin L. Cook kuziri, “Emekwala ka uru dị nime ịhazi ịhe bụrụ ịhe a na-akpọghị ịhe, ịrọpụta ebumnuche …, ma [ịkpọ ndị ọzọ okú]—ihe nile a ka a g’eme jiri anya nke okwukwe.”31
Nhọrọ ahụ dịịrị gị! Onyenwe anyị kwuru maka unu, “Ike ahụ [eji eme nhọrọ] nọ nime ha.”32 Okenye Neil L. Anderse kọwara, “Okwukwe gị g’eto site na nhọrọ n’abụghị site na mmanye.”33 Ọ kwụ kwara, “Ajụjụ [ọbụla] ziri ezi [nke ị nwere] … ka e jiri ndidi na anya nke okwukwe mezie.”34
A na m agba ama na (1) ezigbo ejirimara gị ma (2) nnukwu okwukwe ị nwere na Kraịst nke nọ gị nime g’enyere gị aka “nye aka ị kwado ụwa maka nlaghachi nke Onye nzọpụta site n’ịkpọku onye nile bịakwute Kraịst ma nata ngọzi nile nke Aja mgbaghara mmehie Ya.”35 Ọ g’adị mma m’anyị kesaa ọñụ di nime ezigbo nkwa nke Akwụkwọ nke Mọmọn:
“Ndị ezi-omume ndị na-an̄a-ntị nye … ndị-amụma, ma … lekwasị anya na Kraịst na nkwụsi ike … na -agbanyeghị nsogbu nile … agaghị ala-n’iyi.
“Ma [Kraịst] … ga-agwọ ha, ma ha ga-enwe udo ha na ya.”36
Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen