Ọgbakọ Zuru ọha
Ugbua Bụ Oge Anyị!
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Ugbua Bụ Oge Anyị!

Chineke ezitewo anyị ebe a, ugbua, na oge a pụrụiche nime agụgụala nkea.

Nime afọ 1978, E guzoro m n’ogige ebe ana akụ bọọlụ nime mbara egwuregwu juputara na ndị bọl n’amasị ruru 65,000. Na ihu m enwere ọtụtụ ndị mmadụ na-akwado ndị otú bọl ndị ọzọ ahụ, ndịa yiri ka ha ga-egbupụ isi m. Ọ bụ egwuregwu nke mbụ m dịka onye quarterback nime National Football League, ma anyị na ndị ji mmeri Super Bowll na-agba. Ị gwa gị eziokwu, A jụrụ m ma m kwesiri ịnọ na ebe a. A lara m azụ ịtụ pass nke mbụ m, ma dịka m hapụrụ bọọlụ ahụ, A kụrụ m ihe akụtụbeghị m mbụ. Mgbe ahụ, idina na okpuru ndị ibu ahụ, O juru m anya ihe m na-eme ebe ahụ. E nwere m otu mkpebi nke m g’eme. A ga m ekwe obi abụọ m nile gbanarị m, ma-ọbụ a ga m enweta obisike na mgbam ume iguzo ma gaa nihu?

Ọhụ nke Mbụ

Associated Press

A ghọtaghị m na oge ahụ otu nhụmihe a ga-esi kwado m maka ohere ọma nile na-abia. E kwesịrị m ịmụta na enwere m ike sie ike ma nwee mgbam ume maka izute ọnọdụ nile ndị siri-ike.

Egwuregwu bọọlụ nwere ike ọ gaghị adị mkpa dịka aka-mgba nile ị ga-ahụ. Nime ọtụtụ oge, agaghị enwe ogige egwuregwu jupụtara na mmadụ ndị n’ele anya. Kama mkpebi nile siri ike ga-enwe nnukwu uru ruo ebighi-ebi.

Enwere ike unu enweghị obi mgbe ọbụla imeri aka-mgba ahụ. Kama Nna anyị nke Elu-igwe na-ahụ anyị dịka ndị ọrụ anaghị atụ egwu nke ala-eze Ya. Ya mere O ji zite anyị ebe a n’oge nke a nime agụgụala nke ụwa. Ugbua bụ oge anyị!

Gee ntị nye ihe Onye-isi Russell M. Nelson kwuru mgbe na adịghị anya ka ọ bụrụ Onye-isi nke Nzukọ-nsọ: “Onye nzọpụta na Onye-mgbapụta anyị, Jizọs Kraist, ga-eme ụfọdụ ọrụ Ya nile nke kachasị sie ike, site ugbua na mgbe Ọ ga-abia ọzọ. Anyị ga-ahụ ọrụ ebube gosịrị na Nna nke Elu-igwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraist, nọ n’isi Nzukọ-nsọ a n’ụdị ebube na otuto” (“Mkpughe maka Nzukọ-nsọ ahụ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Laịhona, Mee 2018, 96).

Ọrụ nile kachas sie ike? Ọrụ ebube egosịpụtara? Kedụ otu nke ahụ ga-adị? Olee ihe anyị ga-eme, ma kedu ka anyị ga-esi mata ihe anyị ga-eme? A maghị m ọziza nile ahụ, kama A mara m na Onye-nwe-anyị chọrọ ka anyị dị na njikere! Iji ike ọkwa nchụ-aja rụọ ọrụ na itozu oké dị mkpa ugbua.

Anyị kwenyere na onye-amụma nke Chineke? Anyị nwere ike ịchọta ma mezuo akáraka anyị? Ee, anyị nwere ike, ma ee, anyị garịrị, nihi ugbua bụ oge anyị!

Mgbe anyị na anụ akụkọ nile nke ndị odibo siri ike nke Chineke ndị bu anyị ụzọ bia—dịka Moses, Mary, Moronaị, Alma, Esther, Joseph, na ọtụtụ ndị ọzọ—ha na adị ukwuu karịa ndụ. Kama ha adịghị kwa iche site ebe anyị nọ. Ha bụrịị ndị mmadụ ndị zutere aka-mgba nile. Ha tụkwasịrị Onye-nwe-anyị obi. Ha mere ezigbo nhọrọ n’oge nile dị mkpa. Ma, ịnwe okwukwe nime Jizọs Kraist, ha rụrụ ọrụ nile dị mkpa n’oge ha.

Onye-amụma Joshua

Nnu dị mma

Tulee odogwu nke Agba Ochie Joshua. Ọ bụụrụ onye n’eso Moses, otu nime ndị ndu kachasị nime agụgụala. Mgbe Moses hapụrụ, ọ bụrụ oge nke Joshua. Ọ bụ ya nwere ọrụ idu ụmụ Israel banye nime ala ekwere na nkwa. Olee ka ọ ga esi mee nke a? Amụrụ Joshua ma zụọ ya ka ohu nime Egypt. O nweghị obere akwụkwọ ma-ọbụ vidio nkuzi ịnyere ya aka. O nwedịghị ma ọbụlaghị otu ekwentị! Kama o nwere nkwa nke a site n’aka Onye-nwe-anyị:

“Dịka M nọnyere Moses, otu a ka M ga-anọnyere unu: A gaghị m agharịpụ unu, ma ọbụ hapụ unu.

“Kwudosie Ike ma nwee ezi agbam ume” (Joshua 1:5–6).

Mgbe m bụ onye Iri Asaa ọhụrụ namachaghị ọrụ m, A natara m ozi na ekwe ntị site na Ụlọ-ọrụ nke Otu Ndị-isi Mbụ, na-ajụ ma m nwere ike ịnọchi anya onye-amụma na ileta otu nwa nwoke nọ nime ụlọ-ọgwụ—otu mgbe ahụ. Aha nke nwa nwoke ahụ bụ Zach. Ọ nara akwado ịbụ onye-mgbasa oziọma kama nwee ihe mberede ma nwee mmerụ ahụ n’isi dị ukwuu.

Dịka m n’aga na ụlọ-ọgwụ, obi mapụrụ m. Ijere onye-amụma ozi—ị na egwuregwu? Gịnị ka m ga-ahụ? Olee ka m ga esi nyere nwa nwoke a aka? E nwere m okwukwe zuru oké? Ikpesi ekpere ike na ịmata na e nwere m ikike nke ọkwa nchụ-aja dị nsọ bụrụ ebe m jidere aka.

Mgbe M rutara, Zach dinara n’elu akwa ụlọ ọgwụ. Otu onye enyemaka guzoro na njikere ị kpọba ya na ụlọ nta ụlọ ọgwụ ka ndị dọkịnta belata mgbu ahụ n’eme nime ubụrụ ya. E lere m nne ya na ebe akwá na enyi ya ụjọ n’atụ anya, ndị guzoro nso, ma o doro m anya na Zach chọrọ ngọzi ọkwa nchụ-aja. Enyi ya natara Ọkwa nchụ-aja Melkizedek oge adịghị anya, ya mere A gwara m ya ka onyere m aka. E nwere m mmetụta ike nke ọkwa nchụ-aja dịka anyị ji umeala nye Zach ngọzi. Mgbe ahụ e bupụrụ ya ọsọsọ maka iwa ahụ, ma mmetụta udo gosiri na Onye-nzọpụta ga-eme ihe Ọ chọrọ ime.

Ndị ọrụ ụlọ ọgwụ mere X-ray ikpeazụ tupu ha awa ya ahụ nke mbụ. Ha chọpụtara, na ijuanya, na ekwesịghị ịwa ya ahụ.

Ka emechara ọtụtụ ọgwụgwọ, Zach mụtara ị ga ije na ikwu okwu ọzọ. Ọ jere ozi mgbasa oziọma nke ọma ma ugbua o nwere ezinaụlọ ọma.

N’ezie, nke a abụghị otu ọ nadị mgbe ọbụla. E nyewo m ngọzi nile ọkwa nchụ-aja ndị ọzọ jiri otu okwukwe ahụ, ma Onyenwe-anyị enyeghị ọgwụgwọ zuru oké nime ndụ a. Anyị nwere ntụkwasị obi na ebum n’uche Ya ma hapụrụ Ya nsonaazụ nile. Anyị enweghị ike ịhọrọ ihe ga-esi na omume anyị apụta mgbe ọbụla, kama anyị nwere ike ịhọrọ ịdị na njikere ime ihe.

Enwere ike agaghị asi unu site na Otu Ndị-isi Mbụ ka unu nọchite anya ha na ụdị ọnọdụ ahụ. Kama akpọrọ anyị nile ime ihe nile na agbanwe ndụ dịka ndị nnọchite anya nke Onye-nwe anyị. Ọ gaghi ahapụ anyị Ugbua bụ oge anyị!

Pita, onyeisi ndị-ozi nke Onye nzọpụta, nọọrọ nime ụgbọ mmiri nọ nelu okeosimiri mgbe ọ hụrụ ka Jizọs n’aga n’elu mmiri. Ọ chọrọ isonye Ya, ma Onye-nzọpụta sịrị, “Bia.” Na obisike, na orụ ebube, Pita hapụrụ nchekwa nke ụgbọ mmiri ahụ ma bido ịgakwu Onye-nzọpụta. Kama mgbe Pita legidere anya na ikuku neme mkpọtụ, okwukwe ya dapụrụ. “Ụjọ tụrụ ya; ma bido imi, o tiri, na-asi, Onye-nwe-anyị, zọpụta m. Ma otu mgbe ahụ Jizọs setipuru aka Ya, ma jide ya.” (Lee Matiu 14:22–33.)

Jịzọs na-erute

Mgbe ikuku kuru nime ndụ anyị, ebee ka anyị na eleanya? Cheta, enwere otu isi iyi kwesiri ntụkwasị obi mgbe ọbụla nke ike na mgbamume Aka nke Jizọs na erute anyị, dịka ha rutere Pita. Dịka anyị na-agakwuru Ya, Ọ ga-anapụta anyị. Anyị bụ ndị Ya. Ọ sịrị,”Atụla ụjọ: maka A gbapụtawo m unu, A kpọla m unu aha unu; unu bụ nkem” (Aịzaaya 43:1). Ọ ga emeri nime ndụ unu ọbụrụ na unu kwe Ya. Nhọrọ ahụ dịrịị unu. (Lee Russell M. Nelson, “Ka Chineke nwee Mmeri,” Laịhona, Nov. 2020, 92–95.)

Na njedebe nke ndụ ya, Joshua rịọrọ ndị ya, “Họrọnụ taa onye unu ga-efe; … kama mụ onwe m na ezinaụlọ m, anyị ga-efe Onye-nwe-anyị” (Joshua 24:15). Nihi nhọrọ nile o mere ijere Onye nwe-anyị ozi, Joshua bụụrụ onye-ndu dị ukwuu nime oge ya. Ezi ndị enyi m, ugbua bụ oge anyị! Ma nhọrọ anyị nile ga ekpebi akaraká anyị (lee Thomas S. Monson, “Nhọrọ nile na-ekpebi Akaraká” [Brigham Young University fireside, Nov. 6, 2005], speeches.byu.edu).

Mgbe M na-eje ozi dịka Bishọp, anyị nwere okwu nlekwasị anya nime ngalaba ukwu anyị: Nhọrọ ọma n’ebute ańụrị—mgbe ebighi-ebi. Mgbe ndị ntoroọbịa ga-ezute m na hall, ha n’asị, “Bishọp, A na m eme nhọrọ ọma!” Nke a bụ ịhe bishọp ọbụla chọrọ!

Gini ka “nhọrọ ọma” pụtara? Otu onye jụrụ Jizọs na mbụ, “olee iwu-nsọ kachasị n’ime iwu?” Ọ zara:

“Ị ga-ewere obi gị nile, na mkpụrụ obi gị nile, na uche gị nile hụ Onye nwe gị Chineke gi n’anya.

“Nke a bụ ịhe ukwu na ịhe mbụ enyere n’iwu-nsọ.

“Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dịka onwe gị” (Matiu 22:36–39).

A maghị m maka gị, kama mgbe m gụrụ iwu-nsọ ndị ahụ dị ukwuu, A chọpụtara m nke atọ, iwu-nsọ: ịhụ onwe gị nanya.

Ichetuwo echiche nke ịhụ onwe gị nanya dịka iwu nsọ? Anyị nwere ike na-ezie hụ Chineke na ụmụ Ya nanya ọbụrụ na anyị ahụghị onwe anyị nanya?

Otu onye ndu mara ihe na nso nso a dụrụ otu nwoke ndụmọdụ, onye nke na-agbali imeri afọ nile nke nhọrọ nile na egbu egbu. Ihere mere nwoke ahụ, ma onwere obi abụọ ma otozuru ịhụ nanya nke onye ọbụla.

Onye ndu ya gwara ya, “Onyenwe-anyị mara gị, hụ gị nanya, ma nwee obi ọma ebe [gị] nọ ma ije ụkwụ mgbamume ị na-aga.” Kama mgbe ahụ ọ gbakwunyere, “[Ị] kwesịrị ịnụ iwu nsọ nke ịhụ onwe gị nanya ka inwe ike nwee mmetụta nke ịhụnanya [Chineke] ma hụ ndị ọzọ nanya.”

Mgbe nwanne nwoke a nụrụ ndụmọdụ ahụ, ọ jiri anya ọhụrụ nile hụ ndụ. O mechara kwuo, “A gbalịala m na ndụ m nile ịchọta udo na nnabata. A chọwom m ihe ndị ahụ nime ọtụtụ ebe adịghị mma. Ọ bụ nanị nime ịhụnanya nke Nna nke Elu-igwe na Onye-nzọpụta ka m nwere ike chọta nkasị obi. A mara m na Ha chọrọ ka m hụ onwe m nanya; ọ bụ n’ezie nanị ụzọ m nwere ike nwee mmetụta ịhụnanya Ha ebe m nọ.”

Nna anyị nke Elu-igwe chọrọ ka anyị hụrịta onwe anyị nanya—ọbụghị ka anyị nwee mpako ma-ọbụ iche maka onwe, kama ka anyị hụ onwe anyị dịka Ọ na ahụ anyị: anyị bụ ụmụ Ya o ji kpọrọ ihe. Mgbe eziokwu nke a mikpuru nime obi anyị, ịhụnanya anyị ebe Chineke nọ na-eto. Mgbe anyị ji ezigbo ugwu hụ onwe anyị, obi anyị na emepe imesokwa ndị ọzọ otu ahụ. Ka anyị na-amata karịa ihe anyị pụtara nihu Chineke, ka anyị na amata karịa eziokwu nke Chineke a: na Chineke zitere anyị ebe a, ugbua, na oge nke a nime agụgụala, ka anyị nwe ike mee ihe ọma anyị inwere ike jiri onyinye chi na onyinye nile anyị nwere. Ugbua bụ oge anyị! (Lee Russell M. Nelson, “Becoming True Millennials” [worldwide devotional for young adults, Jan. 10, 2016], broadcasts.ChurchofJesusChrist.org.)

Josef Smit kuziri na onye-amụma ọbụla, nime ọgbọ ọbụla, “jiri ọńụ na-atụanya ụbọchị nke a anyị bi nime ya; … ha gụrụ abụ ma dee ma buo amụma nke ụbọchị anyị taa; … anyị bu ndị a kwadoro na Chineke [họpụtara] iweta otuto ụbọchị Ikpeazụ a” (Teachings of Presidents of the Church: Josef Smit [2007], 186).

Dịka ị na-ahụ aka-mgba nile kwa ụbọchị, cheta mmesi obisike a sitere n’aka Okenye Jeffrey R. Holland: “Ọtụtụ ihe dakwasịrị n’elu ubu aka anyị, kama ọ ga-abụ nhụmihe ọma dị ebube.… Mmeri nime ndọrọndọ ikpeazụ a ka e kwpụtarala. Mmeri nọburịị nime akwụkwọ ndekọihe nile … , akwụkwọ-nsọ!” (“Be Not Afraid, Only Believe” [address to Church Educational System religious educators, Feb. 6, 2015], broadcasts.ChurchofJesusChrist.org).

Na ime ọmarịcha ngwụcha izuụka nke a, ka M kpọkuo unu na anyị nile ga-ekpe ekpere ịmata ma makụọ ọrụ anyị nile dịka anyị na-akwado maka ụbọchị ahụ dị ebube mgbe Onye-nzọpụta ga abia ọzọ. Onyenwe anyị hụrụ anyị nanya karịa otu anyị chere, ma Ọ ga aza ekpere anyị nile! Ma ọ bụ na anyị nọ na mbara egwuregwu ana akụ bọọl, nime ụlọ nta ụlọ-ọgwụ, ma-ọbụ nime ebe ọzọ, anyị nwere ike bụrụ akụkụ nke dị mkpa nke emume nile ndị a dị ịrịba ama—nihi ugbua bụ oge anyị! Na aha nke Jizọs Kraịst, amen.