Onye-nzọpụta Nke Onwe Anyị
Nihi ịchụ aja mgbaghara mmehie Ya, Onye-nzọpụta nwere ike ịsacha, ịgwọ, na ịgba anyị ume otu na otu.
E nwere m obi ekele ka mụ na unu nọ na ụtụtụ Ista nke a dị egwu. Mgbe m chere echiche banyere Ista, A na m enwe mmasị ịmụgharị nime obi m okwu nile ahụ ndị mụọ-ozi kwuru nye ndị ahụ nọ na ili nke Ubi ahụ: “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ netiti ndị nwụrụ anwụ? Ọ nọghị n’ebe a, kama o biliwo n’ọnwụ.”1 A na m agba ama na Jizọs nke Nazaret biliri na ọnwụ ma Ọ dị ndụ.
Gịnị ka unu chere maka Kraịst?
Afọ iri atọ na anọ gara-aga, onye nso m na mgbasa ozi-ọma na mụ hụrụ ma kuziere otu nwoke nwere ọgụgụ-isi onye nke nara ede akwụkwọ, nime akwụkwọ akụkọ obodo Davao, Philippines. Anyị nwere ọńụ ịkuziri ya nihi o nwere ọtụtụ ajụjụ ma nwee oke nkwanye-ugwu nye nkwenye anyị nile. Ajụjụ enweghị ike ichefu echefu ọjụrụ anyị bụ “Gịnị ka unu chere maka Kraịst?”2 Anyị jiri obi-ọma kọrọ ya mmetụta anyị nile ma gbaa-ama banyere Jizọs Kraịst. O mechara dee akwụkwọ gbasara otu isiokwu ahụ buuru ọtụtụ okwu dị egwu na ọtụtụ nkebiokwu gbasara Onye-nzọpụta. E chetara m inwe mmasị kama obulighị m elu. O nwere ezigbo ozi kama onweghị ike nke mụọ.
Abawanye Na-abia Ịmata Ya
“Gịnị ka unu chere maka Kraịst?” A na m achọpụta na ka m si mara Onye-nzọpụta nke ọma nwere oke mmetụta nye ikike m ịnụ olu Ya, dịka ihe M ga-eme. Afọ ole na ole gara-aga, Okenye David A. Bednar jụrụ ajụjụ ndị a dịka ihe soro na okwu o kwuru: “Anyị maara nanị ihe gbasara Onye-nzọpụta, ma-ọbụ anyị na-abawanye na-abia ịmata Ya? Olee otu anyị si abia ịmata Onye-nwe-anyị?”3
Dịka M na-agụ akwụkwọ ma na-atụgharị uche, A biara m ghọta na ihe M mara gbasara 0nye-nzọpụta karịrị nke ọma ka M si mara Ya. E kpebiri m mgbe ahụ ịgbali karia ịmata Ya. E nwere m obi ekele maka akwụkwọ-nsọ na ọgbụgba-ama nke ndị nso nwoke na nwanyị nke Jisọs Kraịst. Njem nke m na afọ ole na ole gara-aga ebugala m ọtụtụ ụzọ nke ọmụmụ ihe na nchọpụta. A na m ekpe ekpere ka Mụọ Nsọ bunye unu ozi nke karịrị okwu ndị na-ezughị-oke M depụtara taa.
Nke mbụ, anyị kwesịrị ịmata na ịma Onye-nzọpụta bụ ịchụso kachasị mkpa nke ndụ anyị nile. O kwesịrị ibu ụzọ karia ihe ọzọ ọbụla.
“Ma nke a bụ ndụ ebighi ebi, ka ha wee mara gị onye nanị ya bụ ezi Chineke, na Jizọs Kraịst, onye i zitere.”4
“Jizọs sịrị ya, A bụ m ụzọ, ezi-okwu, na ndụ, ọdighị onye ọbụla na-abịakwute Nna, ma ọbụghị site na mụ.”5
“A bụ M ihé nke ụwa: onye-ọbụla soro m agaghị aga-ije n’ọchịchịrị, kama ọ genwe ihé nke ndụ.”6
Nke abụọ, dịka anyị na-abawanye ibia ịmara Onye-nzọpụta ahụ, amaokwu nile nke akwụkwọ-nsọ na okwu nile nke ndị amụma na-apụta ihe nye anyị mere ka ha bụrụ okwu nke anyị. Ọ bụghị ihe gbasara ińomi okwu nile, mmetụta nile, na nhụmihe nile nke ndị ọzọ dịka ọbụ ibia ịmara na onwe anyị, nụzọ pụrụ iche nke anyị, site na ime ihe nchọpụta na okwu7 ma nata aka ebe site naka Mụọ Nsọ ahụ. Dịka onye-amụma Alma kwupụtara:
“Unu echeghị na m matara maka ihe ndị a na onwe m? Lee, a na m agbara unu ama na ama m na ihe ndị a m gwaworo unu maka ha bụ ezi-okwu. Ma olee otu unu siri chee na m matara maka ha ịbụ ihe ga-eme eme?
“Lee, A sị m unu e mere ka m mata ha site na Mụọ Nsọ nke Chineke. Lee, ebuwo m ọnụ ma kpee ekpere ọtụtụ ụbọchị ka m wee mata ihe ndị a n’onwe m. Ma ugbua a matara m n’onwe m na ha bụ ezi-okwu; n’ihi na Onye-nwe Chineke egosịpụtawo m ha site na Mụọ Nsọ ya; ma nke a bụ mụọ nke mkpughe nke dị n’ime m.”8
Nke atọ, ịmata na-abawanye na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na-emetụta anyị ga enyere anyị aka ịmara Ya. Mgbe na mgbe ọ na adịrị anyị mfe iche ma ikwu maka Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst nụzọ dị iche karịa ịmata mkpa ọ dị nime ndụ anyị nile. Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst enweghị ọkwụkwụ na ebighi-ebi ma zuru oke kama na emetụta mmadụ. Nihi ịchụ aja mgbaghara mmehie Ya, Onye-nzọpụta nwere ikike ịsacha, ịgwọ, na gbaa anyị ume otu na otu.
Nanị ọchịchọ nke Onye-nzọpụta, nanị e bu m nobi Ya site na mbido, bụ ime ihe Nna chọrọ. Ọchịchọ nke Nna bụ ka onye aka nime “[iweta] na mmezu anwụgh-anwụ na ndụ ebighi-ebi nke mmadụ”9 site na ịbụ “onye nekwu ọnụ anyị nebe Nna anyị nọ.”10 Nihi ya, “ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara, ma ọ mụtara irube-isi ya site na ahụhụ nile ọ hụrụ; ebe e mere ka o zuo oke, o wee họọrọ ndị nile na erubere ya isi onye na-ewwtere ha nzọpụta ebighi-ebi.”11
“Ma ọ ga-agagharị, na-ata ahụhụ mgbu nile na mkpagbu nile na ọnwụnwa nile n’ụdị ọbụla. …
“Ma ọ ga ebukwasị onwe ya ọnwụ, ka o wee tọpụ agbụ nile nke ọnwụ … ma ọ ga ebukwasị onwe ya adịghị ike ha nile, ka afọ ya nile wee jupụta n’ebere,… ka o wee mata dịka n’anụ arụ otu ọ ga-esi nyere ndị ya aka dịka adịghị ike ha nile siri dị.
“… Ọkpara Chineke na-ata ahụhụ dịka n’anụ arụ na ọ ga ebukwasị onwe ya mmehie nile nke ndị ya, ka o wee hichapụ njehie ha nile dịka ike nke nnapụta ya siri dị.”12
A ga m akọrọ unu nhụmihe dị mfe ga-egosi ịgba lika lika anyị na-ahụ mgbe ụfọdụ ịnabata ụdị okike nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye-nwe-anyị.
Ọtụtụ afọ gara-aga, mgbe onye ndu m kpọrọ m, A gụrụ m Akwụkwọ nke Mọmọn site na isimbido ruo na ọgwụgwụ ma nye amaokwu nile dere ihe gbasara Aja mgbaghara mmehie nke Onye-nwe-anyị akárá. Onye ndu m gwakwara m ka m dee otu ihu-akwụkwọ nchikọta nke ihe m mụtara. A sịrị m onwe m, “Otu ihu-akwụkwọ? Ee, nke ahụ dị mfe.” Na ịtụnanya nye m, agbanyeghị, A chọpụtara m na ọrụ ahụ siri-ike nke ukwuu, ma emelighị m ya.
A chọpụtar a m rịị na emelighị m ya nihi a hapụrụ m ahịrị ahụ nwere akara ma nwee echiche nile abụghị eziokwu. Nke mbụ, A tụrụ m anya na nchịkọta ahụ ga-akpake mụọ onye ọbụla. E mere nchịkọta ahụ maka m na abụghị maka onye ọzọ ọbụla. O kwesịrị inweta mmetụta na mmetụta uche m nile gbasara Onye-nzọpụta ahụ na ihe O meworụ m ka ọbụrụ na mgbe ọbụla m gụrụ ya, ọ ga-ebupụta nhụmihe mụọ nke onwe dị egwu, na-ewute nke ọjọọ, na nhụmihe mụọ nile nke onwe.
Nke abụọ, A tụrụ m anya na nchịkọta ahụ ga-adị egwu ma kọwa nuju ma buru kwa nukwu mkpụrụ-okwu na nkebi okwu nile. Ọ bụghị maka nukwu mkpụrụ okwu nile. E mere ka ọbụrụ nkwupụta nke nkwenye doro anya ma dị mfe. “N’ihi na mkpụrụ-obi m nwere mmasị n’ịdị mfe nghọta; n’ihi na n’ụdi dị otu a ka Onyenwe anyị Chineke si na-arụ ọrụ n’etiti ụmụ nke mmadụ. N’ihi na Onyenwe anyị Chineke na-enye ndị nwere nghọta ìhè.”13
Nke atọ, A tụrụ m anya ka ozuo oke, otu nchịkọta ga-emezu nchikọta nile—nchikọta ikpeazụ nke mmadụ ekwesịghị itinye ihe ọbụla—kama ọrụ naga-aga nke m nwere ike itinye otu okwu ebe a ma-ọbụ otu nkebiokwu ebe ahụ dịka nghọta m nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na-abawanye.
Ịgba-ama na Ịkpọ-oku
Dịka nwa okorobịa, A mụtara m ọtụtụ ihe site na mkparịta ụka nile mụ na ụkọchukwu m nwere. Na afọ nile ndị ahụ dị nro, A mụtara m ịhụ mkpụrụ-okwu nile ndịa site na abụ ọma na-aka amasị m :
E guzoro m na ịtụnanya na ịhụnanya Jizọs na-enye m,
Nọrọ na mgbagwoju anya na amara nke zuru ezu ọ na-enye m.
A na m ama jijiji ịmata na ọ bụ nihi m ka eji kpọgide ya nobe,
Na maka m, onye mmehie, ọ tara ahụhụ, ọ gbara ọbara ma nwụọ.
Onye-amụma Moronaị kpọrọ anyị: “Ma ugbua, A ga m atụnyere unu uche ka unu chọọ Jizọs a nke ndị-amụma na ndị-ozi deworo maka ya.”15
Onyeisi Russell M. Nelson kwere nkwa na “ọbụrụ na [anyị] ga nihu ịmụta ihe nile [anyị] nwere ike gbasara Jisọs Kraịst, … ikike [anyị] ịgbanarị mmehie ga-abawanye. Ọchịchọ [anyị] idobe iwu nile ga-agbago.”16
Na Ista Sọnde nke a, dịka Onye-nzọpụta pụtara site na ili okwute Ya, ka anyị bilite site na ịda mba nke ime mmụọ ma gafere igwe ojii nke obi abụọ, njide nke egwu, nganga na-egbu egbu, na ngụgụ akwa nke afọ ojuju nke onwe. Jizọs Kraịst na Nna nke Elu-igwe dị ndụ. A na m agba-ama nke ịhụnanya zuru oke Ha nwere ebe anyị nọ. Na aha nke Jizọs Kraịst, amen.