Come, Follow Me
Jun 9–15: “Mụ na Ndị Kwesịrị ntụkwasị obi nọ Mgbe niile”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60–63


“Jun 9–15: ‘Mụ na Ndị Kwesịrị ntụkwasị obi nọ Mgbe niile’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60–63,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60–63,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

ọkụ kampụ n’akụkụ Osimiri Missouri

Nkọwa sitere na Ọkụ n’Ezi n’akụkụ Osimiri Missouri, site n’aka Bryan Mark Taylor

Jun 9–15: “Mụ na Ndị Kwesịrị ntụkwasị obi nọ Mgbe niile”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60–63

Na mbido Ọgọst 1831, Josef Smith na okenye ndị ọzọ nke Nzukọ nsọ naara akwado ịlaghai na Kirtland mgbe ha gasịrị nkenke njem ruo “ala nke Zayọn” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:3). Onyenwe anyị chọbuuru ha ikwusa ozi ọma noge njem ha (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:10), ma ụfọdụ niime ha mere otu a nke ọma. Mana ndị ọzọ lara azụ. “Ha zoro onyinye chi nke m nyeworo ha,” ka Onyenwe anyị kwuru, “niihi ịtụ egwu mmadụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:2). Ọtụtụ niime anyị maara ụdị mmetụta ndị okenye ndị a nwetere. Ọbụna na-agbanyeghị anyị hụrụ ozi ọma naanya, ịtụ egwu na obi abụọ nwere ike igbochi anyị site na-ikesa ya. Mana Onyenwe anyị dị obi ebere. Ọ “maara adịghị ike nke mmadụ na otu esi akasi [anyị] obi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 62:1). Na gburugburu mkpughe ndị a enyere ndị mgbasa ozi ọma isimbụ ka e nwere mmasi obi ike juputara nke nwere ike inyere anyị aka merie ịtụ egwu na adịghị ike anyị: “E nwere m ike ime ka ịdị nsọ.” “Anụ ahụ niile nọ n’aka m.” “Mụ na ndị kwesịrị ntụkwasị obi nọ mgbe niile.” Ma “Onye ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ma nagide ga-emeri ụwa.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:7; 61:6; 62:9; 63:47.)

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60; 62

E nwere m ike ikesa ịhụnaanya m na ama m banyere Jizọs Kraịst.

Olee otu ama nke ozi ọma gị si dị ka “onyinye chi,” ma ọ bụ akụ sitere na Chineke? Kedụ ụzọ ndị anyị na-esi mgbe ụfọdụ “ezo onyinye chi [anyị]”? Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:2; lee kwa Matiu 25:14–30).

Kedụ ozi mgbam ume ndị sitere n’aka Onyenwe anyị ị hụtara niime nkeji 60 na 62? Olee otu ozi ndị a si ewuli obisiike gị na-ikesa ozi ọma? Dị ka ị na-atụgharị ajụjụ ndị a n’uche, tulee ikwe ukwe ma ọ bụ ịgụ okwu niile nke “A Chọrọ M Ị Bụ Onye Mgbasa ozi ọma Ugbu a” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 168). Kedụ ihe ị na-amụta site n’egwu nke ụmụntakịrị nke a banyere ikesa ozi ọma?

Lee kwa nchịkọta “Ikesa Ozi ọma” ndị edekọtara niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

ikesa ozi ọma niime ụgbọala bọọsụ

E nwere m ike ịmeghe obi m banyere ikesa okwukwe m niime Kraịst.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:2–4; 61:1–2, 20, 36–38; 62:1, 6

Akwụkwọ nsọ na-akuzi maka Jizọs Kraịst

Dị ka Ọ kụziiri ndị mgbasa ozi ọma Ya, Onyenwe anyị kpughere eziokwu niile dị mkpa banyere Onwe Ya. Chọọ maka eziokwu ndị a niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:2–4; 61:1–2, 20, 36–38; 62:1, 6. Kedụ nkọwapụta ndị sitere na akwụkwọ nsọ na-egosipụta ọrụ niile na àgwà nke Onye Nzọpụta nke ị chọtara? (lee, maka ịmaatụ, Jọn 8:1-11; Ita 2:14-15).

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 62

Mkpebi m niile kwesịrị ịhata “ikpe ikpe na ntuzi aka nke Mmụọ.”

Onyenwe anyị na-enye ntuzi aka banyere eziokwu niile na ụkpụrụ ebighị ebi niile, mana ọtụtụ mgbe Ọ na-ahapụ anyị ikpebi uju niile a kpọrọ aha banyere otu esi eji ụkpụrụ ndị a eme ihe. Olee otu i si ahụ ngosipụta ụkpụrụ nke a niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 62? (lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:5; 61:22). Olee otu i si ahụ ụkpụrụ nke a niime ndụ gị? Gịnị mere o ji dị mma na anyị ga-eme ụfọdụ mkpebi na-atụghị anya Chineke ịgwa anyị kpọmkwem ihe a ga-eme?

Lee kwa Ita 2:18–25; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:27–28.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:7–12

Ihe iriba ama niile na-abịa site na okwukwe na uche nke Chineke.

Na ngwụcha ndepụta nke a, e nwere ngosipụta nke otu ọrụ ebube nke masịrị Ezra Booth nke ukwuu: ogweaka nke Elsa Johnson ka agwọrọ n’ụzọ dị ebube. Mgbe ọ hụchara nke ahụ, ọ nụrụ Ezra ọkụ n’obi ime baptizim. Ma otu ọ dị, naanị niime ọnwa ole ma ole, Ezra dapụrụ n’okwukwe ya ma bụrụ onye na-akatọ Onye Amụma. Olee otu nke a si bụrụ, itulekwa ọrụ ebube nke ọ hụtaworo?

Tụgharịa uche na nke a dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:7–12. Kedụ eziokwu ndị ị na-amụta banyere ihe iriba ama niile na okwukwe?

Lee kwa Matiu 16:1–4; Jọn 12:37; Mọmọn 9:10–21; Ita 12:12, 18.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:16

akara ngosi semịnarị
E nwere m ike ịdị ọcha niime echiche na agwa m niile.

Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:16, Onye Nzọpụta kwusigharịrị ihe Ọ kuziri niime Testament Ọhụrụ ike—na iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta kwesịrị ịchị ọbụghị naanị agwa anyị kamakwa echiche anyị (lee Matiu 5:27–28). Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:16, detuo ịdọ aka na ntị niile Onye Nzọpụta na-enye banyere echiche agụụ nke anụ ahụ. I nwekwara ike tụgharịa uche ndịiche ịdọ aka na ntị nke ọbụla. N’ịmaatụ, gịnị bụ ụfọdụ mkpụrụ okwu ma ọ bụ nkebiokwu ndị bụ ndịiche nke ịtụ egwu? Kedụ ngọzi ndị ọzọ na-abịa site na-inwe echiche na agwa dị ọcha?

Ọtụtụ mmadụ na-eche na ọnọdụ nke Onyenwe anyị maka ịdị ọcha n’echiche na agwa bụ ihe mgbe ochie ma ọ bụ ọbụna nke mmekpa ahụ. Kedụ ndịiche ga-eme ọ bụrụ ma ụmụ Chineke niile naara agba mbọ idebe iwu nke a? I nwere ike chọọ maka azịza nye ajụjụ nke a dị niime ozi nke Okenye Devid A. Bednar “Anyị Kweere na-Ịdị Ọcha nobi” (Liahona, Me 2013, 41–44) ma ọ bụ “Ahụ gị dị nsọ” (Maka Ume Ndị Ntoroọbịa: Ododu maka Ime Nhọrọ niile, 23–26). Kedụ ozi niile nke olileanya ị na-achọta?

Ọbụna mgbe anyị maara na ngọzi niile nke ịdị ọcha niime echiche na agwa anyị, nke ahụ apụtaghị na ọ dị mfe. I nwere ike were ụfọdụ oge iji tụgharịa uche ihe na-eme o ji esiri gị ike idebe ụkpụrụ nke Onye Nzọpụta nke ịdị ọcha mmekọrịta—na ihe na-eme ya adị mfe karịa. Kedụ ero ndị i nwere ike ikesara ndị ọzọ banyere ihe ị ga-eme mgbe a nwara gị ọnwụnwa site na echiche ndị na-adịghị mma?

Kwadoonu otu onye n’ibe ya. Otu niime nnukwu ngọzi niile nke izukọta ọnụ niime nzukọ niile na klas niile nke Nzukọ nsọ bụ ohere iji nwete nkwado site n’aka Ndị nsọ ibe anyị niime mgbalị anyị iji soro Onye Nzọpụta. Ọtụtụ niime anyị na-ezute aka mgba ndị yiri ibe ha, ma nhụmiihe anyị nwekọtara ọnụ nwere ike bụrụ nnukwu ume. Atụla ụjọ ikwere na ị nwere ihe aka mgba dị iche iche. Kesaara onye ọbụla ihe na-enyere gị aka debe iwu niile nke Chineke ma merie ọnwụnwa.

Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:45; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Omume ọma,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; “Ụkpụrụ niile: Ịdị ọcha Mmekọ ahụ na Ime ihe n’ọkara—Ezigbo Obisike” (vidiyo), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; AddressingPornography.ChurchofJesusChrist.org

3:58

Standards: Sexual Purity and Modesty - True Confidence

Two young women share their secret for confidence and self-worth: the companionship of the Holy Ghost.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:58–64

Ihe ndị dị nsọ kwesịrị ka akpasu ha agwa na nkwanye ugwu.

Ụkpụrụ niile dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:58–64 gafere iwere aha nke Onyenwe anyị mee ihe efu. Kedụ ihe ndị ọzọ dị nsọ na-abịa “site n’eluigwe,” ma ọ bụ site n’aka Chineke? Gịnị ka ọ pụtara nye gị ikwu maka ihe ndị a “na mkpachapụ anya”?

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

Akụrụngwa niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile
akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 03

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:4; 61:1–2, 36; 62:1

Akwụkwọ nsọ na-akuzi banyere Jizọs Kraịst

  • Elemaanya i nwere ike ide ụfọdụ niime nkwupụta banyere Onye Nzọpụta achọtara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60-62 n’elu ụmụ mpempe akwụkwọ. Ụmụ gị nweziri ike hakọta ihu na ihu nkwupụta niile na foto niile nke Jizọs sitere na ije ozi ọma Ya n’ụwa (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nos. 34-61) nke na-egosipụta njirimara ndị a. Olee otu O si eme ka anyị mata Ya Onwe Ya taa?

    Jesus Christ at age twelve in the temple at Jerusalem during the Feast of the Passover. A group of learned Jewish doctors are gathered around Christ. The doctors are expressing astonishment at the wisdom and understanding of the young Christ. (Luke 2:41-50)
Jizọs Kraịst bilitere n’ọnwụ

Nkọwa sitere na Niihi Ebumnuche Nke a, site n’aka Youngsung Kim

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:7; 61:1–2; 62:1

Onyenwe anyị ga-agbaghara m ọ bụrụ ma m chegharịa.

  • Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:7; 61:2 gị na ụmụ gị, nyere ha aka chọta mkpụrụ okwu ndị amaokwu ndị a nwekọtara ọnụ. Chetere ha na mkpughe ndị a ka enyere Josef Smith na ndị ndu Nzukọ nsọ ndị ọzọ. Gịnị ka Onyenwe anyị chọrọ ka ha mata? I nwekwara ike kwuo banyere otu Onye Nzọpụta si eche banyere anyị mgbe anyị mejọrọ na ihe ọ pụtara ichegharị. Dị ka ọ dị nime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 62:1, olee otu Jizọs ga-esi enye aka mgbe anwara anyị ọnwụnwa?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 62:3, 9

Jizọs Kraịst chọrọ ka m kesaa ozi ọma Ya.

  • I nwere ike jụọ ụmụ gị ihe ha ga-ekwu ọ bụrụ ma mmadụ jụọ ha ihe ha hụrụ naanya banyere Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ Ya. Ịgụkọta ọnụ otu egwu gbasara ikesa ozi ọma ozi ọma, ụdị dị ka “A Chọrọ m Ịbụ Onye mgbasa ozi ọma Ugbu a” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 168), nwere ike nye ha nchepụta. Emesịa i nwere gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 62:3 ma rịọ ụmụ gị ige ntị maka ihe ndị na-eme mgbe anyị kesara ama anyị. Olee otu nkwa niile dị niime amaokwu 9 si enye aka ọ bụrụ ma anyị nwee obi nkoropụ?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:64

Enwere m ike nye nkwanye ugwu.

  • Iji dubata Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:64, i nwere ike gụọ egwu banyere nkwanye ugwu gị na ụmụ gị, dị ka “Nkwanye ugwu Bụ Ịhụnaanya” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, no. 31). Emesịa i nwere ike kwuo banyere ụzọ dị iche iche iji gosi nkwanye ugwu nye Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist.

  • I nwere ike nyere ụmụ gị aka ghọta ihe nkwanye ugwu bụ site na-ikwu okwu gị na ha banyere otu ihe dị ha mkpa, dị ka otu ngwa egwuregwu, akwụkwọ, ma ọ bụ blanket kacha amasị ha. Jụọ ha otu ha si elekọta ma na-echekwa ihe niile pụrụ iche nye ha. Unu nweziri ike gụkọta ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:64. Kedụ ihe ndị dị mkpa—ma ọ bụ dị nsọ—nye Nna nke Eluigwe? (lee, n’ịmaatụ, amaokwu 61 na ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a). Olee otu anyị kwesịrị iji jikwaa ihe ndị a—jiri okwu na omume anyị niile?

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

ọgwụgwọ Elsa Johnson

Ọgwụgwọ ubu nke Elsa Johnson, site n’aka Sam Lawlor

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị