“December 15–21: ‘Ezi na ụlọ Bụ Isi nye Atụmatụ nke Onye Okike’: Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa a mara nye Ụwa,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa a mara nye Ụwa,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Dizemba 15–21: “Ezi na ụlọ Bụ Isi nye Atụmatụ nke Onye Okike”
Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa
Ọbụna tupu a mụọ anyị, anyị bụụrụ akụkụ nke otu ezi na ụlọ—ezi na ụlọ nke nne na nna anyị nke eluigwe. Usoro ahụ na-aganiihu n’elu ụwa. Ezi na ụlọ niile ebe a, n’ogo ha kachasị mma, ka e bu n’obi ime ka usoro zuru oke hie ụda n’eluigwe.
N’ezie, e nweghị nkwa ndị e kwere na ezi na ụlọ niile nke ụwa ga-abụ nke na-enweghị atụ ma ọ bụna na-arụzi ọrụ. Mana dị ka Onyeisi Henry B. Eyring kuziri, ezi na ụlọ niile “na-enye ụmụ Chineke ohere kachasị mma eji anabata ha n’ụwa jiri naanị ịhụnaanya n’elu ụwa nke na-adị nso n’ụdị mmetụta anyị nwere n’eluigwe—ịhụnaanya nke nne na nna” (“Ikpokọta Ezi na ụlọ nke Chineke,” Liahona, Me 2017, 20). Ịmara na ezi na ụlọ niile ezughị oke ma nọ n’okpuru mbuso agha sitere n’aka onye iro, Chineke zitere Ọkpara Ọ Hụrụ naanya ịgbapụta anyị ma gwọọ ezi na ụlọ anyị. Ma O zitere ndị amụma ụbọchị ikpeazụ a ya na ọkwa iji chekwaa ma gbaa ezi na ụlọ niile ume. Ọ bụrụ ma anyị soro ndị amụma ma tinye okwukwe anyị niime Onye Nzọpụta, ọbụladị na ezi na ụlọ anụ ahụ erughi ogo atụmanya sinachi, e nwere olileanya maka ezi na ụlọ niile—n’elu ụwa ma n’eluigwe.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
“Ezi na ụlọ Bụ Isi nye Atụmatụ nke Onye Okike.”
“Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa a mara nye Ụwa” doro anya na ọ bụ maka ezi na ụlọ niile. Mana ọ bụkwa maka atụmatụ nzọpụta nke Chineke. Otu ụzọ iji mụọ ọkwa ahụ bụ ide nkebiokwu niile ndụ tupu ndụ anụ ahụ, ndụ anụ ahụ, na ndụ mgbe ndụ anụ ahụ gasịrị na mpe mpe akwụkwọ ma depụta ihe ọkwa ahụ na-akuzi banyere nke ọbụla n’isiokwu ndị ahụ. Kedụ ihe ị na-amụta mgbe ị na-amụ ọkwa ahụ n’ụzọ dị otu a? Kedụ otu nke a si enyere gị aka ghọta ihe kpatara alụmdi na nwunye na ezi na ụlọ si dịrị mkpa nye atụmatụ nke Chineke? Kedụ otu eziokwu niile dị niime ọkwa ahụ si emetụta nhọrọ gị niile?
E nwere ọtụtụ mmadụ ndị, niihi ebumnuche dị iche iche, nwere ike tụọ egwu maka alụmdi na nwunye ma ọ bụ izulite ụmụntakịrị. Ọ bụrụ ma otu enyi agwa gị, “Achọghịkwa m ịlụ di na nwunye ma ọ bụ nwee ezi na ụlọ,” gịnị ka ị ga-ekwu? Elemaanya i nwere ike chọgharịa ọkwa ahụ na-achọ ihe nke ga-enyere enyi gị aka nwee olileanya niime atụmatụ nke Chineke.
Ajụjụ ọzọ e nwere ike ịjụ gị—ma ọ bụ nke i nwere ike ịjụ onwe gị—bụ otu dị ka nke a: “Ọbụrụkwanụ na ọnọdụ ezi na ụlọ m adabaghị n’ihe akọwara niime ọkwa a mara maka ezi na ụlọ?” Ndị a bụ ebe abụọ i nwere ike ịchọ ndụmọdụ onye amụma: nkeji nke “Mgbanwe Dị Ike” niime ozi nke Okenye Dieter F. Uchtdorf “Jizọs Kraịst Bụ Ike nke Ndị nne na nna” (Liahona, Me 2023, 55–59) ma nkeji edemede anọ ikpeazụ nke ozi nke Okenye D. Todd Christofferson “Ihe kpatara Alụmdi na nwunye, Ihe kpatara Ezi na ụlọ” (Liahona, Me 2015, 52).
Kedụ ihe na-akpate mmụọ gị ime niihi ihe nke ị mụworo?
Lee kwa Dallin H. Oaks, “Atụmatụ Ahụ na Ọkwa Ahụ,” Liahona, Nov. 2017, 28–31; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ezi na ụlọ,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.
“[Onye] ọbụla bụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị nke nne na nna nke eluigwe hụrụ naanya.”
Mgbe na mgbe anyị na-echekarị ọkwa a maara ezi na ụlọ dị ka ihe ntụzi aka maka ndụ ezi na ụlọ. Mana ọ nakwa akuzi eziokwu ndị dị mkpa banyere ezi na ụlọ nke eluigwe anyị na njirimara ebighị ebi anyị. Kedụ ihe kpatara o ji dịrị gị mkpa ịmata na anyị niile bụ akụkụ nke ezi na ụlọ nke a? Kedụ otu eziokwu nke a si emetụta nhọrọ niile ị na-eme?
Lee kwa “A bụ M Nwa Chineke,” Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 301.
“Obi ụtọ na ndụ ezi na ụlọ dị ka ihe a ga-akachsị enweta mgbe e wukwasịrị ya n’elu nkuzi niile nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”
Chee echiche banyere nkeji edemede nke 6 na 7 nke ọkwa a maara ezi na ụlọ dị ka usoro maka “obi ụtọ na ndụ ezi na ụlọ.” Dị ka ị na-agụ nkeji ahịrịokwu ndị a, mata ụkpụrụ niile nke “alụmdi na nwunye niile na ndị ezi na ụlọ na-eme nke ọma.” I nwere ike chee banyere ọmụmaatụ niile nke ụkpụrụ ndịa nke i hụworo niime ezi na ụlọ nke onwe gị ma ọ bụ ezi na ụlọ ndị ọzọ. Kedụ otu ụkpụrụ ndị a si enye aka mee Jizọs Kraịst ntọala nke ndụ ezi na ụlọ?
Emesịa i nwere ike chee maka mmekọrịta ezi na ụlọ i nwere ike ịchọ ịgba ume. Tụọ atụmatụ, site na enyemaka nke Onye Nzọpụta, iji tinye mmetụta niile ị natara n’ọrụ.
Lee kwa L. Whitney Clayton, “Ebe Obibi ndị Kachasị mma,” Liahona, Me 2020, 107–9.
“Anyị na-akpọku ndị ama ala maara ihe … ijikwa ma gbaa ezi na ụlọ ume.”
Nkeji edemede ikpeazụ nke ọkwa a maara ezi na ụlọ gụnyere oku ime ihe. Dị ka ị na-atule otu ị ga-esi aza oku ahụ, ọ nwere ike inye aka ịmụ aha nke ọkwa ahụ. N’ịmaatụ, gịnị bụ ọkwa a mara? Gịnị ka mkpụrụ okwu ahụ pụtara nye gị banyere ozi nke dọkumentị a? Kedụ ihe tozuru Otu Ndịisi Mbụ na Kansụl nke Ndị Ozi Iri na Abụọ oke ịma ọkwa nye ụwa banyere ezi na ụlọ niile? I nwekwara ike depụta ihe ndị ị weere bụ isi ozi niile nke ọkwa ahụ a mara. Kedụ otu ị ga-esi akwalite ozi ndị a niime ndụ gị, n’ebe obibi gị, na niime obodo gị?
Lee kwa Bonnie L. Oscarson, “Ndị Nchekwa nke Ọkwa a maara Ezi na ụlọ,” Liahona, Me 2015, 14–17; “Ndị Nchekwa nke Okwukwe” (vidiyo), Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ezi na ụlọ niile dị mkpa niime atụmatụ Nna nke Eluigwe.
-
Nyere ụmụ gị aka chee maka ihe ndị dị oke mkpa nke ha ga-achọ ịgwa onye niile maka ha. Gosi ụmụntakịrị otu kọpị nke “Ezị na ụlọ Ahụ: Ọkwa a mara nye Ụwa,” ma kọwaa na ndị amụma na ndị ozi dere ya ịgwa anyị niile otu ezi na ụlọ niile si dị mkpa nye Nna nke Eluigwe. Gịnị mere ezi na ụlọ niile si dị oke mkpa nye Ya? (lee kwa vidiyo “Gịnị Bụ Ebumnuche nke Ezi na ụlọ?” [ChurchofJesusChrist.org]).
-
Kesaara ụmụ gị ihe sitere na ọkwa a mara nke i chere anyị niile kwesịrị ịma. Kpọkuo ụmụntakịrị ikesa mmetụta ha nwere banyere eziokwu ndị ahụ. Kedụ otu ndụ anyị ga-esi adị iche ọ bụrụ ma anyị amaghị ihe ndị a? I nwere ike gụkọọ otu egwu ọnụ nke metụtara eziokwu ndị ahụrụ niime ọkwa a mara, dị ka “Aga M Esoro Atụmatụ nke Chineke” (Akwụkwọ abụ Ụmụntakịrị, 164–65).
-
Niime nkeji IV nke ozi ya “Atụmatụ Ahụ na Ọkwa ahụ” (Liahona, Nov. 2017, 30), Onyeisi Dallin H. Oaks kọwara otu esi wee dee ọkwa a maara ezi na ụlọ. Elemaanya gị na ụmụ gị nwere ike nyochakọta nkọwa ya ọnụ ma kwuo banyere ihe mere i ji nwee obi ekele na Onyenwe anyị kpatere mmụọ ụmụ odibo Ya ikuziri anyị eziokwu ndị a banyere ezi na ụlọ niile.
-
I nwekwara ike gosi ụmụ gị foto (ma ọ bụ kpọkuo ha ise ihe osise) ndị na-egosipụta eziokwu ndị a hụrụ niime ọkwa a maara ezi na ụlọ. Ndị a nwere ike bụrụ foto ndị nke tempụl, ezi na ụlọ na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-egwukọrịta egwuregwu ọnụ, ma ọ bụ di na nwunye na-alụ alụ. Emesịa ụmụ gị nwere ike chọta ahịrịokwu ndị dị niime ọkwa a maara ezi na ụlọ ndị metụtara foto ndị ahụ. Gịnị ka Onyenwe anyị na-akuziri anyị banyere ihe ndị a niime ọkwa ahụ a mara?
Abụ m “nwa nwoke mmụọ na nwaada mmụọ nke nne na nna nke eluigwe hụrụ naanya.”
-
Dị ka unu na-agụkọta “A bụ M Nwa Chineke” (Akwụkwọ abụ Ụmụntakịrị, 2-3), i nwere ike tụọ otu bọọlụ nye otu nwata dị ka i na-asị, “Ama m otu nwa Chineke a na-akpọ [aha nke nwa ahụ].” Mgbe ahụ nwa ahụ nwere ike tụọ ihe ahụ nye onye ọzọ, na-ekwu otu ụdị mkpụrụokwu ahụ ma na-etinye aha nke onye ahụ. Nyere ụmụ gị aka chọta nkebiokwu a “nwa nwoke mmụọ na nwaada mmụọ nke nne na nna nke eluigwe hụrụ naanya” niime ọkwa a maara ezi na ụlọ, ma gbaa ama gị banyere eziokwu nke a.
Ezi na ụlọ niile na-akachasị enwe obi ụtọ mgbe ha na-agbasoro Jizọs Kraist.
-
Ịmalite mkparịta ụka banyere ịgba ezi na ụlọ gị ume, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo okwu banyere ihe anyị na-eme iji mee ihe ndị ọzọ esie ike—dị ka eze anyị, ahụ anyị, ma ọ bụ ụlọ ewuru ewu. I nweziri ike were nke ahụ tụnyere iwu ezi na ụlọ siri ike. Nyere ụmụ gị aka chọta ụkpụrụ ndị yiri Kraịst na-eduba na obi ụtọ na ndụ ezi na ụlọ, achọtara niime nkeji edemede 7 nke ọkwa a maara ezi na ụlọ (lee kwa ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a).