Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
0. Nchịkọta mmalite


“0. Nchịkọta mmalite,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“0. Nchịkọta Mmalite,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

0.

Nchịkọta mmalite

0.0

Ndubata

Onyenwe anyị kuziri, “Ka onye ọbụla mụọ ọrụ ya, ma rụọ ọrụ n’ọkwa ọrụ ebe a kpọrọ ya, n’irụsi ọrụ niile ike” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:99). Dị ka onye ndu na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, i kwesịrị ịchọ mkpughe nke onwe iji nyere gị aka mụọ ma mejupụta ọrụ niile nke ọkpụkpọ okù gị.

Ị na-amụ akwụkwọ nsọ na nkuzi niile nke ndị amụma ụbọchi ikpeazụ a ga-enyere gị aka ghọta ma mejupụta ọrụ gị niile. Dị ka ị na-amụ okwu niile nke Chineke, ị ga-aka adị njikere ịnabata mmetụta nke Mmụọ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:85).

Ị nakwa amụ ọrụ gị niile site n’ịmụ nkuzi niile dị niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a. Nkuzi ndị a pụrụ idubata mkpughe ọ bụrụ ma ejiri ha iji wete nghọta nke ụkpụrụ niile, atụmatụ niile, na usoro niile a ga-etinye mgbe a na-achọ nduzi nke Mmụọ.

0.1

Akwụkwọ Ntuziaka ahụ

Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu a na-ewete nduzi maka ndị ndu izugbe nke Nzukọ nsọ na nke obodo.

Isiokwu niile na isiokwu nta niile dị n’Akwụkwọ Ntuziaka nke a ka enyere nọmba iji mee isiokwu niile adị mfe nchọta na nrụtụaka. Iji maatụ, nkuzi banyere onye enwere ike ịrachi niime tempụl ka enyere na 27.3.1. Nọmba27 na-arụtụ aka n’isiakwụkwọ ahụ, nọmba nke 3 rụtụrụ aka n’otu nkeji dị n’isiakwụkwọ ahụ, ma nọmba nke 1 rụtụrụ aka n’otu nkeji nta.

0.2

Mmegharị na Akụrụngwa Nhọrọ niile

Ọ bụghị stek niile na ngalaba ukwu niile nwere otu ụdị mkpa.

Ndị ndu na-achọ mkpakemmụọ banyere ntuziaka niile na akụrụngwa nhọrọ niile iji wee zute mkpa nke ndị otù.

0.4

Ajụjụ niile banyere Nkuzi niile

Mgbe ajụjụ dị iche iche dapụtara nke a na-emezighị niime akwụkwọ nsọ, n’okwu niile nke ndị amụma dị ndụ, ma ọ bụ n’Akwụkwọ Ntuziaka nke a, ndị otù Nzukọ nsọ kwesịrị ịdabere n’ọgbụgba ndụ ha na Chineke, ndụmọdụ nke ndị ndu ha dị na obodo, na mkpatemmụọ nke Mmụọ maka nduzi.

Ọ bụrụ ma ndị ndu nwee ajụjụ banyere ozi dị niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a ma ọ bụ banyere okwu ndị ọ na-elebaraghị anya, ha na-adụ ndụmọdụ ha na onye nduzi ha ji ikike.

0.5

Nkọwapụta mkpụrụokwu

Ewezuga ebe egosiri na ọ bụghị ya:

  • Okwu ndị a bishọp na otu bishọp dị niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a rụtụkwara aka na ndịisi ngalaba nta na otu ndịisi ngalaba nta. Okwu ndị a onyeisi stek na otu ndịisi stek rụtụkwara aka na ndịisi distrikt na otu ndịisi distrikt. Maka nchịkọta otu ikike nke ndịisi distrikt sị dị iche site na nke ndịisi stek, lee 6.3.

  • Nrụtụaka niile nye ngalaba ukwu na stek niile metụtakwara ngalaba nta niile, distrikt niile, na mishọn niile n’ụzọ niile.

  • Nrụtụaka niile enyere Sọnde metụtara ụbọchị ọbụla edoro ka Ụbọchị izu ike n’obodo.

  • Okwu ahụ ngalaba na-arụtụaka na ngalaba ukwu na ngalaba nta niile.

  • Nrụtụaka niile nye ndị nne na nna n’ụzọ niile metụtakwara ndị nlekọta iwu kwadoro.

Ọkpụkpọ okù nke bishọp na onyeisi ngalaba nta ahaghị n’ikike na n’ọrụ, ma ọ bụ na ọkpụkpọ okù niile nke onyeisi stek na onyeisi distrikt. Bishọp bụ ọkwa ọrụ dị niime ọkwa nchụaja, ma a na-enye ikike echichi naanị site n’aka Otu Ndịisi Mbụ. Ndịisi stek ka a na-akpọ site n’aka Ndị Ji Ikike Zuruọha na Ndị Iri Asaa Mpaghara.

0.6

Ịkpọtụrụ Isi Ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ ma ọ bụ Ụlọ ọrụ Mpaghara

Ụfọdụ isiakwụkwọ dị niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a gụnyere nkuzi niile iji kpọtụrụ isi ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ ma ọ bụ ụlọ ọrụ Mpaghara. Nkuzi iji kpọtụrụ isi ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ metụtara ndị ahụ nọ na United States na Canada. Nkuzi iji kpọtụrụ ụlọ ọrụ mpaghara metụtara ndị ahụ na-anọghị na United States na Canada.

Bipụta