“2. Ịkwado Ndị mmadụ na ndị Ezi na ụlọ N’ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).
“2. Ịkwado Ndị mmadụ na ndị Ezi na ụlọ,” Nhọrọ ndị sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe
2.
Ịkwado Ndị mmadụ na ndị Ezi na Ụlọ n’ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu
2.0
Ndubata
Dị ka onye ndu niime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst, ị na-akwado ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ na-imetazu ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu nke Chineke (lee 1.2). Ebumnoobi kachasị elu banyere ọrụ nke a bụ inyere ụmụ Chineke niile aka nata ngọzi niile nke ndụ ebighị ebi na ọńụ n’uju.
Ọtụtụ ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu ka a na-emetazu site na ezi na ụlọ. Maka ndị otù Nzukọ nsọ niile, ọrụ nke a dabeere n’ebe obibi.
2.1
Ọrụ nke Ezi na ụlọ nwere ịrụ niime Atụmatụ nke Chineke
Dị ka akụkụ atụmatụ Ya, Nna nke Eluigwe ehiwewo ezi na ụlọ niile n’elu ụwa. O bu n’obi maka ezi na ụlọ niile iwetere anyị ọńụ. Ezi na ụlọ niile na-ewete ohere iji mụọ ihe, too etoo, jee ozi, chegharịa, ma gbaghara. Ha nwere ike inyere anyị aka kwadoo maka ndụ ebighị ebi.
Nkwa ndụ ebighị ebi nke Chineke gụnyere alụmdi na nwunye ebighị ebi, ụmụ, na ngọzi ndị ọzọ maka ezi na ụlọ ebighị ebi. Nkwa nke a metụtara ndị ahụ na-alụbeghi ọlụlụ ugbua ma ọ bụ ndị na-enweghị ezi na ụlọ niime Nzukọ nsọ.
2.1.1
Ezi na ụlọ Mgbe Ebighị ebi
Ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi ka a na-emepụta mgbe ndị otù Nzukọ nsọ na-eme ọgbụgba ndụ niile dị ka ha na-anata emume nsọ nrachi niile niime tempụl. Ngọzi niile nke ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi ka a na-enwete dị ka ndị otù na-edebe ọgbụgba ndụ ndị ahụ ma chegharịa mgbe ha jehiere. Ndị ndu Nzukọ nsọ na-enyere ndị otu aka kwadoo ịnata emume nsọ ndị a ma sọpụrụ ọgbụgba ndụ ha.
Ihe ọzọ agbakwunyere banyere ihiwe ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi niile bụ ime emume nsọ niile niime tempụl nke na-ekwe ka arachie ndị otù nye ndị nna nna ha ha nwụrụ anwụ.
2.1.2
Di na Nwunye
Alụm di na nwunye n’etiti otu nwoke na otu nwanyị ka Chineke kwadoro (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:15). Di na nwunye ka achọrọ ka ha gakọta ọnụ niihu ruo ndụ ebighị ebi (lee 1 Ndị Kọrịnt 11:11).
Otu niime ihe ndị achọrọ maka inwete ndụ ebighị ebi bụ ka otu nwoke na otu nwanyị banye na ọgbụgba ndụ nke alụmdi na nwunye seleshial (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 131:1-4). Otu di na nwunye na-eme ọgbụgba ndụ nke a mgbe ha natara emume nsọ nrachi alụmdi na nwunye niime tempụl. Ọgbụgba ndụ nke a bụ ntọala nke ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi. Dị ka e debere ya na nkwesị ntụkwasị obi, ọ na-ekwe ka alụmdi na nwunye ha nagide ruo mgbe ebighị ebi.
Mmekọrịta chiri anya nke anụ ahụ dị n’etiti di na nwunye kwesịrị ịma mma ma dị nsọ. Chineke kwadoro ya maka okike nke ụmụ na maka ngosipụta nke ịhụnaanya dị n’etiti di na nwunye. Ịdị nrọ na nkwanye ugwu—na-abụghị ịchọ ọdịmma onwe onye naanị—kwesịrị idu mmekọrịta chiri anya ha.
Chineke enyewo iwu na mmekọrịta mmekọahụ chiri anya ka e kwesịrị ichekwa maka alụmdi na nwunye n’etiti otu nwoke na otu nwanyị.
Di na Nwunye hà nhata nha n’anya Chineke. Otu ekwesịghị ịchị ibe ya. Mkpebi ha ka ekwesịrị ime n’ịdị n’otu na n’ịhụnaanya, na nsonye ha abụọ n’uju.
2.1.3
Ndị Nne na nna na Ụmụntakịrị
Ndị amụma ụbọchi ikpeazụ a akuziwo na iwu nsọ nke Chineke maka ụmụ Ya ịmụba ma mejupụta ụwa ka nọgidere n’ike” (“Ezi na ụlọ: Ọkwa a mara nye Ụwa”; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:16-17).
Di na Nwunye dị ihunanya site na njikọta aka ha n’arọpụta ọnọdụ kachasị mma maka ọzụzụ na nzulite ụmụaka. Ọnọdụ niile nke mmadụ nwere ike gbochie ndị nne na nna site na-ịzụkọta ụmụ ha ọnụ. Kosiladị, Onyenwe anyị ga-agọzi ha dị ka ha na-achọ enyemaka Ya ma na-agbalị idebe ọgbụgba ndụ ha na Ya.
Ndị nne na nna nwere ọrụ dị mkpa iji nyere ụmụ ha aka kwadoo ịnata ngọzi niile nke ndụ ebighị ebi. Ha na-akuziri ụmụ ha inwe ịhụnaanya ma jeere Chineke na ndị ọzọ ozi (lee Matiu 22:36–40).
“Ndị nna ga-abụ onyeisi nye ndị ezi na ụlọ ha n’ịhụnaanya na ezi omume ma ọ dịịrị ha inweta ihe niile dị mkpa na ndụ na nchekwa maka ndị ezi na ụlọ ha” (“Ezi na ụlọ: Ọkwa a mara nye Ụwa”). Mgbe a na-enweghị di ma ọ bụ nna n’ebe obibi, nne na-abụ onyeisi nye ezi na ụlọ ahụ.
Ị bụ onyeisi niime ezi na ụlọ bụ ọrụ iji nye aka duru ndị otù ezi na ụlọ laghachi ibi n’ihu Chineke. Nke a ka a na-eme site n’ije ozi na ikuzi ihe n’obi ọma, n’ịdị nwayọọ, na n’ịhụnaanya na-enweghị ntụpọ, na-eso ọmụmaatụ nke Jizọs Kraịst (lee Matiu 20:26–28). Ịbụ onyeisi niime ezi na ụlọ gụnyere idu ndị otù ezi na ụlọ n’ekpere mgbe niile, ọmụmụ ihe nke ozi ọma, na akụkụ nke ife ofufe ndị ọzọ. Ndị nne na nna na-arụ ọrụ n’ịdị n’otu iji mejupụta oke na ọrụ ndị a.
“Ndị nne nwere ọrụ mbụ dịịrị ha maka ọzụzụ nke ụmụ ha” (“Ezi na ụlọ: Ọkwa a mara nye Ụwa”). Inye ọzụzụ pụtara inye nri, ikuzi ihe, na inye nkwado, n’eso ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta (lee 3 Nefi 10:4). N’ịdị n’otu ya na di ya, onye nne na-enyere ezi na ụlọ ya aka mụọ eziokwu niile nke ozi ọma ma wulite okwukwe niime Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. N’ịdị n’otu ha na-akwalite ebe obibi nke ịhụnaanya dị niime ezi na ụlọ.
“niime ọrụ ndị a dị nsọ, ndị nna na ndị nne ka ọ dịịrị inyeritara otu onye na ibe ya aka dị ka ndị mmekọta ihe dị nhata nha. (“Ezi na ụlọ: Ọkwa a mara nye Ụwa”). N’oke ekpere ha na-adụkọrịtara ndụmọdụ ọnụ ha na Onyenwe anyị. Ha na-emekọta mkpebi niile ọnụ n’ịdị n’otu na n’ịhụnaanya, na nsonye ha abụọ n’uju.
2.2
Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu n’Ebe obibi
Otu Ndịisi Mbụ kwuru sị, “Ebe obibi bụ isi nke ndụ ezi omume” (leta Otu Ndịisi Mbụ, Feb. 11, 1999).
Ịkwado ndị otù n’ịrụ ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu n’ebe obibi, ndị ndu Nzukọ nsọ na-agba ha ume ihiwe ebe obibi ebe Mmụọ ga-anọ na ya. Ha nakwa agba ndị otù ume ịkwanyere ụbọchi Izuike ugwu, mụọ ma mụta ozi ọma n’ebe obibi, ma na-eme nnọkọ mgbede n’ebe obibi kwa izu.
2.2.3
Ọmụmụ ihe nke Ozi ọma na Ịmụ ihe n’Ebe obibi
Nkuzi na Ọmụmụ ihe nke ozi ọma bụ nke dabeere n’ebe obibi ma Nzukọ nsọ akwadoo. Ndị ndu Nzukọ nsọ na-agba ndị otù niile ume ịmụ ozi ọma n’ebe obibi n’ụbọchị Izuike na niime izu ụka niile.
Ọmụmụ ihe nke akwụkwọ nsọ dị ka edepụtara niime Bịanụ, Soro M—Maka Ndị mmadụ na ndị Ezi na ụlọ bụ ihe ọmụmụ nke ozi ọma atụpụtara n’ebe obibi.
2.2.4
Nnọkọ mgbede N’ebe obibi na Ihe Omume Ndị Ọzọ
Ndị amụma Ụbọchị ikpeazụ a enyewo ndị otù Nzukọ nsọ ndụmọdụ ịdị na-eme nnọkọ mgbede n’ebe obibi. Nke a bụ oge dị nsọ nye ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ iji mụọ ozi ọma, gbaa ọgbụgba ama niile ume, wulite ịdị n’otu, ma nwee obi ụtọ otu onye n’ibe ya.
Nnọkọ mgbede n’ebe obibi na-agbanwe agbanwe dị ka ọnọdụ niile nke ndị otù ahụ siri dị. E nwere ike ime ya n’ụbọchi Izuike ma ọ bụ ụbọchi na oge ndị ọzọ. O nwere ike ịgụnye:
-
Ọmụmụ ihe na nkuzi nke Ozi ọma ( akụrụngwa niile nke Bịanụ, Soro M ka enwere ike iji mee ihe dị ka achọrọ).
-
Ijere ndị ọzọ ozi.
-
Ịbụ abụ ma ọ bụ ịkpọ abụ na ukwe ndị Praịmarị (lee isi nke 9).
-
Ịkwado ndị otù ezi na ụlọ na Nzulite Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa.
-
Kansụl nke ezi na ụlọ maka iji tụpụta Ebumnoobi, dozie nsogbu niile, ma hazie oge niile.
-
Ihe omume egwuregwu niile.
Ndị otù na-anọghị n’ọlụlụ na ndị ọzọ nwere ike gbakọta n’igwe n’igwe na-abụghị nzukọ ofufe ndị adị mbụ eme iji sonye mee ihe na nnọkọ mgbede n’ebe obibi ma gbaa otu onye n’ibe ya ume site n’ihe ọmụmụ nke ozi ọma.
2.2.5
Ịkwado Ndị mmadụ
Ndị ndu Nzukọ nsọ na-enyere ndị otù aka ndị na-enweghị nkwado ezi na ụlọ.
Ndị ndu na-enyere ndị otù ndị a na ndị ezi na ụlọ ha aka inwe ohere dị iche iche maka ife ofufe, nhụmiihe ọha niile dị mma, na uto nke ime mmụọ.
2.3
Mmekọrịta dị n’etiti Ebe obibi na Nzukọ nsọ
Ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu dabeere n’ebe obibi ma Nzukọ nsọ akwadoo ya. Ụkpụrụ ndị a sotere ka a na-ahụ niime mmekọrịta dị n’etiti ebe obibi na Nzukọ nsọ.
-
Ndị ndu na ndị nkuzi na-asọpụrụ ọrụ nke ndị nne na nna na-arụ ma na-enyere ha aka.
-
Ụfọdụ ọgbakọ nke Nzukọ nsọ dị mkpa na ngalaba ukwu ma ọ bụ ngalaba nta ọbụla. Ndị a gụnyere nzukọ oriri nsọ na klas niile na nzukọ niile nke kworum a na-eme na ụbọchi Izuike. Ọtụtụ nzukọ ndị ọzọ, ihe omume niile, na mmemme niile adịghị mkpa.
-
Ije ozi nke Nzukọ nsọ na nsonye niime ihe gụnyere ịchụ nwa obere aja. Onyenwe anyị ga-agọzi ndị otù dị ka ha n’eje ozi ma na-achụ aja niime Nzukọ nsọ Ya. Kosiladị, oge ole etinyere niime ije ozi nke Nzukọ nsọ ekwesịghị ibelata ike nke ndị otù nwere iji mejupụta oke na ọrụ ha niile n’ebe obibi, n’ụlọ ọrụ, ma n’ebe ọbụla ọzọ.