Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
1. Atụmatụ nke Chineke na Ọrụ I nwere niime Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu


“1. Atụmatụ nke Chineke na Ọrụ I nwere niime Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“1. Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndịikom na-arụ ụlọ

1.

Atụmatụ nke Chineke na Ọrụ I nwere niime Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu

1.0

Ndubata

Akpọwo gị okù ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi Ikpeazu a. I meela maka ije ozi gị. Ị ga-agọzi ndị mmadụ ma nwete nhụmiihe ọńụ dị ka ị na-eje ozi n’okwukwe.

Akwụkwọ Ntuziaka nke a ga-enyere gị aka mụọ ụkpụrụ niile nke ije ozi n’ụdị nke Kraịst ma ghọta oke n’ọrụ gị niile. Ị ga-akachasị arụ ọrụ mgbe itinyekọtara ije ozi gị niime Nzukọ nsọ ya na ọrụ nke Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst.

1.1

Atụmatụ Obi ụtọ nke Chineke

Nna nke Eluigwe wetere atụmatụ nke obi ụtọ iji nye anyị ike inwe ańụrị na ngọzi Ya niile. Ọrụ na otuto Ya bụ “iwete na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ” (Moses 1:39).

Jizọs Kraịst bụ isi ntọala nye atụmatụ nke Chineke. N’ihi ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe na-enweghị atụ maka anyị, O zitere Ọkpara Ya ịgbapụta anyị na mmehie na ọnwụ site na aja mgbaghara mmehie Ya (lee Jọn 3:16). Site n’Aja mgbaghara mmehie Ya, Jizọs Kraịst na-ahụ na onye ọbụla niime anyị a mụrụ n’ụwa ga-esi n’ọnwụ bilite ma rite anwụghị anwụ. Aja mgbaghara mmehie ya mekwara ya ekwe omume ka a sachaa anyị site na mmehie ma nwee mgbanwe n’obi anyị ka anyị wee nwee ike nata ndụ ebighị ebi na uju nke ọńụ.

Na-ịnata ndụ ebighị ebi, anyị garịrị a “bịakwute Kraịst, ma zuo oke niime ya” (Moronaị 10:32).

1.2

Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu

Dị ka anyị na-abịakwute Kraịst ma nyere ndị ọzọ aka ime otu ahụ kwa, anyị na-esonye n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu nke Chineke. Ọrụ nke a ka nnukwu iwu nsọ abụọ nke ịhụ Chineke naanya na ịhụ ndị agbata obi anyị naanya na-edu (lee Matiu 22:37-39).

Ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu na-elekwasị anya na ọrụ anọ ndị e si na chi họpụta.

Akwụkwọ Ntuziaka nke a ga-enyere gị aka ghọta akụkụ anọ nke ọrụ nke Chineke ndị a. Mmụọ Nsọ ga-edu gị dị ka ị na-emezu oke nke gị niimejupụta ha (lee 2 Nefi 32:5).

1.2.1

Ibi ndụ Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

Ibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst gụnyere:

  • Inwe okwukwe niime Kraịst, ichegharị kwa ụbọchi, igba ndụ gị na Chineke dị ka anyị na-anata emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu, na ịnagide ruo ọgwụgwụ site n’idebe ọgbụgba ndụ ndị ahụ niile (lee 3.5.1).

  • Ịmụ ihe na ikuzi ozi ọma nke Jizọs Kraịst n’ebe obibi na na nzukọ nsọ.

  • Inwe ndabere onwe n’ịkpatara onwe anyị na ndị ezi na ụlọ anyị ihe, ma nke ime mmụọ ma nke anụ ahụ.

1.2.2

Ilekọta Ndị ahụ nọ na Mkpa

Ilekọta ndị ahụ nọ na mkpa gụnyere:

  • Ije ozi na ije ozi nlekọta nye ndị mmadụ, ndị ezi na ụlọ, na ndị obodo.

  • Ikesa akụrụngwa niile, tinyekwara enyemaka nke Nzukọ nsọ, ruo n’aka ndị ahụ nọ na mkpa.

  • Inyere ndị ọzọ aka nwee ndabere onwe.

1.2.3

Ịkpọku Ndị niile Ịnata Ozi ọma

Ịkpọku ndị niile ịnata ozi ọma gụnyere:

  • Isonye n’ọrụ mgbasa ozi ọma na ije ozi dị ka ndị mgbasa ozi ọma.

  • Inyere ndị otù Nzukọ nsọ dị ọhụrụ na ndị na-alọghachi aka gaaniihu n’ụzọ ọgbụgba ndụ.

1.2.4

Ijikọta ndị Ezi na ụlọ maka Ebighị ebi.

Ijikọta ndị ezi na ụlọ maka ebighị ebi gụnyere:

  • Ime ọgbụgba ndụ dị ka anyị na-anata emume nsọ tempụl niile nke onwe anyị.

  • Ịchọpụta ndị nna nna anyị ha nwụrụ anwụ na imere ha emume nsọ niile na tempụl ka ha nwee ike mee ọgbụgba ndụ ha na Chineke.

  • Ịga tempụl ugboro ugboro, ebe o kwere omume, maka ife Chineke ofufe ma mee emume nsọ niile maka ụmụ Ya.

1.3

Ebumnuuche nke Nzukọ nsọ

Jizọs Kraịst hiwere Nzukọ nsọ Ya iji nye ndị mmadụ na ezi na ụlọ niile ike ịrụ ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu (lee Ndị Efesọs 4:11-13; leekwa 2.2 dị niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a). Iji nye aka mezuo Ebumnuuche nke a si na chi, Nzukọ nsọ na ndị ndu ya na-ewete:

  • Ọtụghe niile na ikike Ọkwa nchụaja.

  • Ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ niile.

  • Nduzi site n’Amụma.

  • Akwụkwọ nsọ niile.

  • Ọmụmụ ihe nke ozi ọma na nkwado inye nkuzi.

  • Ohere niile nke ije ozi na odudu.

  • Obodo nke Ndị nsọ.

1.3.1

Ọtụghe niile na Ikike Ọkwa nchụaja

Site na ọkwa nchụaja, Chineke na emezu ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu. Ikike na ọtụghe niile nke Ọkwa nchụaja dị mkpa iji duzie ọrụ Chineke n’ụwa ka eweghachitere nye Onye amụma Josef Smith (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:11-16; 112:30). Ọtụghe ndị a ka ndị ndu Nzukọ nsọ taa ji. Ha na-akpọ ma nye ndị ọzọ ikike iji nye aka n’ọrụ Chineke (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:8, 65-67).

1.3.2

Ọgbụgba ndụ niile na Emume nsọ niile

N’atụmatụ Nna nke Eluigwe, anyị na-eme ọgbụgba ndụ dị ka anyị na-anata emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu, nke dị ka baptizim (lee Jọn 3:5; lee kwa isi nke 18 niime akwụkwọ ntụzi aka nke a). Ọgbụgba ndụ na emume nsọ ndị a dị oke mkpa maka anyị ịdịkarị ka Chineke ma laghachi ibi n’ihu Ya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:19–22).

1.3.3

Ntuzi aka site n’Amụma

Site na ndị amụma Ọ họọrọ, Chineke na-ekpughe eziokwu ma wete nduzi na ịdọ aka na ntị sitere na mkpatemmụọ (lee Emọs 3:7; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:4). Nduzi nke a na-enyere anyị aka banye ma nọgide n’ụzọ ahụ n’eduba na ndụ ebighị ebi.

1.3.4

Akwụkwọ nsọ niile

N’okpuru ntuziaka nke ndị amụma na ndị ozi nke Onyenwe anyị, Nzukọ nsọ na-ewete ma na-echekwa okwu Chineke dị ka ọ dị niime akwụkwọ nsọ dị nsọ. Akwụkwọ nsọ na-agba ama banyere Kraịst, na-akuzi ozi ọma Ya, ma na-enyere anyị aka nwee okwukwe na Ya (lee Jekọb 7:10-11; Hilaman 15:7).

1.3.5

Ọmụmụ ihe nke Ozi ọma na Nkwado maka Nkuzi

Nzukọ nsọ na-akwado ndị mmadụ na ezi na ụlọ niile n’oke na ọrụ ha ịmụ eziokwu niile nke ozi ọma ma kuziere ndị otù ezi na ụlọ na ndị ọzọ eziokwu ndị a (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ 88:77-78, 118; lee kwa 2.2.3 niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a).

1.3.6

Ohere niile nke Ije ozi na Odudu

Site na ọkpụkpọ okù niile na ọrụ niile enyere niime Nzukọ nsọ, Chineke na-enye ndị otù ohere ije ozi ma duo. Nzukọ nsọ na-ewete ndokọ iji nyee aka lekọta ndị otù nọ na mkpa na inye enyemaka nke mmadụ nye ndị ọzọ (lee Mozaya 18:27-29).

1.3.7

Obodo nke Ndị nsọ

Dị ka obodo nke Ndị nsọ, ndị otù Nzukọ nsọ na-agbakọta ugboro ugboro ife Chineke ofufe na ichete Onye Nzọpụta site n’iri oriri nsọ (lee Moronaị 6:4-6; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77). Ndị otù nakwa elekọta ma na-eje ozi nlekọta nye otu onye n’ibe ya (lee Ndị Efesọs 2:19).

1.4

Ọrụ I nwere niime Ọrụ nke Chineke

Dị ka onye ndu niime Nzukọ nsọ, a kpọrọ gị ikuzi ihe ma kwadoo ndị ahụ i na-ejere ozi dị ka ha n’etinye aka n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu (lee 1.2). Ọ dị gị n’aka imejupụta ọkpụkpọ okù gị ma “kuzie … okwu Chineke site na ịrụsi ọrụ ike” (Jekọb 1:19). Isoro Onyenwe anyị rụọ ọrụ niime ubi vaịn Ya ga-ewetere gị nnukwu ọńụ (lee Jekọb 5:70-72).

Inwe nghọta doro anya banyere ọrụ Chineke, banyere ihe Ọ na-akpọku gị ime, na banyere ebumnuuche Nzukọ nsọ Ya ga-enyere gị aka lekwasị anya na mbọ gị niile n’ịkpọta ọtụtụ mkpụrụ obi nye Kraịst.

Rụọaka ọtụtụ mgbe na ụkpụrụ niile dị niime isiakwụkwọ nke a. Jiri ekpere chọọ ịmata otu i nwere ike isi nye aka wete na mmezu ebumnuuche niile nke Chineke niime ndụ nke ndị ahụ i na-ejere ozi. Chineke ga-atụziri gị aka site na mkpali niile nke Mmụọ Nsọ.

Bipụta