Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
Odudu Izugbe na nke Mpaghara


“5. Odudu Izugbe na nke Mpaghara,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“5. Odudu Izugbe na nke Mpaghara,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
Otu Ndịisi Mbụ

5.

Odudu Izugbe na nke Mpaghara

5.0

Ime ka a mata

Jizọs Kraịst bụ “onyeisi nkụkụ ụlọ” nke Nzukọ nsọ Ya (Ndị Efesọs 2:20). O ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja. Ọ na-akpọ ndị ozi na ndị amụma inyere Ya aka n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu. Ọ na-enyefe n’isi ụmụ odibo ndị a ọtụghe niile nke gbasara alaeze Chineke n’elu ụwa ugbua. (Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:12-13; leekwa 3.4.1 niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a.)

Site na ndị amụma na ndị ozi, Onyenwe anyị na-akpọ ndị nwoke n’ọkwa ọrụ nke Ndị Iri Asaa iji nye aka n’ọrụ Ya niime ụwa niile (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:38). Na mgbakwunye, Otù Bishọp Nduzi, Ndị ọrụ Zuruọha, na ndị ndu ndịikom na ndịinyom ndị ọzọ ka enyere ọrụ ndị dị mkpa iji nye aka n’ọrụ ahụ.

Maka ozi ndị ọzọ, lee isi nke 5 niime Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu a (ChurchofJesusChrist.org).

Bipụta