Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
6. Odudu nke Stek


“6. Odudu nke Stek,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“6. Odudu nke Stek,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
onye ndu na-agwa ezi na ụlọ okwu

6.

Odudu nke Stek

6.1

Ebumnoobi niile nke Stek

Aịzaya kọwara Zayọn ụbọchi ikpeazụ dị ka ụlọ ngwọ ma ọ bụ ụlọikwuu eji stek niile chekwaa (lee Aịzaya 33:20; 54:2).

Onyenwe anyị na-ehiwe stek niile maka “mkpokọta ọnụ” nke ndị Ya na “maka nchekwa, na … ebe mgbaba” site n’ụwa (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115:6).

6.2

Otù Ndịisi Stek

Onyeisi stek ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja iji duo ọrụ nke Nzukọ nsọ niime stek ahụ (lee 3.4.1). Ya na ndị ndụmọdụ ya mejupụtara otù ndịisi stek. Ha na-elekọta ndị otù stek n’ịhụnaanya, na-enyere ha aka ịghọ ezi ndị na-eso Jizọs Kraịst.

Onyeisi stek nwere ụzọ ọkpụrụkpụ ọrụ anọ:

  1. Ọ bụ onyeisi nchụaja nduzi na stek ahụ.

  2. Ọ na-edu ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu na stek.

  3. Ọ bụ ọka ikpe nke ọha.

  4. Ọ na-ahụ gbasara ndekọihe niile, ego, na arịa niile.

6.3

Ndịiche niile dị n’etiti Ikike nke Ndịisi Distrikt na Nke Ndịisi Stek

niime district nke ọbụla, onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek ka a na-akpọ dị ka onyeisi distrikt Ọ na-eje ozi ruo dị ka onyeisi stek kama jiri ndiiche ndị a sotere:

  • Ọ bụghị onyeisi kworum ndịisi nchụaja dị elu. Ụdị kworum ndị a ka a na-ahazi naanị niime stek niile.

  • Site na nkwado nke onyeisi mishọn, onyeisi distrikt nwere ike gbaa otu nwanne nwoke a ga-echi okenye ajụjụ ọnụ. Onyeisi distrikt ma ọ bụ onye nọ n’okpuru ntuziaka ya nwekwara ike (1) kpọta nwanne nwoke maka ntuli aka nkwado na (2) chie echichi ahụ (lee 18.10.1.3, 18.10.3, na 18.10.4). Kosiladị, onyeisi distrikt enweghị ike ichi ndị petrak, ndịisi nchụaja, ma ọ bụ ndị bishọp echichi,

  • Site na nkwado nke onyeisi mishọn, onyeisi distrikt nwere ike dopu iche ndịisi ngalaba nta (lee 18.11).

  • Ọ naghị atọghapụ ndị mgbasa ozi ọma uju oge.

  • Ọ naghị agba ajụjụ ọnụ rekọmend tempụl ma ọ bụ bịanye aka na rekọmend tempụl (lee 26.3.1).

  • Ọ naghị akpọ kansụl ịbụ onye otù ma ọ bụghị ma onyeisi mishọn nyere ya ikikere.

6.5

Kansụl Dị elu

Otù ndịisi stek na-akpọ ndịisi nchụaja 12 iji hiwe kansụl dị elu nke stek (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 102:1; 124:131).

6.5.1

Nọchite anya Otù Ndịisi stek

Otù ndịisi stek na-ekenye otu onye kansụl dị elu na ngalaba ukwu ọbụla dị niime stek.

Otù ndịisi stek nakwa ekenye otu onye kansụl dị elu na kworum ndị okenye ọbụla dị niime stek.

Otù ndịisi stek nwere ike kenye ndị kansụl dị elu ikuziri ndị a sotere ihe niime oke na ọrụ ha maka ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ nakwa ọrụ mgbasa ozi ọma:

  • Ndịisi kworum ndị okenye

  • Ndị ndu mishọn na ngalaba ukwu

  • Ndị ndu tempụl na agụgụala ezi na ụlọ na ngalaba ukwu

6.7

Òtù ndị nke Stek

Otù Enyemaka stek, Ndịinyom Nta, Praịmarị, Ụlọakwụkwọ Sọnde, na òtù Ndịikom Nta niile ka onyeisi na-eduzi n’otu n’otu. Ndịisi ndị a n’eje ozi n’okpuru ntuziaka nke onyeisi stek.

Isi oke na ọrụ nke ndị ndu ndị a bụ inyere otù ndịisi stek aka na inye ntuziaka ma kwadoo òtù ndịisi na ngalaba ukwu.

6.7.1

Ndịisi Otù Eyemaka, Ndịinyom Nta, Praịmarị, na Ụlọ akwụkwọ Sọnde nke stek

Ndị otù nke otù ndịisi ndị a nwere oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Jee ozi na kansụl stek (naanị ndịisi)

  • Kuziere ndịisi òtù nke ngalaba ukwu a kpọrọ ọhụrụ ihe.

  • Nye nkwado na nkuzi n’aganiihu. Gwa ndịisi òtù dị na ngalaba ukwu okwu mgbe niile iji mata maka mkpa ha niile, kpaanụ nkata maka mkpa nke ndị otù ha na-ejere ozi, ma zie ha ozi sitere n’aka otù Ndịisi stek

  • Kuziere òtù ndịisi ngalaba ukwu ihe n’oge nzukọ ndị ndu nke stek (lee 29.3.4).

6.7.2

Otù Ndịisi Ndịikom Nta Stek

Otù Ndịisi Ndịikom Nta Stek nwere oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Jee ozi dị ka onye njụ nye ndị otù bishọp niime oke na ọrụ ha maka ụmụnne ndị nwoke Ọkwa Nchụaja nke Erọn

  • Jee ozi na kọmitii odudu ndị ntoroọbịa nke stek (lee 29.3.10).

  • N’okpuru ntuziaka nke otù ndịisi stek, tụọ atụmatụ ma hazie ihe omume niile na kampụ niile nke Ọkwa Nchụaja nke Erọn dị na stek.

Bipụta