Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
9. Otu Enyemaka


“9. Otu Enyemaka,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“9. Otu Enyemaka,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndịinyom na-amụ akwụkwọ nsọ

9.

Otu Enyemaka

9.1

Ebumnoobi na Otù

9.1.1

Ebumnoobi

Onye amụma Josef Smith kuziri na Ebumnoobi nke Otu Enyemaka bụ ichekwa mkpụrụ obi ma belata ntaram ahụhụ.

Okwu nlekwasị anya nke Otu Enyemaka bụ “Ịhụnaanya adịghị ada ada ma ọlị” (1 Ndị Kọrint 13:8).

9.1.2

Ịbụ onye otù niime Otu Enyemaka

Otu onye inyom nta nwere ike malite ịga Otu Enyemaka mgbe ọ gbara afọ 18. Mgbe ọ gbara afọ 19 ma ọ bụ mgbe ọ si n’ebe obibi nna-apụ, dị ka ịga mahadum ma ọ bụ ije ozi mishọn, o kwesịrị iso na-eme ihe na Otu Enyemaka.

Ụmụnwanyị a lụrụ alụ na-agbabeghị afọ 18 bụkwa ndị otù Otu Enyemaka.

9.2

Isonye n’Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu

9.2.1

Ibi ndụ Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

9.2.1.2

Ọmụmụ ihe nke Ozi ọma niime Nzukọ niile nke Otu Enyemaka

Nzukọ niile ka a na-eme na Sọnde nke abụọ na nke anọ nke ọnwa ahụ. Ana emeru ha ruo nkeji 50. Otu Ndịisi nke Otu Enyemaka na-atụ atụmatụ nke nzukọ ndị a. Otu onye otù nke otu ndịisi na-atụzi.

Nzukọ niile nke Otu Enyemaka na-elekwasị anya n’isiokwu ndị dị na otu okwu ma ọ bụ karịa sitere na ọgbakọ zuruọha kachasị nsonso.

9.2.1.3

Ihe omume niile

Otu ndịisi Otu Enyemaka nwere ike tụọ atụmatụ ihe omume niile. Ọtụtụ ihe omume ka a na-eme n’oge ndị ọzọ karịa Sọnde ma ọ bụ mgbede Mọnde niile.

9.2.2

Ilekọta Ndị Ahụ nọ na Mkpa

9.2.2.1

Ije ozi Nlekọta

Ụmụnne nwanyị na-anata ọrụ ije ozi nlekọta site n’aka otu ndịisi Otu Enyemaka. Maka ozi ndị ọzọ, lee isi nke 21.

9.2.2.2

Mkpa ndị Obere Oge

Ụmụnne nwanyị na-eje ozi nlekọta na-achọ ịghọta ma leba anya na mkpa nke ndị ahụ ha na-ejere ozi. Ndị otù nwere ike nwee mkpa enyemaka obere oge n’oge nrịanrịa, ọmụmụ nwa, ọnwụ, mfunarị ọrụ, na ọnọdụ ndị ọzọ.

Mgbe ọ dị mkpa, ụmụnne nwanyị na-eje ozi nlekọta na-arịọ otu ndịisi Otu Enyemaka maka enyemaka.

9.2.2.3

Mkpa dị Ogologo Oge na Ndabere N’onwe

Dị ka bishọp haziri, otù ndịisi Otù Enyemaka na kworum ndị okenye na-enyere ndị otù aka na mkpa dị ogologo oge na ndabere n’onwe.

Onyeisi Otu Enyemaka, onyeisi kworum ndị okenye, ma ọ bụ onye ndu ọzọ na-enyere onye ahụ ma ọ bụ ezi na ụlọ ahụ aka mepụta Atụmatụ Ndabere N’onwe.

9.2.2.4

Mgbe Onye otù Ngalaba Ukwu Nwụrụ

Mgbe onye otù ngalaba ukwu nwụrụ, otu ndịisi Otu Enyemaka na kworum ndị okenye na-enye nkasị obi na enyemaka. N’okpuru nduzi nke bishọp, ha nwere ike nye aka na olili ozu.

Maka ozi ndị ọzọ, lee 38.5.8.

9.2.3

Ịkpọku Ndị niile Ịnata Ozi ọma

Onyeisi Otù Enyemaka na-ekenye onye otù nke otu ndịisi ọọrụ inye aka duo n’ọrụ mgbasa ozi ọma onye otù niime ngalaba ukwu ahụ. Ya na onye otù nndịisi kworum ndị okenye ekenyere ọrụ na-arụ ọrụ ịhazi mbọ ndị a (lee 23.5.1).

9.2.4

Ijikọta ndị Ezi na ụlọ ọnụ maka Ebighị ebi

Onyeisi Otu Enyemaka na-ekenye otu onye otù otu ndịisi ọrụ inye aka duo n’ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ niime ngalaba ukwu ahụ. Ya na onye otù ndịisi kworum ndị okenye ekenyere ọrụ na-arụ ọrụ ịhazi mbọ ndị a (lee 25.2.2).

9.3

Ndị ndu Otu Enyemaka

9.3.1

Bishọp

Bishọp na onyeisi Otu Enyemaka na-ezutekarị kwa ọnwa. Ha na-akparịta ụka maka ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu, tinyekwara ije ozi nke ụmụnne nwanyị na-eje ozi nlekọta.

9.3.2

Otu Ndịisi nke Otu Enyemaka

9.3.2.1

Ịkpọ Otù Ndịisi nke Otù Enyemaka okù

Bishọp na-akpọ otu nwanyị ije ozi dị ka onyeisi Otu Enyemaka nke ngalaba ukwu ahụ. Ọ bụrụ na ngalaba ahụ buru ezigbo ibu, ọ na-atụrụ ya aro otu nwanyị ma ọ bụ abụọ ije ozi dị ka ndị ndụmọdụ ya.

Ụfọdụ ngalaba dị nta nwere ike gaghị enwe onyeisi Ndịinyom Nta ma ọ bụ nke Praịmarị. Niime ngalaba ndị a, onyeisi Otu Enyemaka nwere ike nyere ndị nne na nna aka tụọ atụmatụ nkuzi maka ndị ntoroọbịa na ụmụntakịrị.

9.3.2.2

Oke na ọrụ niile

Onyeisi Otu Enyemaka nwere oke na ọrụ ndị a sotere. Ndị ndụmọdụ ya na-enyere ya aka.

  • Jee ozi na kansụl ngalaba ukwu.

  • Duo mbọ niile nke Otu Enyemaka iji sonye n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu (lee isi nke 1).

  • Hazie ma lekọta ije ozi nke ụmụnne nwanyị na-eje ozi nlekọta.

  • N’okpuru nduzi nke bishọp, dụọ ndụmọdụ ya na ndị otù ngalaba ukwu toro eto.

  • Chịkọta mbọ niile nke Otu Enyemaka iji gbaa ụmụnne nwanyị ndị dimkpa nta nọ na ngalaba ukwu ume, ma ndị na-anọghị n’ọlụlụ ma ndị lụworo di.

  • Zukọọ ya na onye otù Otu Enyemaka ọbụla n’otu n’otu opekampe otu ugboro n’afọ.

  • Lekọta ndekọihe niile, repọọtụ niile, na ego niile nke Otu Enyemaka (lee LCR.ChurchofJesusChrist.org).

9.3.2.3

Nzukọ nke Otu Ndịisi

Otu Ndịisi Otu Enyem aka na ode akwụkwọ na-ezute ugboro ugboro. Onyeisi na-atụziaka nzukọ ndị a. Ajenda ya nwere ike gụnye ihe ndị a sotere:

  • Tụọ atụmatụ otu esi agba ụmụnne nwanyị na ndị ezi na ụlọ ha ume.

  • Chịkọta ọrụ mgbasa ozi ọma na tempụl na agụgụala ezi na ụlọ.

  • Lebara ọrụ niile sitere na nzukọ kansụl ngalaba ukwu anya.

  • Nyochaa ozi sitere na-ịgba ajụjụ ọnụ ije ozi nlekọta.

  • Tụlee ụmụnne nwanyị ga-eje ozi n’ọkpụkpọ okù niile na ọrụ niile e nyere na Otu Enyemaka.

  • Tụọ atụmatụ nzukọ niile na ihe omume niile nke Otu Enyemaka.

9.3.3

Ode akwụkwọ

Otu ndịisi nke Otu Enyemaka nwere ike rọpụta otu nwanne nwanyị ije ozi dị ka ode akwụkwọ nke Otu Enyemaka.

9.4

Inyere Ndịinyom Nta aka Kwadoo Isonye mee ihe niime Otu Enyemaka

Otu ndịisi Otu Enyemaka na-arụkọ ọrụ ha na ndịinyom nta, ndị nne na nna ha, na ndị ndu Ndịinyom Nta iji nyere ndịinyom nta aka kwadoo isonye mee ihe niime Otu Enyemaka.

Ndị ndu nakwa ewete ohere ndị na-aganiihu maka ndịinyom nta na ụmụnne nwanyị ndị Otu Enyemaka ịzụlite mmekọrịta dị iche iche. Ijekọta ozi ọnụ dị ka ụmụnne nwanyị na-eje ozi nlekọta bụ otu ụzọ bara uru iji mee njikọ niile.

9.6

Ntuziaka na Atụmatụ ndị Agbakwunyere

9.6.2

Ịmụta ka esi agụ na ka esi ede

Dị ka ọ dị mkpa, otu ndịisi Otù Enyemaka na-arụ ọrụ ha na bishọp, otù ndịisi kworum ndị okenye, na kansụl ngalaba ukwu iji nyere ndị otù aka mụta ịgụ na ide ihe.

Bipụta