Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
14. Ndị otù Na-anọghị n’ọlụlụ


“14. Ndị otù Na-anọghị n’Ọlụlụ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“14. Ndị otù Na-anọghị n’Ọlụlụ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndị mmadụ na-ekwu okwu

14.

Ndị otù Na-anọghị n’Ọlụlụ,

14.0

Ime ka a mata

Ndị nwoke na ndị nwanyị na-akaalụbeghị di na nwunye ma ọ bụ ndị gbara alụkwaghịm ma ọ bụ ndị isi mkpe mejupụtara otu akụkụ dị mkpa nke ịbụ onye otù Nzukọ nsọ. Ọ dị mkpa nye onye niile ịchọta olileanya site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst (lee Ita 12:4). Eziokwu ebighị ebi ndị a sotere nwere ike inye aka wulite ụdị olileanya a:

  • Akwụkwọ nsọ na ndị amụma ụbọchị ikpeazu a emewo ka amata na onye ọbụla nke kwụsịrị ike n’idobe ọgbụgba ndụ niile nke ozi ọma ga-enwe ohere maka mbuli elu.

  • Kpọm kwem oge ọ bụ na ụdị ụzọ esi enyefe ngọzi niile nke mbuli elu abụghị nke ekpugheworo ha niile. Kama otu ọbụla ekwere ha na nkwa (lee Mozaya 2:41).

  • Ichere n’oge Onyenwe anyị pụtara ịganiihu na nrube isi na ọganiihu nke ime mmụọ ruo n’ebe Ọ nọ (lee Aịzaya 64:4).

  • Chineke na-enye ụmụ Ya niile ndụ ebighi ebi. Ndị niile tozuru maka onyinye amara mgbaghara nke Onye Nzọpụta ma bie ndụ idobe iwu nsọ Ya niile ga-enwete ndụ ebighị ebi. (Lee Mozaya 26:30; Moronaị 6:8.)

  • Ntụkwasị obi niime nkwa ndị a niile gbara mgbọrọgwụ n’okwukwe niime Jizọs Kraịst. Site n’amara Ya, ihe niile banyere ndụ anụ ahụ ka edoziri nke ọma (lee Alma 7:11-13).

Onyenwe anyị chọrọ ka ndị otù niile nye aka n’ọrụ nke nzọpụta niime ngalaba ukwu na stek ha niile (lee 1 Ndị Kọrint 12:12-27). Dị ka Mmụọ si duo, ndị otù na-anọghị n’ọlụlụ ka a na-akpọ n’ọkwa odudu na nkuzi ihe.

niime isiakwụkwọ nke a:

  • “Ndị otù na-anọghị n’ọlụlụ,” rụtụrụ aka na ndị otù Nzukọ nsọ niile gbara dimkpa ndị na-alụghị ọlụlụ ugbua.

  • “Ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ” rụtụrụ aka na ndị ahụ gbara afọ 18-30.

  • “Ndị dimkpa na-anọghị n’ọlụlụ” rụtụrụ aka na ndị ahụ gbara afọ 31 na ụma.

14.1

Ndị otù Na-anọghị n’Ọlụlụ dị niime Ngalaba Obodo niile

14.1.1

Odudu nke Stek

14.1.1.2

Ndị Dimkpa Nta Na-anọghị n’Ọlụlụ na Kọmitii niile nke Ndị Dimkpa Na-anọghị n’Ọlụlụ

Otu ndịisi Stek na-ekepụta kọmitii ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ.

Otu ndịisi Stek nwekwara ike kepụta kọmitii ndị dimkpa na-anọghị n’ọlụlụ.

Kọmitii niile na-achọ ịkwado ndị otù site n’ịbụ enyi na ohere niile iji sonye n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu (lee 14.2).

14.1.2

Odudu Ngalaba ukwu

14.1.2.1

Otu Bishọp

Otù bishọp dị oke mkpa n’itinye ndị otù na-anọghị n’ọlụlụ n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu. Ha na kansụl ngalaba ukwu na-arụkọ ọrụ ịchọpụta ọkpụkpọ okù niile na ọrụ niile bara uru maka ndị otù na-anọghị n’ọlụlụ. Ha na-amata ma gbaa mbọ iji nye aka zute mkpa niile nke nne ma ọ bụ nna na-azụ ụmụ naanị ya.

  • Onye otù bishọp na-anọkọ ya na dimkpa nta ọbụla na-anọghị n’ọlụlụ opekampe otu ugboro n’afọ.

  • Otu bishọp nwere ike hazie kọmitii ngalaba ukwu nke dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ.

14.1.2.2

Ndị otù Otu Ndịisi Kworum Ndị Okenye na Otù Enyemaka Ekenyeere Ndị Dimkpa Na-anọghị n’Ọlụlụ

Ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyemaka nwere ike n’otu n’otu kenye onye otù nke otu ndịisi ha ikwado ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ. Ndị otù otu ndịisi ndị a na-amụ maka ike niile nke ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ ma nye aka zute mkpa ha.

Onyeisi kworum ndị okenye na onyeisi Otu Enyemaka nwere ike nye nkọwa maka mbọ ndị a na nzukọ kansụl ngalaba ukwu.

14.1.2.3

Ndị ndu Ndị Dimkpa Nta Na-anọghị n’Ọlụlụ

Na ngalaba ukwu enwere ọtụtụ ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ, otu bishọp nwere ike kpọọ otu nwoke na otu nwanyị onye dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ dị ka ndị ndu ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ. Oke na ọrụ ha gụnyere:

  • Inyere ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ aka sonye n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu (lee 14.2).

  • Ije ozi na kọmitii stek nke ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ.

  • Na-edu kọmitii ngalaba ukwu nke ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ ma ọ bụrụ na a haziri otu.

  • Izukọ mgbe niile ha na otu ndịisi kworum ndị okenye na Otu Ndịisi nke Otu Enyemaka. niime nzukọ ndị a, ha na-akparịta ụka maka ike niile nke ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ na otu e si enye aka zute mkpa ha. Ha nakwa elekwasị anya n’ije ozi nlekọta nye ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ.

14.2

Isonye n’Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu

14.2.1

Ibi ndụ Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

14.2.1.1

Nnọkọ Mgbede n’Ebe Obibi na Ọmụmụ ihe nke Ozi ọma

Ndị ndu ma ọ bụ ndị otù nwere mmasị isonye nwere ike hazie otu ma ọ bụ ọtụtụ nnọkọ mgbede n’ebe obibi nke ndị dimkpa na-anọghị n’ọlụlụ na otu ndị ọzọ maka ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ.

14.2.1.3

Ihe omume niile

N’okpuru ntuziaka nke ndị ndu ngalaba ukwu ma ọ bụ stek, ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ nwere ike tụọ atụmatụ ma sonye n’ihe omume niile a kpọrọ aha maka ha. Ọmụmaatụ niile nwere ike gụnye:

  • Nleta tempụl.

  • Ọrụ agụgụala ezi na ụlọ.

  • Ikesa ozi ọma.

  • Ije ozi n’Obodo.

  • Mmemme egwu na omenaala niile.

  • Egwuregwu.

N’okpuru ntuziaka nke ndị ndu stek, ndị dimkpa na-anọghị n’ọlụlụ nwere ike hazie atụmatụ yiri ihe omume niile n’ogo stek.

Bipụta