Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
13. Ụlọakwụkwọ Sọnde


“13. Ụlọakwụkwọ Sọnde,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“13. Ụlọakwụkwọ Sọnde,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ezi na ụlọ na-amụ akwụkwọ nsọ

13.

Ụlọakwụkwọ Sọnde

13.1

Ebumnoobi

Ndị ndu, ndị nkuzi, na klas Ụlọakwụkwọ Sọnde niile:

  • Na-akwadosike okwukwe niime Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst site n’ikuzi “ozizi nke alaeze” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:77).

  • Kwadoo ọmụmụ ihe na nkuzi nke ozi ọma dabeere n’ebe obibi nke Nzukọ nsọ kwadoro.

  • Nyere ndị otù aka kuzie ihe n’ụzọ nke Onye Nzọpụta.

13.2

Odudu Ụlọakwụkwọ Sọnde na Ngalaba ukwu

13.2.1

Otu Bishọp

Otu bishọp na-elekọta Ụlọakwụkwọ Sọnde. Bishọp na-enyekarị otu niime ndị ndụmọdụ ya ọrụ imejupụta oke na ọrụ nke a n’okpuru ntuziaka ya.

13.2.2

Onyeisi Ụlọakwụkwọ Sọnde

13.2.2.1

Ịkpọ okù Onyeisi Ụlọakwụkwọ Sọnde

Bishọp na-akpọ ma dopu iche onye ji Ọkwa nchụaja Melkizedek ịbụ onyeisi Ụlọakwụkwọ Sọnde ngalaba ukwu. Ọ bụrụ ma achọrọ ndị ndụmọdụ, ma ọ bụrụ ma enwee ọtụtụ ndịikom ga-eje ozi n’ọkwa ndị a, onyeisi Ụlọakwụkwọ Sọnde nwere ike tụnye uche maka otu onye ndụmọdụ ma ọ bụ abụọ.

13.2.2.2

Oke na ọrụ niile

  • Jee ozi na kansụl ngalaba ukwu.

  • Na-elekọta mbọ niile iji melite ọmụmụ ihe na nkuzi ihe nke ozi ọma n’ebe obibi ma n’ebe nzukọ nsọ.

  • Na-atụpụta uche nye otu bishọp ndị otù gbara dimkpa ga-eje ozi dị ka ndị nkuzi Ụlọakwụkwọ Sọnde.

  • Na-akwado, na-agba ume, ma na-akuziri ndị nkuzi Ụlọakwụkwọ Sọnde ihe.

  • Na-edu nzukọ kansụl ndị nkuzi dị ka bishọp si duo (lee Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta, 3).

13.2.3

Ndị Nkuzi Ụlọakwụkwọ Sọnde

Ịkwado ikuzi ihe, ndị nkuzi Ụlọakwụkwọ Sọnde na-eji akwụkwọ nsọ niile, Bịanụ, Soro M—Maka Ndị Mmadụ na ndị Ezi na ụlọ, na Bịanụ, Soro M—Maka Ụlọakwụkwọ Sọnde.

13.3

Klas Ụlọakwụkwọ Sọnde niile

Klas Ụlọakwụkwọ Sọnde niile ka a na-eme na Sọnde nke mbụ na nke atọ n’ọnwa.

Site na nkwado nke otu bishọp, onyeisi Ụlọakwụkwọ Sọnde na-ahazi klas niile maka ndị dimkpa na ndị ntoroọbịa.

Opekampe ndị dimkpa abụọ nwere akọ na uche kwesịrị ịnọ na klas ndị ntorobịa ọbụla

Ndị dimkpa niile ndị ha na ndị ntoroọbia na-arụ ọrụ ga-emezurịrị ọzụzụ nchekwa ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa niime otu ọnwa nke akwadoworo ha (ro ha (ProtectingChildren.ChurchofJesusChrist.org).

13.4

Imelite Ọmụmụ ihe na Nkuzi ihe na Ngalaba ukwu

Ndị ndu ngalaba ukwu ka ọ dị n’aka imelite ọmụmụ ihe na nkuzi ihe n’otu ha. Ha nwere ike rịọ onyeisi Ụlọakwụkwọ Sọnde maka enyemaka ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

13.5

Imelite Ọmụmụ ihe na Nkuzi ihe n’Ebe obibi

Ndị nne na nna ka ọ dị n’aka maka ikuzi ozi ọma nye ụmụntakịrị ha. Ha nwere ike rịọ onyeisi Ụlọakwụkwọ Sọnde maka inyere ha aka melite dị ka ndị nkuzi.

Bipụta