Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
12. Praịmarị


“12. Praịmarị,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“12. Praịmarị,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ezi na ụlọ jidere akwụkwọ nsọ n’aka

12.

Praịmarị

12.1

Ebumnoobi na Otù

Praịmarị bụ otù dabeere n’ebe obibi, Nzukọ nsọ kwadoro. Ọ bụ maka ụmụntakịrị gbara ọnwa 18 ruo afọ 11.

12.1.1

Ebumnoobi niile

Praịmarị na-enyere ụmụntakịrị aka:

  • Nwete mmetụta ịhụnaanya nke Nna ha nke Eluigwe ma mụọ ihe banyere atụmatụ nke obi ụtọ Ya.

  • Mụọ ihe banyere Jizọs Kraịst na ọrụ Ya niime atụmatụ Nna nke Eluigwe.

  • Mụọ ma bie ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst.

  • Nwee mmetụta, mata, ma mee ihe site na mkpalite nke Mmụọ Nsọ.

  • Kwadoo maka, mee, ma debe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ.

  • Sonye n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu.

12.1.3

Klaasị niile

Mgbe e nwere ọtụtụ ụmụntakịrị, a na-ekebi ha na klas dị iche iche dị ka afọ ole ha gbara.

Ụmụntakịrị n’izugbe n’aganiihu site na Praịmarị banye na Ndịinyom Nta ma ọ bụ kworum ndị dikọn na Jenụwarị nke afọ ha gbara afọ 12.

12.1.4

Oge Ịgụ egwu

Oge Ịgụ egwu na-enyere ụmụntakịrị aka nwete mmetụta ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe ma mụọ ihe banyere atụmatụ nke obi ụtọ Ya. Dị ka ụmụntakịrị na-abụ abụ banyere ụkpụrụ niile nke ozi ọma, Mmụọ Nsọ na-agba ama nke ịbụ eziokwu ha.

Otu Ndịisi Praịmarị na onye ndu egwu na-ahọpụta egwu niile maka ọnwa ọbụla iji kwadosie ike ụkpụrụ niile nke ozi ọma ụmụntakịrị na-amụ na klaasị ha niile ma n’ebe obibi.

12.1.5

Klaasị Ọta akara

Klaasị ọta akara na-enyere ụmụntakịrị gbara ọnwa 18 ruo afọ 3 aka nwete mmetụta ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe ma mụọ banyere atụmatụ nke obi ụtọ Ya.

12.2

Isonye n’Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu

12.2.1

Ibi nndụ Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

12.2.1.2

Ọmụmụ ihe nke Ozi ọma

Nzukọ Sọnde niile nke ndị Praịmarị. Otu onye otù nke otu ndịisi Praịmarị na-atụzi mmepe.

Nhazi ya bụ dị ka ndị a sotere:

Akụkụ Nzukọ

Ogologo

Akụkụ Nzukọ

Mmepe (ekpere, akwụkwọ nsọ ma ọ bụ Ndepụta nke Okwukwe, na ikwu okwu—ụmụntakịrị na-eme ha niile)

Ogologo

Nkeji 5

Akụkụ Nzukọ

Oge Ịgụ egwu

Ogologo

Nkeji 20

Akụkụ Nzukọ

Ịgafe na klaasị dị iche iche

Ogologo

Nkeji 5

Akụkụ Nzukọ

Klas niile na ekpere mmechi

Ogologo

Nkeji 20

Klaasị ọta akara maka ụmụntakịrị gbara ọnwa 18 ruo afọ 3 na-anọru nkeji 50. Lee Ụmụntakịrị Gị na-ewete nhazi atụrụ aro.

Ngosipụta Nzukọ Oriri nsọ nke Ụmụntakịrị. Ngosipụta nzukọ oriri nsọ nke ụmụntakịrị kwa afọ ka a na-eme niime ọnwa ole ma ole ikpeazu nke afọ.

Otu ndịisi Praịmarị na onye ndu egwu n’atụ atụmatụ nke ngosipụta ahụ n’ekpere Otu bishọp na-eme nduzi. Ụmụntakịrị nwere ike gụọ egwu, kwuo okwuchukwu, ma kọọ akụkọ niile, akwụkwọ nsọ, ma ọ bụ gbaa ama.

Nzukọ NkwadobeTempụl na Ọkwa nchụaja. Otu ndịisi Praịmay na-atụ atụmatụ nzukọ nkwadobe Tempụl na Ọkwa nchụaja afọ ọbụla. Otu bishọp na-eme nduzi. Nzukọ ahụ bụ maka ụmụntakịrị gbara afọ 10. A na-akpọku ndị nne na nna.

12.2.1.3

Ije ozi na Ihe omume niile

Malite na Jenụwarị nke afọ ha ga-agba afọ 8, ụmụntakịrị nwere ike malite ịbịa ihe omume Praịmarị niile.

Ihe omume niile nke ndị Praịmarị ka a na-eme n’oge ndị ọzọ na-abụghị Sọnde ma ọ bụ mgbede Mọnde.

  • Ihe omume Praịmarị niile ka a na-eme ugboro abụọ n’ọnwa mgbe o kwere omume.

  • Ụmụntakịrị nwoke na ụmụntakịrị nwanyị n’ezukọkarị iche iche. Kosiladị, ha nwere ike gwakọta maka ụfọdụ ihe omume ma ọ bụ n’ebe enwere ụmụntakịrị ole ma ole.

Otu bishọp na-ahụ na atụmatụ mmefu ego na ihe omume nke ụmụntakịrị nwoke na ụmụntakịrị nwanyị niime Praịmarị zuru ezu ma zie ezie.

12.2.1.4

Uto Nke Onwe

niime mgbalị ha ịbụkarị dị ka Onye Nzọpụta, ụmụntakịrị—malite n’afọ ha na-agba afọ 8—ka a na-akpọku ịhazi Ebumnoobi niile iji too etoo na nke ime mmụọ, nke ọha, nke anụ ahụ, na nke ọgụgụ isi (lee Luk 2:52).

Ha nwere ike jiri Uto Nke Onwe: Akwụkwọ Nduzi nke Ụmụntakịrị iji hazie ma rekọdụọ Ebumnoobi niile.

12.3

Odudu Praịmarị na Ngalaba ukwu

12.3.1

Otu Bishọp

Oke na ọrụ bishọp kachasị bụ maka ndudugandu na-etolite etolite, tinyere ụmụntakịrị. Bishọp nwere ike kenye onye ndụmọdụ inye aka n’oke na ọrụ ya na Praịmarị. Bishọp ma ọ bụ onye ndụmodụ e kenyere n’ezukọta kwa mgbe kwa mgbe ha na onyeisi Praịmarị.

Bishọp na ndị ndụmọdụ ya na-agakarị Praịmarị.

12.3.2

Otu Ndịisi Praịmarị

Bishọp na-akpọ ma dopu iche otu dimkpa nwanyị ije ozi dị ka onyeisi Praịmarị ngalaba ukwu.

Na nwa obere ngalaba, onyeisi Praịmarị nwere ike bụrụ naanị onye ndu akpọrọ niime Praịmarị. N’ọnọdụ nke a, ya na ndị nne na nna na-arụ ọrụ iji hazie ihe ọmụmụ niile, oge ịgụ egwu, na ihe omume niile. Ọ bụrụ na ngalaba ahụ buru ezigbo ibu, ọkpụkpọ okù ndị ọzọ ka enwere ike imejuputa n’usoro nke a: ndị ndụmọdụ, onye ndu egwu, ndị nkuzi na ndị ndu klas ọta akara, ode akwụkwọ, na ndị ndu ihe omume.

Otu ndịisi Praịmarị na-enyere ndị nne na nna aka kwadoo ụmụntakịrị ịbanye ma gaaniihu n’ụzọ ọgbụgba ndụ.

Imezu nke a, onyeisi Praịmarị nwere ike kenye onye otù nke otu Ndịisi inyere ndị nne na nna aka kwadoo ụmụ ha maka ime ha baptizim ma mee onye otù. Onyeisi Praịmarị nwere ike kenye onye otù ọzọ nke otu ndịisi inyere ndị nne na nna aka na nkwado maka tempụl na ọkwa nchụaja nke ụmụ ha.

Onyeisi Praịmarị nwere oke na ọrụ ndị a agbakwunyere na-esote: Ndị ndụmọdụ ya na-enyere ya aka.

  • Jee ozi na kansụl ngalaba ukwu.

  • Na-emekarị nzukọ otu ndịisi ugboro ugboro ya na bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ e kenyeere ya.

  • Na-enye aka hazie nzukọ baptizim niile maka ụmụntakịrị nke ndekọihe mgbe arịọrọ (lee 18.7.2).

  • Tụọ atụmatụ ma duzie mmepe nke nzukọ niile Praịmarị na Sọnde.

  • Jee ozi nlekọta nye ụmụntakịrị n’otu n’otu, ndị nkuzi, na ndị ndu nọ na Praịmarị.

  • Kuziere ndị ndu na ndị nkuzi Praịmarị oke na ọrụ ha ma kwadoo ha n’oke na ọrụ ndị ahụ site n’ịkọwara ha ọkpụkpọ okù ha (lee Ikuzi ihe N’Ụzọ nke Onye Nzọpụta [2016], 38).

  • N’elekọta ndekọihe niile, repọọtụ niile, atụmatụ mmefu ego, na ego niile nke Praịmarị.

12.3.4

Onye ndu Egwu na Onye na-akpọ Ube

Onye ndu egwu na onye na-akpọ ube na-akuziri ụmụntakịrị ozi ọma nke Jizọs Kraịst site n’egwu n’oge ịgụ egwu.

Ọ bụrụ ma onye na-akpọ ube ma ọ bụ pịano anọghị, ndị ndu nwere ike jiri ndị nke erekọọdụrụ mee ihe.

12.3.5

Ndị nkuzi na Ndị ndu Klas Ọta akara

Otu ndịisi Praịmarị na-atụpụtara otu bishọp ndị nwoke na ndị nwanyị maka ije ozi dị ka ndị nkuzi na ndị ndu klas ọta akara. Ndị otù ndị a ka akpọrọ ikuzi ma lekọta onye na nke ya ndị otù ebiri nke ụmụntakịrị.

Ndị nkuzi ndị praịmarị na ndị ndu klas ọta akara na-akuzi ihe site na Bịanụ, Soro M—Maka ndị Praịmarị (afọ 3 ruo 11) na Lee Ụmụntakịrị Gị (klas ọta akara).

12.3.6

Ndị ndu Ihe Omume

Ndị ndu ihe omume niile nke ndị Praịmarị na-elekọta ụmụntakịrị dị ka ha na-atụ atụmatụ ofufe na ihe omume niile malite na Jenụwarị nke afọ ụmụntakịrị gbara afọ 8 (lee 12.2.1.3). Ofufe na ihe omume niile na-elekwasị anya n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu. Ha na-enye ańụrị ma dị mmasị.

12.5

Ntuziaka na Atụmatụ niile Agbakwunyere

12.5.1

Ichekwata Ụmụntakịrị

Mgbe ndị okenye na-ekwuru ụmụntakịrị okwu na ntọ Nzukọ nsọ, opekampe ndị dimkpa abụọ nwere akọ na uche kwesịrị ịnọ ebe ahụ.

Ndị dimkpa niile na-arụ ọrụ ha na ụmụntakịrị ga-emezurịrị ọzụzụ nchekwa ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa niime otu ọnwa nke akwadoworo ha. (ProtectingChildren.ChurchofJesusChrist.org).

Bipụta