Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
11. Ndịinyom Nta


“11. Ndịinyom Nta,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“11. Ndịinyom Nta,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndịinyom nta nọ na ezi

11.

Ndịinyom Nta

11.1

Ebumnoobi na Otù

11.1.1

Ebumnoobi

Otu Ndịinyom Nta na-enyere ndịinyom nta aka mee ma debe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ ma mee ka ntụgharị ha nye Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya mie emie.

11.1.2

Isiokwu nke otu Ndịinyom Nta

“Abụ m nwada nke nne na nna nke eluigwe hụrụ naanya, nwere ọdịdị dị nsọ na akaraka dị ebighị ebi.

“Dị ka onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, A na m agbasi mbọ ike ịdị ka Ya. Ana m achọ ma na-eme ihe na mkpughe nke onwe ma na-elekọta ndị ọzọ n’aha nsọ Ya.

“Aga m eguzo dị ka onye aka ebe Chineke n’oge niile na n’ihe niile na n’ebe niile.

“Dị ka m na-agbasi mbọ ike itozu oke maka mbuli elu, onyinye nke nchegharị na-amasị m nke ukwuu ma m na-achọ inwe ọganiihu ụbọchị ọbụla. Site na okwukwe, A ga m agba ebe obibi m na ezi na ụlọ m ume, mee ma debe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ, ma nata emume nsọ niile na ngọzi niile nke tempụl dị nsọ.”

11.1.3

Klaasị niile

Ndịinyom nta na-aghọ ndị otù klaasị Ndịinyom Nta na mmalite Jenụwarị nke afọ ha ga-agba afọ 12.

Otu ndị bishọp na ndị ndu ndị dimkpa Ndịinyom Nta n’oke ekpere na-ekpebi otu esi ahazi klaasị niile dị ka otu afọ ole ha gbara siri dị. Klaasị ọbụla, na-agbanyeghị nha, kwesịrị inwe onyeisi na, ebe o kwere omume, otu onye ndụmọdụ ma ọ bụ abụọ na ode akwụkwọ.

11.2

Isonye n’Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu

11.2.1

Ibi ndụ Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

11.2.1.2

Ọmụmụ ihe nke Ozi ọma

Nzukọ klaasị niile ka a na-eme na Sọnde nke abụọ na nke anọ nke ọnwa ahụ. A na-emeru ha ruo nkeji 50. Onye otù nke otu ndịisi klas na-atụzi aka. Ọ na-edu klaasị na-ịgụ n’isi isiokwu ahụ na inyekọrịta ndụmọdụ ọnụ banyere ọrụ niile enyere na okwu ndị ọzọ.

Onye otù klaasị ma ọ bụ onye ndu dimkpa mgbe ahụ na-edu na nkuzi nke ozi ọma.

11.2.1.3

Ije ozi na Ihe omume niile

Ije ozi na ihe omume niile kwesịrị iwuli ịgbaama niile, gbaa ndị ezi na ụlọ ume, wete ịdị n’otu na klaasị, ma wete ohere niile iji gọzie ndị ọzọ.

Ụfọdụ ije ozi na ihe omume niile kwesịrị ịgụnye ma ndịikom nta ma ndịinyom nta, kachasị nke maka ndị ntoroọbịa tọrọ eto.

Ihe omume ndị Ome na-afọ. Na mgbakwunye nye ihe omume niile nke ndị ntoroọbịa na-eme mgbe niile, ndịinyom nta nwekwara ike isonye n’ihe ndị a sotere n’afọ ọbụla:

  • Kamp Ndịinyom Nta (lee Ntuziaka maka Kamp Ndịinyom Nta).

  • Ọgbakọ stek ma ọ bụ ngalaba ukwu nke ndị ntoroọbịa ma ọ bụ ọgbakọ Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa (FSY).

11.2.1.4

Uto Nke Onwe

Na mgbalị ha ịbụkarị dị ka Onye Nzọpụta, ndị ntoroọbịa ka a na-akpọku ịhazi Ebumnoobi niile iji too etoo niihe nke ime mmụọ, nke ọha, nke anụ ahụ, na nke ọgụgụ isi (lee Luk 2:52).

Maka ozi ndị ọzọ, lee ChildrenandYouth.ChurchofJesusChrist.org.

11.2.2

Ilekọta Ndị Ahụ nọ na Mkpa

Ndịinyom nta kwesịrị inwe ohere mgbe niile iji jeere ndị ọzọ ozi ma ha na ndị ezi na ụlọ ha, n’oge ihe omume niile nke ndị ntoroọbịa, ma n’onwe ha.

11.2.2.1

Ije ozi Nlekọta

Ndịinyom nta na-anata ọrụ ije ozi nlekọta na mmalite Jenụwarị nke afọ ha gbara afọ 14. Maka ozi ndị ọzọ, lee isi nke 21.

11.2.3

Ịkpọku Ndị niile Ịnata Ozi ọma ahụ

Ndịinyom nta na-akpọku ndị niile ịnata ozi ọma dị ka ha “na-eguzo dị ka ndị aka ebe nke Chineke n’oge niile na n’ihe niile, na n’ebe niile” (Mozaya 18:9).

Ndị nne na nna na ndị ndu nwere ike inyere ndịinyom nta aka kwadoo ikesa ozi ọma n’oge ndụ ha niile.

11.2.4

Ijikọta ndị Ezi na ụlọ ọnụ maka Ebighị ebi

Ndịinyom nta nwere ike inye aka jikọta ndị ezi na ụlọ ọnụ maka ebighị ebi n’ụzọ dị ọtụtụ.

  • Sọpụrụ nne na nna ha ma hiwe ihe atụ nke ibi ndụ dị ka Kraịst n’ebe obibi ha.

  • Kwadoo ịnata emume nsọ niile nke tempụl, gụnyere alụmdi na nwunye dị ebighị ebi.

  • Chọpụta ndị nna nna ochie ndị e kwesịrị imere emume nsọ tempụl (lee FamilySearch.org).

  • Sonye na baptizim na Emume Nnabata niile maka ndị nwụrụ anwụ mgbe ọbụla ọnọdụ niile kwere ka e mee.

11.3

Odudu Ndịinyom Nta na Ngalaba ukwu

11.3.1

Otu Bishọp

Ọrụ mbụ nke bishọp kachasị mkpa bụ ịlekọta ndịinyom nta na ndịikom nta dị na ngalaba ukwu ya. Ya na ndị ndụmọdụ ya na-amatacha aha ha ma ghọta otu ọnọdụ ebe obibi ha dị. Ha na-ezukọta ha na onye inyom nta ọbụla opekampe ugboro abụọ n’afọ (lee 31.3.1).

Bishọp nwere oke na ọrụ maka otu Ndịinyom Nta na ngalaba ukwu. Ọ na-ezutekarị onyeisi Ndịinyom Nta.

Bishọp na ndị ndụmọdụ ya na-esokarị na nzukọ niile, ije ozi, na ihe omume niile nke Ndịinyom Nta.

11.3.2

Otu Ndịisi Dimkpa Ndịinyom Nta

Bishọp na-akpọ ma dopu iche otu dimkpa nwanyị ije ozi dị ka onyeisi Ndịinyom Nta na ngalaba ukwu ahụ. Ọ bụrụ na ngalaba ahụ buru ibu, ọ na-atụnye uche ka akpọọ otu dimkpa nwanyị ma ọ bụ abụọ dị ka ndị ndụmọdụ ya (lee isi nke 30).

Na ngalaba dị ntakịrị, onyeisi Ndịinyom Nta nwere ike bụrụ naanị onye ndu dimkpa nọ n’otu Ndịinyom Nta ahụ. Ọ bụrụ otu a, ya na ndị nne na nna na-arụ ọrụ ịhazi nkuzi na ihe omume niile maka ndịinyom nta.

Ọ bụrụ na ngalaba nta ahụ enweghị onyeisi Ndịinyom Nta, onyeisi Otu Enyemaka nwere ike hazie nkuzi maka ndịinyom nta tutu ruo mgbe a ga-akpọ onyeisi Ndịinyom Nta.

Onyeisi Ndịinyom Nta nwere oke na ọrụ ndị a sotere. Ndị ndụmọdụ ya na-enyere ya aka.

  • Jee ozi na kansụl ngalaba ukwu.

  • Jee ozi dị ka onye otù kansụl ndị ntoroọbịa na Ngalaba ukwu ngalaba ukwu (lee 29.2.6).

  • Lekọta ndịinyom nta n’otu n’otu.

  • Kuziere ndị ndu na otu ndịisi klaasị Ndịinyom Nta ndị ọzọ oke na ọrụ ha.

  • Dụọ ndụmọdụ ya na ndịinyom nta banyere aka mgba niile na-ekwesịghị ịgbasa bishọp ma ọ bụ gụnyere mmetọ (lee 32.3, 31.3.1, na 38.6.2).

11.3.4

Otu Ndịisi Klaasị na Ode akwụkwọ

11.3.4.1

Ọkpụkpọ okù, Inye nkwado, na Idopụ Iche

Klaasị Ndịinyom Nta ọbụla kwesịrị inwe otu ndịisi klaasị.

Onye otù nke otu bishọp na-akpọ otu onyeinyom nta ije ozi dị ka onyeisi klaasị. Mgbe enwere ọtụtụ ndịinyom nta ije ozi, n’oke ekpere ọ na-atụle ndị otù klas a ga-atụnye uche dị ka ndị ndụmọdụ na onye ode akwụkwọ.

Mgbe akpọsịrị okù ndị a, onye otù ndị bishọp na-akpọpụta ndịinyom nta ahụ nye klaasị ha maka nkwado. Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ na-edopụ ndịinyom nta ahụ iche.

11.3.4.2

Oke na ọrụ niile

Ndịisi klaasị na-eje ozi na kansụl ndị ntoroọbịa ngalaba ukwu (lee 11.3.4.4). Otu ndịisi klas nwekwara oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Duo na mbọ niile nke klaasị ahụ iji sonye n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu (lee isi nke 1).

  • Bịa mata ma jeere onyeinyom ọbụla ozi, tinyere ndị ahụ na-anaghị abịa nzukọ klaasị niile.

  • Tụọ atụmatụ ma duzie nzukọ Klas Sọnde niile (lee 11.2.1.2).

  • Tụọ atụmatụ ma jee ozi na ihe omume niile nke klas (lee 11.2.1.3).

11.3.4.3

Nzukọ nke Otu Ndịisi Klaasị

Otu ndịisi klaasị Ndịinyom Nta na-ezukọ mgbe niile. Onyeisi klas ahụ na-eduzi nzukọ ndị a. Dimkpa ndị ndu Ndịinyom Nta enyere ọrụ ikwado otu ndịisi klaasị na-abịakwa.

11.3.4.4

Kansụl ndị Ntoroọbia na Ngalaba ukwu

Lee 29.2.6 maka ozi ndị ọzọ banyere kansụl ndị ntoroọbia na ngalaba ukwu.

11.6

Ntuziaka na Atụmatụ ndị Agbakwunyere

11.6.1

Ichekwa Ndị Ntoroọbịa

Mgbe ndị dimkpa na-ekwuru ndị ntoroọbia okwu na ntọ Nzukọ nsọ, opekampe dimkpa abụọ nwere akọ na uche kwesịrị ịnọ ebe ahụ. O nwere ike dị mkpa ịgwakọta klaasị niile iji mee nke a adị ire.

Ndị dimkpa niile ha na ndị ntoroọbia na-arụ ọrụ ga-emezurịrị ọzụzụ nchekwa nke ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa niime otu ọnwa nke akwadoworo ha (ProtectingChildren.ChurchofJesusChrist.org).

Bipụta