Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
15. Seminarị niile na Instituutu niile nke Okpukperechi


“15. Seminarị niile na Instituutu niile nke Okpukperechi,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“15. Seminarị niile na Instituutu niile nke Okpukperechi,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
Onye inyom nta na-eweli aka ya na klaasị

15.

Seminarị niile na Instituutu niile nke Okpukperechi

15.0

Ndubata

Seminarị niile na Instituutu niile nke Okpukperechi (S&I) na-enyere ndị nne na nna na ndị ndu Nzukọ nsọ aka n’inyere ndị ntoroọbịa na ndị dimkpa nta aka bawanye okwukwe ha na Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya eweghachitere.

Otu Onye nnọchi anya S&I ka enyere ọrụ na stek ọbụla inyere ndị ndu aka lekọta usoro atụmatụ S&I niile.

15.1

Semịnarị

Semịnarị bụ usoro atụmatụ afọ anọ niime nke ndị ntoroọbịa na-amụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst dị ka a hụrụ niime akwụkwọ nsọ na nkuzi niile nke ndị amụma ụbọchi ikpeazụ a. Ụmụakwụkwọ semịnarị na-agbakarị afọ 14-18.

Otu bishọp, ndị ndu ndị ntoroọbịa, na otu ndịisi kworum na klaasị na-agba ndị ntoroọbịa niile ume isonye semịnarị n’uju.

15.1.1

Ndị Nkuzi

Ndị nkuzi semịnarị kwesịrị ịbụ ndị otù Nzukọ nsọ ndị nwere okwukwe niime Jizọs Kraịst na ịgba ama nke ozi ọma Ya eweghachitere. Ha kwesịrị ibi ndụ ụkpụrụ niile ha na-akuzi ma na-arụkọ ọrụ nke ọma ha na ndị ntoroọbịa. Mgbe o kwere omume, ndị nkuzi kwesịrị inwe rekọmend tempụl dị irè.

Onye otù otu ndịisi stek ma ọ bụ onye kansụl dị elu enyere ọrụ na-akpọ, dopụ iche, ma tọghapụ n’ọrụ ndị nkuzi semịnarị stek na ndị nlekọta stek.

Iji chekwaa ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ, ndị dimkpa abụọ kwesịrị ịnọ n’ụlọ ma ọ bụ ebe obibi ebe a na-akuzi semịnarị klaasị.

15.1.2

Nhọrọ Semịnarị niile

Semịnarị na-akachasị enye aka mgbe ụmụakwụkwọ nwere ike izute onye nkuzi ụbọchi izu ọbụla. Kosiladị, nke a nwere ike ọ gaghị ekwe omume n’ihi nsogbu nchekwa niile, ntọanya njem, na ihe ndị ọzọ.

Ndị ndu Nzukọ nsọ na ndị nnọchianya S&I ha na-adụkọrịta ndụmọdụ ikpebi nhọrọ nke:

  • Ga-aka enyere ụmụakwụkwọ aka mụọ ozi ọma ma tolite niime mmụọ.

  • Ga-edebe ụmụakwụkwọ na nchekwa.

  • Na-agaghị ebunye ezi na ụlọ ahụ ibu na-enweghị isi.

Ekwesịghị ime klas ndị a na Sọnde.

15.1.3

Ụlọ niile, Akụrụngwa, na Ngwaọrụ niile

Ndị ndu stek na ngalaba ukwu na-ahụ na ebe niile dị ka ụlọ ụka ma ọ bụ ebe obibi niile nke ndị otù dị adị maka klaasị semịnarị niile.

Onye nnọchianya S&I na-ewete ngwaọrụ niile maka ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ maka klas ọbụla. Ụmụakwụkwọ kwesịrị iwete akwụkwọ nsọ nke onwe ha, nke ebipụtara ebipụta ma ọ bụ nke dijitaalụ.

15.1.5

Kredit na Ngụsị akwụkwọ

Ụmụakwụkwọ semịnarị nwere ike mụtakwuo nke ọma ma mee ka mgbanwe ha mikwuo emie ọ bụrụ ma ha na-abịa klaasị, sonye niihe a na-eme, ma mụọ akwụkwọ nsọ ma ọ bụghị na klas mgbe niile. Dị ka ha na-eme ihe ndị a, ha na-enwetekwa kredit nke semịnarị afọ ọbụla ma nwee ike ịgụsi akwụkwọ site na semịnarị.

Ịgụsị akwụkwọ site na semịnarị, nwa akwụkwọ ga-enweterịrị kredit afọ anọ ma nata ndenye aha nke ụkọchukwu site n’aka onye otù ndị bishọp.

15.2

Instituutu

Instituutu na-ewete klas niile nke ọmụmụ ozi ọma ụbọchi izu nke na-agba okwukwe na ịgba ama ume niime Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya eweghachitere. Ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ gbara afọ 18-30 kwesịrị ka agbaa ha ume ịga klas instituutu niile, ma ha na-aga ụlọakwụkwọ ma ọ bụ na ha anaghị.

15.3

Ụlọakwụkwọ Nzukọ nsọ niile na usoro nke Agụmakwụkwọ Nzukọ nsọ

Maka ozi banyere ụlọakwụkwọ praịmarị na sekọndịrị nke Nzukọ nsọ, BYU–Pathway Worldwide, na ụlọakwụkwọ niile nke agụmakwụkwọ dị elu, lee CES.ChurchofJesusChrist.org. Ozi banyere imezu ndenye aha ụkọchukwu niile maka ụmụakwụkwọ ịga ụlọakwụkwọ ndị a ka enyekwara ebe ahụ.

Na mgbakwunye, ozi banyere ndenye aha ụkọchukwu maka iwere n’ọrụ site na ụlọ ọrụ CES Ecclesiastical Clearance ka enwere ike ịchọta na help.ChurchofJesusChrist.org.

Bipụta