Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
17. Ikuzi Ozi ọma


“17. Ikuzi Ozi ọma,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“17. Ikuzi Ozi ọma,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
nne na-akuziri nwa ya nwoke ihe

17.

Ikuzi Ozi ọma

Anyị na-akuzi ozi ọma iji nye aka gbaa ndị mmadụ ume n’okwukwe ha niime Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst.

17.1

Ụkpụrụ niile nke Ikuzi ihe n’ụdị Kraịst

Mgbe a na-akuzi ozi ọma, ndị nne na nna, ndị nkuzi, na ndị ndu na-eso ọmụmaatụ nke Jizọs Kraịst, onye bụ Nna ukwu Nkuzi.

Ndị ndu na-ekesa ụkpụrụ ndị a sotere nke ikuzi ihe n’ụdị Kraịst ha na ndị nkuzi nọ na otu ha. Ụkpụrụ ndị a ka akọwara n’uju niime Ikuzi ihe N’ụzọ nke Onye Nzọpụta.

17.1.1

Hụ Ndị Ị Na-akuziri ihe Naanya

Ihe niile Onye Nzọpụta na-eme bụ ngosipụta nke ịhụnaanya Ya (lee 2 Nefi 26:24).

17.1.2

Kuzie ihe site na Mmụọ

Ndị nkuzi na-achọ nduzi nke Mmụọ ahụ dị ka ha na-akwado ma na-akuzi ihe, ma ha na-agba mbọ ibi ndụ ntozu oke nke mmetụta Ya ụbọchi ọbụla.

17.1.3

Kuzie Ozizi ahụ

Site na ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta, ndị nkuzi na-elekwasị anya n’ihe dị oke mkpa, eziokwu nke ozi ọma na-azọpụta. Ha na-akuzi ihe jiri akwụkwọ nsọ niile, nkuzi niile nke ndị amụma ụbọchi ikpeazụ a, na kurikulum akụrụngwa ndị akwadoro.

17.1.4

Kpọkuo Ọmụmụ ihe Dị Uchu

Ndị nkuzi na-agba ndị otù ume ịhụ maka ọmụmụ ihe nke onwe ha.

17.2

Ọmụmụ ihe na Nkuzi ihe nke Ozi ọma Dabeere N’ebe obibi

Ndị ndu na ndị nkuzi nke Nzukọ nsọ na-agba ume ma na akwado ọmụmụ ihe na nkuzi ihe nke ozi ọma dabeere n’ebe obibi.

Ndị ndu na ndị nkuzi na-agba ndị otù ume ịchọta mkpatemmụọ nke onwe ha banyere otu esi amụ ihe ma kuzie ozi ọma. Isi njụ niile ha kwesịrị ịbụ akwụkwọ nsọ niile na ozi niile nke ọgbakọ zuruọha.

17.3

Oke na ọrụ niile nke Ndị ndu

  • Hiwe ọmụmaatụ site n’ịmụ ozi ọma na ikuzi ya n’ụzọ nke Onye Nzọpụta.

  • Hụ na nkuzi ihe niime otu ha niile na-ewulite okwukwe ma zie ezi n’ozizi.

  • Nye ndị nkuzi nọ niime otu ha niile nkwado mgbe niile.

17.4

Nzukọ niile nke Kansụl Onye Nkuzi

Na nzukọ niile nke kansụl onye nkuzi, ndị nkuzi na-adụkọrịta ndụmọdụ ọnụ banyere ụkpụrụ niile nke ikuzi ihe n’ụdị Kraịst. Ha nakwa adụ ndụmọdụ banyere otu esi emelite ọmụmụ ihe na nkuzi ihe nke ozi ọma. Ha na-eji Ikuzi ihe N’ụzọ nke Onye Nzọpụta dị ka ihe njụ.

Nzukọ niile nke kansụl onye nkuzi ka a na-eme kwa ọnwa atọ ọbụla n’oge nkeji 50 klaasị na Sọnde.

Bipụta