Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
18. Ime Emume nsọ niile na Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja


“18. Ime Emume nsọ niile na Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“18. Ime Emume nsọ niile na Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ezi na ụlọ na-aga ije n’akụkụ tempụl

18.

Ime Emume nsọ niile na Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja

18.0

Ime ka a mata

Emume nsọ niile na ngọzi niile bụ ihe omume dị nsọ a na-eme site n’ikike nke ọkwa nchụaja na n’aha nke Jizọs Kraịst. Emume nsọ niile na ngọzi niile na-ewete ụzọ ruo n’ike nke Chineke (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:20).

Emume nsọ niile na ngọzi niile ka a na-eme jiri okwukwe na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ma site n’otu nduzi nke Mmụọ Nsọ siri dị. Ndị ndu na-ahụ na e mere ha site na nkwado kwesịrị ekwesị (ebe ọ dị mkpa), site n’ikike ọkwa nchụaja achọrọ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ma site n’aka ndị tozuru oke ịme ha (lee 18.3).

18.1

Emume nsọ niile nke Nzọpụta na Mbuli elu

Ọkwa nchụaja gụnyere ikike iji mee emume nsọ niile nke ozi ọma nke dị mkpa maka nzọpụta na mbuli elu. Ndị mmadụ na-eme ọgbụgba ndụ dị nsọ ha na Chineke dị ka ha na-anata emume nsọ ndị a. Emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu ka edepụtara n’okpuru:

  • Baptizim

  • Emume Nnabata na onyinye nke Mmụọ Nsọ.

  • Nnyefe nke Ọkwa nchụaja Melkizedek na echichi baa n’ọkwa ọrụ (maka ndị nwoke)

  • Onyinye dị nsọ nke Tempụl

  • Nrachi nke tempụl

Ọ bụrụ na nwata a mụrụ n’ọgbụgba ndụ anwụọ tupu afọ 8, ọdịghị emume nsọ a chọrọ ma ọ bụ a ga-eme. Ọ bụrụ na amụghị nwa ahụ n’ọgbụgba ndụ, naanị emume nsọ kwesịrị ya bụ ịrachi ya nye ndị nne na nna. N’ihi Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst, ụmụntakịrị niile nwụrụ tupu afọ 8 ka “azọpụtara n’alaeze selestịal nke eluigwe” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 137:10; leekwa Moronaị 8:8-12).

18.3

Nsonye na Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Ndị ahụ mere ma ọ bụ sonyere na emume nsọ ma ọ bụ ngọzi aghaghị inwe ikike ọkwa nchụaja dị mkpa ma tozuo oke. N’ụzọ niile, ọkọlọtọ nke ntozu oke bụ ụdị nke ahụ metụtara ijide rekọmend tempụl. Kosiladị, dị ka esi duo site na Mmụọ na nkuzi niile dị n’isiakwụkwọ nke a, ndị bishọp na ndịisi stek nwere ike kwere ndị nna na ndị di ndị ji ọkwa dị mkpa nke ọkwa nchụaja ime ma ọ bụ sonye n’ụfọdụ emume nsọ na ngọzi ọbụna ọ bụrụ na ha etozughị oke tempụl n’uju. Onye ji ọkwa nchụaja nwere mmehie dị oké njọ a na-edozibeghị ekwesịghị isonye.

Ime ma ọ bụ ịnata ụfọdụ emume nsọ na ngọzi na-achọ nkwado sitere n’aka onye ndu ntuziaka onye ji ọtụghe niile dị mkpa nke ọkwa nchụaja (lee 3.4.1). Dị ka achọrọ, nkwado ka enwere ike inye site n’aka onye ndụmọdụ o nyere ikike. Lee chaatị ndị sotere. Ntụaka niile nye onyeisi stek gbasakwara ndịisi mishọn. Ntụaka niile nye ndị bishọp gbasakwara ndịisi ngalaba nta.

Olee Ndị ndu Ji Ọtụghe niile iji Nye Nkwado Ime ma ọ bụ Ịnata Emume nsọ niile nke Nzọpụta na Mbuli elu?

Emume nsọ

Onye Ji Ọtụghe niile

Emume nsọ

Baptizim

Onye Ji Ọtụghe niile

Bishọp (maka ụmụaka gbara afọ 8 na maka ndị otù ndekọihe gbara afọ 9 ma karịa ndị egburu oge baptizim ha n’ihi nkwarụ niile nke ọgụgụ isi)

Onyeisi mishọn (maka ndị atọghatara atọghata)

Emume nsọ

Emume Nnabata na onyinye nke Mmụọ Nsọ.

Onye Ji Ọtụghe niile

Bishọp (maka ụmụaka gbara afọ 8 na maka ndị otù ndekọihe gbara afọ 9 ma karịa ndị egburu oge baptizim ha n’ihi nkwarụ niile nke ọgụgụ isi)

Onyeisi mishọn (maka ndị atọghatara atọghata)

Emume nsọ

Nnyefe nke Ọkwa nchụaja Melkizedek na echichi baa n’ọkwa ọrụ (maka ndị nwoke)

Onye Ji Ọtụghe niile

Onyeisi stek

Emume nsọ

Onyinye dị nsọ nke Tempụl

Onye Ji Ọtụghe niile

Bishọp na onyeisi stek

Emume nsọ

Nrachi nke tempụl

Onye Ji Ọtụghe niile

Bishọp na onyeisi stek

Olee Ndị ndu Ji Ọtụghe niile iji Nye Nkwado Ime ma ọ bụ Ịnata Emume nsọ na Ngọzi Ndị ọzọ?

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Onye Ji Ọtụghe niile

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Inye aha na ịgọzi ụmụntakịrị

Onye Ji Ọtụghe niile

Bishọp

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Oriri nsọ

Onye Ji Ọtụghe niile

Bishọp

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Nnyefe nke Ọkwa nchụaja nke Erọn na echichi baa n’ọkwa ọrụ (maka ndịikom nta na ndịikom)

Onye Ji Ọtụghe niile

Bishọp

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Idopụ iche ndị otù ije ozi n’ọkpụkpọ okù niile

Onye Ji Ọtụghe niile

Lee 30.8

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Ido mmanụ nsọ

Onye Ji Ọtụghe niile

Achọghị nkwado

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Inye onye ọrịa ngọzi

Onye Ji Ọtụghe niile

Achọghị nkwado

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Ngọzi niile nke nkasi obi na ndụmọdụ, tinyekwara ngọzi niile nke nna.

Onye Ji Ọtụghe niile

Achọghị nkwado

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Ịrara ebe obibi nye

Onye Ji Ọtụghe niile

Achọghị nkwado

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Ịrara ala ili nye

Onye Ji Ọtụghe niile

Onye ndu ọkwa nchụaja na-eduzi na ofufe ahụ

Emume nsọ ma ọ bụ Ngọzi

Ngọzi niile nke onye petrak

Onye Ji Ọtụghe niile

Bishọp

18.4

Emume nsọ niile maka Ụmụ Obere ụmụaka

Nwa obere nwa ka enwere ike ịgọzi, mee baptizim, mee onye otù, chie echichi banye na ọkwa ọrụ ọkwa nchụaja, ma ọ bụ dopụ iche n’ọkpụkpọ okù naanị site na nkwenye nke (1) ndị nne na nna ndị nwere ike iwu kwadoro iji sonye na mkpebi ahụ ma ọ bụ (2) ndị nlekwata iwu kwadoro.

18.6

Inye aha na Ịgọzi Ụmụntakịrị

Ụmụntakịrị ka a na-enyekarị aha ma gọzie n’oge nzukọ obubu ọnụ na ịgba ama na ngalaba ukwu ebe ndị nne na nna ha bi.

18.6.1

Onye Na-enye Ngọzi ahụ

Emume nsọ nke inye aha na ịgọzi nwata ka a na-eme site n’aka ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek, nke dabara adaba na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:70.

Otu onye ma ọ bụ ezi na ụlọ chọrọ ka otu nwata nata aha na ngọzi na-eso bishọp ahazi emume nsọ ahụ. O ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja maka inye aha na ịgọzi ụmụntakịrị niime ngalaba ukwu ahụ.

Bishọp nwere ike kwe onye nna ji ọkwa nchụaja Melkizedek inye aha ma gọzie nwa ya ọbụna ọ bụrụ ma nna ahụ etozughị oke nke tempụl n’uju (lee 18.3). Ndị bishọp na-agba ndị nna ume ikwado onwe ha ịgọzi ụmụ nke onwe ha.

18.6.2

Nkuzi niile

N’okpuru ntuziaka nke otu bishọp, ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek na-agbakọ n’okirikiri inye aha na ịgọzi nwata. Ha na-edebe aka ha n’okpuru nwa, ma ọ bụ debetụ aka ha n’isi nke nwa tolitụrụ Mgbe ahụ onye nke na-eme dị ka olu:

  1. Na-agwa Nna nke Eluigwe okwu dị ka n’ekpere.

  2. Na-ekwu na a na-enye ngọzi ahụ site n’ikike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek.

  3. Na-enye nwata ahụ aha.

  4. Na-agwa nwa ahụ okwu.

  5. Na-enye nwa ahụ ngọzi dị ka Mmụọ si duo.

  6. Mechie n’aha Jizọs Kraịst.

18.6.3

Fọm Ndekọihe na Asambodo Ngọzi nke Nwata

Tupu agọzie nwata, ode akwụkwọ n’eji Akụrụngwa Onye ndụ na Ode akwụkwọ (LCR) iji kwadoo otu Fọm Ndekọihe nke Nwata. Mgbe emesịrị ngọzi ahụ, ọ na-ekepụta ndekọihe ịbụ onye otù niime sistem ahụ ma kwadoo otu Asambodo nke Ngọzi. Asambodo nke a ka bishọp n’ebinye aka ma enye ya nne na nna ma ọ bụ onye nlekwa nke nwata ahụ.

Aha dị na ndekọihe ịbụ onye otù na asambodo ahụ kwesịrị ịdabakọta na asambodo ọmụmụ, ndekọaha ọmụmụ obodo, ma ọ bụ aha ugbua iwu kwadoro.

18.7

Baptizim

Baptizim site n’irukpu niime mmiri site n’aka otu onye ji ikike dị mkpa maka mmadụ ịghọ onye otù nke Nzukọ nsọ ma nata Mmụọ Nsọ. Ndị niile na-achọ mbuli elu garịrị esoro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta site n’ịnata emume nsọ ndị a.

18.7.1

Nkwado maka Mmadụ Ime Baptizim na Emume Nnabata

18.7.1.1

Ụmụntakịrị Ndị Bụ Ndị otù Ndekọihe

Bishọp na-eji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja maka ime baptizim ndị otù ndekọihe gbara afọ 8 na ngalaba ukwu. Ụmụntakịrị ndị a kwesịrị ka e mee ha baptizim ma mee ha onye otù n’ụbọchị, ma ọ bụ ozugbo ụbọchi ọmụmụ afọ 8 ha gasịrị dị ka o siri bụrụ ezi uche (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:27). Ndị a bụ ụmụntakịrị ndị ndekọihe nke ịbụ ndị otù Nzukọ nsọ adịlaarịị (lee 33.6.2). Mgbe ha ruru afọ 8, bishọp na-ahụ na ha nwere ohere niile iji nabata ozi ọma ma mee baptizim ma mee onye otù.

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ na-agba ụmụntakịrị ndekọihe ajụjụ ọnụ maka baptizim na Emume Nnabata. Nkuzi niile dị niime 31.2.3.1.

Maka ozi banyere ideju Ndekọihe Baptizim na Emume Nnabata, lee 18.8.3.

18.7.1.2

Ndị Atọghatara atọghata

Onyeisi mishọn ji ọtụghe niile nke ime ndị atọghatara atọghata baptizim niime mishọn. Niihi Ebumnoobi nke a, ndị mgbasa ozi uju oge na-agba ndị atọghatara atọghata ajụjụ ọnụ maka baptizim na Emume Nnabata.

18.7.2

Ofufe niile nke Baptizim

Ofufe baptizim kwesịrị ịdị mfe, nkenke, ma n’akpali ime mmụọ. O nwere ike gụnye ndị a sotere:

  1. Egwu tupu mbido

  2. Nkenke nnabata site n’aka nwanne nwoke onye na-atụziaka na ofufe ahụ

  3. Otu abụ na ekpere mmepe

  4. Otu ma ọ bụ ozi abụọ banyere isiokwu niile nke ozi ọma, dị ka baptizim na onyinye nke Mmụọ Nsọ

  5. Nhọrọ egwu dị iche iche

  6. Baptizim ahụ

  7. Oge nkwanye ugwu ebe ndị ahụ sonyere na baptizim na-eyigharị uwe akọrọ (abụ ma ọ bụ ukwe Praịmarị ka enwere ike ịkpọ ma ọ bụ kwee n’oge nke a)

  8. Emume Nnabata nke ndị otù ndekọihe gbara afọ 8; Emume Nnabata nke ndị atọghatara atọghata ma ọ bụrụ ma bishop kpebie (lee 18.8)

  9. Nkwupụta ịgba ama niile site n’aka ndị atọghatara atọghara ọhụrụ, ọ bụrụ ma achọrọ

  10. Otu abụ na ekpere mmechi

  11. Egwu mgbe emechiworo

Mgbe otu nwata ndekọihe na-akwado ime baptizim, onye otù otu bishọp na otu ndịisi Praịmarị na-enye ndụmọdụ ha na ezi na ụlọ ahụ iji tụọ atụmatụ ma hazie ofufe maka baptizim. Onye otù otu bishọp na-atụzi aka na-ofufe ahụ. Ọ bụrụ ma ọ karịa otu nwata ga-eme baptizim niime otu ọnwa ahụkwa, ha nwere ike mekọọ otu ofufe baptizim.

Na stek nwere ọtụtụ ụmụntakịrị ndekọihe, ụmụntakịrị sitere na ọtụtụ ngalaba ukwu nwere ike mekọọ otu ofufe baptizim. Onye otù ndịisi stek ma ọ bụ onye ndụmọdụ dị elu enyere ọrụ na-eduzi n’ofufe ahụ.

Baptizim nke onye otù ezi na ụlọ ekwesịghị ka egbuo oge na ya tutu ruo mgbe nna nwere ike ịnata ọkwa nchụaja ma mee baptizim ahụ n’onwe ya.

N’okpuru nduzi nke otu bishọp, onye ndu mishọn ngalaba ukwu (ọ bụrụ na enwere onye akpọrọ) ma ọ bụ onye otù nke otu ndịisi kworum ndị okenye onye na-edu ọrụ mgbasa ozi ọma niime ngalaba ukwu na-atụ atụmatụ ma duzie ofufe nke baptizim niile maka ndị atọghatara atọghata. Ha na ndị mgbasa ozi ọma uju oge na-ahazi ya.

18.7.3

Onye Na-eme Emume nsọ ahụ

Emume nsọ nke baptizim ka onye nchụaja ma ọ bụ onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek na-eme. Onye ahụ na-eme baptizim ka bishọp ga-enyerịrị nkwado (ma ọ bụ site n’aka onyeisi mishọn ma ọ bụrụ ma onye mgbasa ozi ọma uju oge na-eme baptizim ahụ).

Bishọp nwere ike kwe onye nna bụ onye nchụaja ma ọ bụ Onye ji Ọkwa nchụaja Melkizedek ime nwa ya baptizim ọbụrụgodu na nna ya etozubeghị oke tempụl n’uju (lee 18.3). Ndị bishọp na-agba ndị nna ume ikwadebe onwe ha ime ụmụ nke ha onwe ha baptizim.

18.7.4

Ebe A Ga-eme Emume nsọ ahụ

Baptizim niile ka ekwesịrị ime na fọntụ baptizim ọ bụrụ ma otu dịrị. Ọ bụrụ ọ dịghị fọntụ enwere, iyi nwere nchekwa ka enwere ike iji.

Maka nchekwa, otu dimkpa nwere uche aghaghị ịnọ mgbe a na-agbaju fọntụ mmiri ma nọrọ tutu ya agbapụchaa, ehichaa ya, ma chekwaa ya. Ekwesịrị ịgbapụ fọntụ ahụ mmiri ngwa ngwa emesịrị ofufe baptizim ọbụla. Ọnụ ụzọ niile gawara na fọntụ ahụ kwesịrị ka agbachie ya mgbe ọ na-anọghị n’ọrụ.

18.7.5

Iyi uwe

Onye nke na-eme baptizim na onye nke a na-eme baptizim na-eyi uwe ọcha nke na-anaghị ahụ ụzọ mgbe ọ dị mmiri mmiri. Onye nataworo onyinye dị nsọ na-eyi gament tempụl n’okpuru uwe nke a mgbe ọ na-eme baptizim. Ngalaba ndị dị n’obodo na-azụ uwe baptizim site na ego mmefu niile ma anaghị ana ego maka iji ya eme ihe.

18.7.6

Ndị Akaebe

Ndị aka ebe abụọ, nke onye ndu nduzi kwadoro, na-eleba anya na baptizim ọbụla iji hụ na emeziri ya nke ọma. Ndị otù Nzukọ nsọ mere baptizim, tinyekwara ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa, nwere ike jee ozi dị ka ndị aka ebe.

Aga emegharịrị baptizim ma ọ bụrụ ma ekwuzighị okwu niile kpọm kwem otu esi nye na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:73. Aghaghị imegharịkwa ya ma ọ bụrụ ma akụkụ ahụ, ntụtụ isi, ma ọ bụ uwe nke onye ahụ erukpughị niime mmiri kpam kpam.

18.7.7

Nkuzi niile

Ime emume nsọ nke baptizim, onye nchụaja ma ọ bụ onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek:

  1. N’eguzoro niime mmiri ya na onye ahụ a na-eme baptizim.

  2. Na-ejide nkwojiaka nri nke onye ahụ na-aka ekpa ya (maka ndirimfe na nchekwa). Onye ahụ a na-eme baptizim na-ejide nkwojiaka ekpa nke onye ahụ ji ọkwa nchụaja jiri aka nri ma ọ bụ aka ekpa ya.

  3. Na-eweli ogweaka nri ya na sụkwịa.

  4. Na-ekwupụta aha nke onye ahụ n’uju na asị, “Ebe m nwere ikike e nyere m site na Jizọs Kraịst, e mee m gị baptizim n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. Amen” (Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 20:73).

  5. Mee ka onye ahụ jide imi ya site na aka nri ya (maka ndirimfe); mgbe ahụ tụkwasị aka nri ya elu na azụ onye ahụ ma rukpuo onye ahụ niime mmiri kpam kpam, tinyekwara uwe.

  6. Na-enyere onye ahụ aka si na mmiri pụta.

18.8

Emume Nnabata na Onyinye nke Mmụọ Nsọ

Mgbe emesịrị mmadụ baptizim, a na-eme ya onye otù nke Nzukọ nsọ ma ya anta Onyinye nke Mmụọ Nsọ site n’ịbịakwasị aka n’elu isi (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:41; Ọrụ 19:1-6). Onye ahụ na-aghọzi onye otù nke Nzukọ nsọ mgbe emesịrị emume nsọ abụọ ndị a kpam kpam ma erekọdụọ ya nke ọma (lee Jọn 3:5; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33:11; 3 Nefi 27:20).

Bishọp na-elekọta emume ngosi nke Emume Nnabata niile. A na-emekarị ụmụntakịrị gbara afọ 8 onye otù n’ụbọchi ahụkwa e mere ha baptizim. Ndị atọghatara atọghata ka a na-emekarị onye otù na nzukọ oriri nsọ ọbụla dị na ngalaba ukwu ebe ha bi, kachasị mma n’ụbọchi Sọnde mgbe emesịrị baptizim ha.

Onye otù bishọp na-esoro ntuziaka niile dị na 29.2.1.1 mgbe a na-anabata ndị otù ọhụrụ.

18.8.1

Onye Na-eme Emume nsọ ahụ

Naanị onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek onye tozuru oke tempụl nwere ike ịbụ onye ga-ekwu okwu maka Emume Nnabata. Kosiladị, bishọp nwere ike kwe onye nna ji ọkwa nchụaja Melkizedek iguzoro na okirikiri ahụ maka Emume Nnabata nke nwa ya ọbụna ọ bụrụ ma nna ahụ etozughị oke tempụl n’uju (lee 18.3).

Opekampe otu onye otù bishọp na-esonye na emume nsọ nke a. Mgbe ndị mgbasa ozi ọma okenye kuziwooro onye atọghatara atọghata ihe, bishọp na-akpọku ha isonye.

18.8.2

Nkuzi niile

N’okpuru ntuziaka nke otu bishọp, otu onye ma ọ bụ karịa ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike sonye niime Emume Nnabata. Ha na-abịakwasị aka ha ebe ọ dị mfe n’elu isi nke onye ahụ Mgbe ahụ onye nke na-eme dị ka olu:

  1. Na-akpọ onye ahụ na aha ya n’uju.

  2. N’ekwupụta na a na-eme emume nsọ ahụ site n’ikike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek.

  3. Mee onye ahụ onye otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a.

  4. Na-ekwupụta “nara Mmụọ Nsọ” (ọ bụghị “nara onyinye nke Mmụọ Nsọ”).

  5. Na-enye okwu niile nke ngọzi dị ka Mmụọ si duo.

  6. Mechie n’aha Jizọs Kraịst.

18.8.3

Ndekọihe na Asambodo nke Baptizim na Emume Nnabata

Tupu agbaa otu nwata bụ onye otù ndekọihe ajụjụ ọnụ maka baptizim, klak na-eji LCR iji kwadoo Fọm Baptizim na Emume Nnabata. Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ na-edu na-ịgba ajụjụ ọnụ ahụ ma bịanye aka na fọm ahụ. Mgbe emesịrị baptizim na Emume Nnabata, klak na-eji fọm nke a iji depụta n’uju ndekọihe ịbụ onye otù nke nwata ahụ niime LCR.

Mgbe onye mgbasa ozi ọma uju oge gbara onye atọghatara atọghata ajụjụ ọnụ maka baptizim, ọ na-edejupụta Ndekọihe Baptizim na nke Emume Nnabata jiri app Akwụkwọ Atụmatụ Mpaghara (ABP). Mgbe emesịrị baptizim na Emume Nnabata, ndị mgbasa ozi ọma na-edeba ozi niime ABP ma nyefee ya n’aka klak ngalaba ukwu site n’ụzọ eletrọniki. Klak ngalaba ukwu na-enyocha ozi dị niime LCR ma kepụta ndekọihe ịbụ onye otù ahụ.

Mgbe ekewapụtasịrị ndekọihe nke ịbụ onye otù, klak na-akwado Asambodo Baptizim na Emume Nnabata. Asambodo nke a ka bishọp n’abịanye aka ma enye ya onye ahụ.

Aha dị na ndekọihe ịbụ onye otù na asambodo ahụ kwesịrị ịdaba adaba na asambodo ọmụmụ, ndekọaha ọmụmụ obodo, ma ọ bụ aha ugbua iwu kwadoro.

18.9

Oriri Nsọ

Ndị otù Nzukọ nsọ na-ezukọ n’ụbọchi Izuike ife Chineke ofufe ma rie oriri nsọ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:75; 59:9; Moronaị 6:5-6). N’oge emume nsọ nke a, ha na-eri achịcha na mmiri iji cheta aja nke Onye Nzọpụta nke anụ ahụ na ọbara Ya na imegharị ọhụrụ ọgbụgba ndụ ha niile dị nsọ (lee Matiu 26:26–28; Ntụgharị asụsụ Josef Smith, Mak 14:20-25; Luk 22:15-20; 3 Nefi 18; Moronaị 6:6).

18.9.1

Nkwado nye Inye Oriri Nsọ

Bishọp ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja maka oriri nsọ niime ngalaba ukwu. Ndị niile sonyere na nkwadebe, ngọzi, na ibugharị oriri nsọ ga-anatarịrị nkwado site n’aka ya ma ọ bụ onye nọ n’okpuru ntuziaka ya.

18.9.2

Onye Na-eme Emume nsọ ahụ

  • Ndị nkuzi, ndị nchụaja, na ndị ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike kwadebe oriri nsọ.

  • Ndị nchụaja na ndị ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike gọzie oriri nsọ.

  • Ndị dikọn, ndị nkuzi, ndị nchụaja, na ndị ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike bugharịa oriri nsọ.

18.9.3

Ntuziaka niile maka Oriri Nsọ

Nihi ọdịdị dị nsọ nke oriri nsọ, ndị ndu ọkwa nchụaja kwesịrị ịkpachapụ anya mee nkwado ka ọ dịrị n’usoro na nkwanye ugwu.

Ndị ahụ na-enye oriri nsọ kwesịrị ime otu ahụ n’omume nwere nkwanye ùgwù, na-aghọta na ha na-anọchite anya Onyenwe anyị.

Ibugharị oriri nsọ kwesịrị ịdị mfe na-abụghị nke gabigara ókè.

Na-agbanyeghị na oriri nsọ bụ maka ndị otù nke Nzukọ nsọ, enweghị ihe a ga-eme iji gbochie ndị ọzọ site n’iri ya.

18.9.4

Nkuzi niile

  1. Ndị ahụ na-akwado, agọzi, ma ọ bụ na-ebugharị oriri nsọ n’ebu ụzọ jiri ncha ma ọ bụ ihe nsacha ọzọ saa aka ha.

  2. Ndị nkuzi, ndị nchụaja, ma ọ bụ ndị ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek na-agba mbọ hụ na efere achịcha etinyere achịcha ana agbajibeghị, efere mmiri nwere iko nke mmiri dị ọcha dị niime ya, na akwa okpokoro ndị dị ọcha ka edebere n’ọnọdụ ya tupu nzukọ ahụ.

  3. Dị ka ndị otù ngalaba ukwu na-abụ abụ oriri nsọ, ndị ahụ ga-agọzi oriri nsọ n’eguzo na nkwanye ugwu, wepụ akwa nke kpuchiri efere achịcha niile, ma tubisie achịcha ahụ ka ọ dị mfe ịta.

  4. Mgbe abụsịrị abụ, onye nke na-agọzi achịcha ahụ n’esekpuru ma kpee ekpere oriri nsọ maka achịcha ahụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77).

  5. Bishọp na agba mbọ hụ na ekpere oriri nsọ niile ka ekwupụtara n’ụzọ doro anya, dị ka esi chọọ, ma na nkwanye ugwu. Ọ bụrụ ma mmadụ kwuhie ọnụ na mkpụrụ okwu ahụ ma gbazie onwe ya, ọdịghị mgbazi ọzọ a chọrọ. Ọ bụrụ ma onye ahụ agbazighị nkwuhie ya, bishọp na-arịọ ya n’obiọma ikpegharị ekpere ahụ.

  6. Mgbe ekpere gasịrị, ndị ji ọkwa nchụaja na nkwanye ugwu n’ebugharị achịcha nye ndị otù. Onye ndu nduzi na-ebu ụzọ anata, nke ahụ gasịa enweghịzi usoro ime ihe dị adị. Ozugbo enyere ndị otù efere, ha nwere ike bufeere ya otu onye n’ibe ya.

  7. Ndị otù na-eji aka nri ha eri mgbe o kwere omume.

  8. Mgbe ebugharịsiworo achịcha nye ndị otù niile, ndị ahụ na-ebugharị oriri nsọ na-ebughachi efere niile ahụ na okpokoro oriri nsọ Ndị ahụ na-agọzi oriri nsọ na-atụkwasị akwa n’elu efere achịcha niile ma kpughee efere mmiri niile.

  9. Onye nke na-agọzi mmiri n’esekpuru ma kpee ekpere oriri nsọ maka mmiri aahụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:79). Ọ na-eji mkpụrụ okwu mmiri dochie maka mmanya.

  10. Mgbe ekpere gasịrị, ndị ji ọkwa nchụaja na nkwanye ugwu n’ebugharị mmiri nye ndị otù. Onye ndu nduzi na-ebu ụzọ anata, nke ahụ gasịa enweghịzi usoro ime ihe dị adị.

  11. Mgbe ebugharịsiworo mmiri nye ndị otù niile, ndị ahụ na-ebugharị oriri nsọ na-ebughachi efere niile na okpokoro oriri nsọ Ndị ahụ gọziri oriri nsọ na-atụkwasị akwa n’elu efere niile, ma ndị ahụ gọziri ma bugharịa oriri nsọ na nkwanye ugwu na-ewere oche ha.

  12. Mgbe nzukọ gasịrị, ndị ahụ kwadoro oriri nsọ na-ehichapụ, pịa akwa okpokoro niile, ma wepụ achịcha ọbụla a na-erighị.

18.10

Inyefe Ọkwa Nchụaja na Ichi Echichi baa n’Ọkwa ọrụ

E nwere nkewa abụọ nke ọkwa nchụaja: Nke Erọn na Melkizedek (lee 3.3; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:1, 6). Mgbe enyefere mmadụ ọkwa nchụaja, a nakwa echi ya echichi n’otu ọkwa niime ọkwa nchụaja ahụ. Mgbe enyefesịrị otu niime ọkwa nchụaja ndị a, ekwesịrị naanị ichi nwoke ahụ echichi n’ọkwa ndị ọzọ dị n’ọkwa nchụaja ahụ.

18.10.1

Ọkwa Nchụaja Melkizedek

Onyeisi stek ji ọtụghe niile nke Ọkwa nchụaja maka inyefe Ọkwa Nchụaja Melkizedek na ichi echichi ruo n’ọkwa ọrụ niile nke okenye na onyeisi nchụaja. Kosiladị, bishọp na-ewetekarị ntụpụta uche maka ichi echichi ndị a.

18.10.1.1

Ndị Okenye

Ụmụnne ndị nwoke tozuru oke nwere ike nata Ọkwa Nchụaja Melkizedek ma echie ha echichi mgbe ha gbara afọ 18 ma ọ bụ karịa. Dị ka ọnọdụ niile nke mmadụ siri dị, bishọp na-ekpebi ma onyeikom nta o kwesịrị ka akwagide ya ka echie ya echichi okenye ngwangwa ọ gbara afọ 18 ma ọ bụ ka nọtụkwuo na kworum ndị nchụaja.

Na ime mkpebi nke a, bishọp n’ebu ụzọ chọọ ndụmọdụ ya na onyeikom nta ahụ na ndị nne na nna ya ma ọ bụ ndị nlekọta ya. Ndịikom tozuru oke kwesịrị ka echie ha okenye n’afọ 19 ma ọ bụ tupu ha esi n’ụlọ pụọ ma gawa kọlege, jee ozi mishọn uju oge, jee ozi n’otu ndị agha, ma ọ bụ nara ọrụ uju oge.

Ndịikom emere baptizim na nsonso a gbara afọ 18 ma karịa ka a na-echi ndị okenye mgbe ha:

  • Nataworo Ọkwa Nchụaja nke Erọn ma jee ozi dị ka ndị nchụaja.

  • Nweteworo nghọta nke ozi ọma n’uju.

  • Gosipụtaworo ntozu oke ha.

Enweghị oge akpọrọ aha a chọrọ dị ka onye otù Nzukọ nsọ.

18.10.1.2

Ndịisi Nchụaja

Ndịikom ka a n’echi echichi ndịisi nchụaja mgbe akpọrọ ha n’otu ndịisi stek, kansụl dị elu, ma ọ bụ otu bishọp.

18.10.1.3

Ịgba ajụjụ ọnụ na Ịkwado

Site na nkwado nke otu ndịisi stek, bishọp na-agba nwanne nwoke ahụ ajụjụ ọnụ dị ka akụziri na Ndekọihe Echichi Ọkwa Nchụaja Melkizedek. Mgbe ahụ onye otù nke otu ndịisi stek nakwa agba ya ajụjụ ọnụ. Site na nkwado nke onyeisi mishọn, onyeisi distrikt nwere ike gbaa otu nwanne nwoke ajụjụ ọnụ iji chie ya okenye (lee 6.3).

18.10.2

Ọkwa Nchụaja nke Erọn

Bishọp ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja maka inyefe Ọkwa Nchụaja nke Erọn na ichi echichi ruo n’ọkwa niile nke dikọn, onye nkuzi, na onye nchụaja. Ụmụnne ndị nwoke tozuru oke ka a na-echikarị echichi baa n’ọkwa ọrụ ndịị a n’afọ ndị a sotere, mana ọ bụghị mgbe ọ na-erubeghi:

  • Dikọn na mmalite nke afọ ha ga-agba 12

  • Onye nkuzi na mmalite nke afọ ha ga-agba 14

  • Onye nchụaja na mmalite nke afọ ha ga-agba 16

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ na-agba ndị ahụ a ga-echi echichi dikọn ma ọ bụ ndị nkuzi ajụjụ ọnụ iji kpebie ọ bụrụ ma ha akwadowo niime mmụọ. Bishọp na-agba ụmụnne ndị nwoke ndị a ga-echi echichi ndị nchụaja ajụjụ ọnụ.

Tupu ịgba onyeikom nta ajụjụ ọnụ maka echichi ọkwa nchụaja, onye otù nke otu bishọp na-anata ikike site n’aka ndị nne na nna ma ọ bụ ndị nlekọta nke onyeikom nta ahụ. Ọ bụrụ ma ndị nne na nna ahụ agbawo alụkwaghịm, ọ na-anata ikike site n’aka nne ma ọ bụ nna enyere ikike nlekọta iwu kwadoro.

18.10.3

Igosi onye otù ka A Kwadoo tupu E Chie Ya Echichi

Mgbe agbasịrị nwanne nwoke ajụjụ ọnụ ma chọpụta na o tozuru oke ichi echichi baa ọkwa n’ọkwa ọrụ ọkwa nchụaja, a na-akpọpụta ya maka nkwado (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:65-67). Ụmụnne ndị nwoke a ga-echi echichi ndị okenye ma ọ bụ ndịisi nchụaja ka onye otù otu ndịisi stek na-akpọpụta na nzukọ zuruọha ọgbakọ stek (lee 6.3 maka nkuzi niile maka ndịisi distrikt). Ụmụnne ndị nwoke a ga-echi echichi dikọn, ndị nkuzi, ma ọ bụ ndị nchụaja ka onye otù otu bishọp na-akpọpụta na nzukọ oriri nsọ.

Onye na-eduzi nkwado ahụ na-arịọ nwanne nwoke ahụ ka o guzoro. Ọ na-ama ọkwa ntụpụta inyefe Ọkwa Nchụaja nke Erọn ma ọ bụ Ọkwa Nchụaja Melkizedek (ọ bụrụ ma a chọọ) na ichi nwanne nwoke ahụ echichi baa n’ọkwa ọrụ nke ọkwa nchụaja ahụ. Ọ na-akpọku ndị otù ikwado ntụpụta ahụ. N’ịmaatụ, ịkpọpụta otu nwanne nwoke ka echie ya echichi onye okenye, o nwere ike iji mkpụrụokwu ndị dị ka ndị a:

Anyị na-atụpụta ka [aha] nata Ọkwa Nchụaja Melkizedek ma e chie ya onye okenye. Ndị ahụ ọ masịrị nwere ike gosi ya site na-iweli aka elu. [Kwụsitụ obere oge.] Ndị ahụ megidere, ọ bụrụ n’enwere onye ọbụla, nwekwara ike gosi ya. [Kwụsitụ obere oge.]

Ọ bụrụ ma onye otù na-arụsị ọrụ ike megide echichi ahụ, onye ndu nduzi ma ọ bụ onye ndu ọkwa nchụaja ọzọ e nyere ọrụ na-ezukọta ya na ya na nzuzo mgbe emechara nzukọ. Onye ndu ahụ na-achọ ịghọta ihe kpatara onye otù ahụ ji megide ya. Ọ na-amụta ma onye otù ahụ ọ maara maka agwa nke nwere ike ịkwada onye ahụ site n’ichi ya echichi baa n’ọkwa ọrụ ọkwa nchụaja.

N’ọnọdụ ụfọdụ, otu nwanne nwoke nwere ike nwee mkpa ichi ya echichi onye okenye ma ọ bụ onyeisi nchụaja tupu e nwee ike kpọpụta ya na ọgbakọ stek. Mgbe nke a mere, a na-akpọpụta ya na nzukọ oriri nsọ ngalaba ukwu ya maka nkwado. Mgbe ahụ a na-akpọpụta ya n’ọgbakọ stek ọzọ iji kwadoo echichi ahụ (n’esoro usoro maka nkwado, akọwara n’elu).

18.10.4

Onye Na-eme Emume nsọ ahụ

Onyisi stek ma ọ bụ onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek n’okpuru ntuziaka ya nwere ike chie otu nwoke echichi ruo na ọkwa nke okenye. Site na nkwado nke onyeisi mishọn, onyeisi distrikt ma ọ bụ onye nọ n’okpuru ntuziaka ya nwere ike mee echichi ahụ (lee 6.3). Naanị ndị ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike iguzoro n’okirikiri.

Onyeisi stek ma ọ bụ onyeisi nchụaja n’okpuru ntuziaka ya nwere ike chie otu nwoke echichi baa na ọkwa ọrụ nke onyeisi nchụaja. Naanị ndịisi nchụaja nwere ike iguzoro n’okirikiri.

Onye nke na-echi mmadụ echichi baa na ọkwa Ọkwa Nchụaja kwesịrị ịtozu oke tempụl. Onyeisi stek ma ọ bụ onye ọ họpụtara ga-anọrịrị mgbe ahụ.

Onye nchụaja ma ọ bụ onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike chie otu nwanne nwoke echichi baa n’ọkwa nke dikọn, onye nkuzi, ma ọ bụ onye nchụaja. A ga-enyerịrị ya ikike site n’aka bishọp. Bishọp ma ọ bụ onye ọ họpụtara ga-anọrịrị mgbe ahụ.

Isonye n’echichi nke Ọkwa Nchụaja nke Erọn, mmadụ ga-eburịrị ụzọ bụrụ onye nchụaja ma ọ bụ onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek.

Bishọp nwere ike kwe onye nna bụ onye nchụaja ma ọ bụ Onye ji Ọkwa nchụaja Melkizedek ichi nwa ya nnnnwoke echichi baa n’ọkwa nke dikọn, onye nkuzi, ma ọ bụ onye nchụaja ọbụna ọ bụrụ ma nna ya etozughị oke tempụl n’uju (lee 18.3). Ndị bishọp na-agba ndị nna ume ikwadebe onwe ha ichi ụmụ ha ndị nwoke echichi.

18.10.5

Nkuzi niile

Inyefe ọkwa nchụaja ma chie mmadụ echichi baa n’ọkwa ọrụ ọkwa nchụaja, otu onye ma ọ bụ karịa enyere ikike ji ọkwa nchụaja na-atụkwasị aka ha n’ụzọ dị mfe n’elu isi nke onye ahụ. Mgbe ahụ onye nke na-eme dị ka olu:

  1. Na-akpọ onye ahụ na aha ya n’uju.

  2. N’ekwupụta ikike o ji n’onwe ya iji mee emume nsọ ahụ (ma ọ bụ Ọkwa Nchụaja nke Erọn ma ọ bụ Ọkwa Nchụaja Melkizedek)

  3. Nyefee Ọkwa Nchụaja nke Erọn ma ọ bụ Ọkwa Nchụaja Melkizedek, ọ gwụla ma enyefewo ya rịị.

  4. Chie onye ahụ echichi n’ọkwa ọrụ dị niime Ọkwa Nchụaja nke Erọn ma ọ bụ Ọkwa Nchụaja Melkizedek ma na-enye ikike niile, ike niile, na ikikere nke ọkwa ọrụ ahụ.

  5. Na-enye okwu niile nke ngọzi dị ka Mmụọ si duo.

  6. Mechie n’aha Jizọs Kraịst.

Ichi mmadụ echichi baa na ọkwa ọrụ nke ọkwa nchụaja mgbe enyefewosịrị ya rịị ọkwa nchụaja dabara adaba, onye ahụ na-echi echichi ahụ na-ahapụ nzọụkwụ nke 3.

18.10.6

Ndekọihe na Asambodo nke Ichi echichi

Tupu a gbaa nwanne nwoke ajụjụ ọnụ ka echie ya echichi na ọkwa ọrụ dị niime Ọkwa Nchụaja nke Erọn, otu klak na-eji LCR iji kwadoo Ndekọihe Echichi Ọkwa Nchụaja nke Erọn. Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ na-ahụ maka ịgba ajụjụ ọnụ ahụ ma bịanye aka na fọm ahụ ma ọ bụrụ ma ọnọdụ ntozu oke niile ka e zutere.

Mgbe echichi ahụ gasịrị, bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ya ahọpụtara na-edezu fọm ahụ ma nye ya klak. Ọ na-edeba echichi ahụ niime LCR ma kwadoo asambodo echichi.

Aha nke onye ahụ dị ka ọ dị n’iwu ugbua ka e kwesịrị ide na ndekọihe na asambodo echichi ahụ.

18.11

Idopụ Iche ndị otù Ije ozi N’ọkpụkpọ okù niile

Ndị otù akpọrọ ma kwadoo n’ọtụtụ ọkwa nke Nzukọ nsọ kwesịrị ka edopụ ha iche ije ozi n’ọnọdụ ahụ (lee Jọn 15:16; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:11; lee kwa 3.4.3.1 niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a) N’oge ndopụ iche ahụ, a na-enye onye ahụ (1) ikikere ime ihe n’ọkpụkpọ okù ahụ na (2) okwu ngọzi niile dị ka Mmụọ si duo.

Ndịisi stek, ndị bishọp, na ndịisi kworum na-anata ọtụghe niile nke otu ndịisiisi mgbe edopụrụ ha iche (lee 3.4.1.1). Kosiladị, mkpụrụokwu ahụ ọtụghe niile ka a na-ekwesịghị ikwu mgbe a na-edopụ ndị otù iche ije ozi n’ọkpụkpọ okù ndị ọzọ, tinyekwara ndị ndụmọdụ nọ n’otu ndịisi.

18.11.1

Onye Na-eme Ndopụ Iche ahụ

Idopụ iche ka onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek na-eme Ọ ga-anatarịrị nkwado site n’aka onye ndu ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja dabara adaba. Ndị ahụ enyere ikike ime ndopụ iche ka akpọrọ na 30.8. Onye okenye ekwesịghị ịbụ onye na-ekwu okwu ma ọ bụ guzoro n’okirikiri mgbe a na-edopụ nwoke iche na ọkwa nke kwesịrị ime ya ọkwa onyeisi nchụaja.

N’okpuru ntuziaka nke onye ndu na-eduzi, otu onye ma ọ bụ karịa ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike sonye na idopụ iche. A na-edopụ ndịisi iche n’ihu ndị ndụmọdụ ha.

Onye ndu nduzi nwere ike kwe dị ma ọ bụ onye nna ji ọkwa nchụaja Melkizedek iguzoro na okirikiri ahụ maka idụ iche nke nwunye ya ma ọ bụ ụmụ ya ọbụna ọ bụrụ na o tozughị oke tempụl n’uju (lee 18.3).

18.11.2

Nkuzi niile

Otu onye ma ọ bụ karịa ndị ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek enyere ikikere na-atụkwasị aka ha n’ụzọ dị mfe n’elu isi nke onye ahụ. Mgbe ahụ onye nke na-eme dị ka olu:

  1. Na-akpọ onye ahụ na aha ya n’uju.

  2. N’ekwupụta na ọ na-eme site n’ikike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek.

  3. Dopụ onye ahụ iche n’ọkpụkpọ okù dị na stek, ngalaba ukwu, kworum, ma ọ bụ klas.

  4. Nyefee ọtụghe niile ma ọ bụrụ ma onye ahụ kwesịrị ịnata ha.

  5. Na-enye mkpụrụ okwu niile nke ngọzi dị ka Mmụọ si duo.

  6. Mechie n’aha Jizọs Kraịst.

18.12

Ido Mmanụ nsọ

Ndị ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek ga-edorịrị mmanụ oliv nsọ tupu eji ya tee onye ọrịa ma ọ bụ onye ihe na-akpagbu (lee Jemis 5:14). Enweghị mmanụ ọzọ enwere ike iji mee ihe.

Ndị otù ekwesịghị ira mmanụ e doro nsọ ma ọ bụ tee ya n’akụkụ ahụ nwere nsogbu.

18.12.1

Onye Na-eme Emume nsọ ahụ

Otu onye ma ọ bụ karịa ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike ido mmanụ nsọ. Ọdịghị mkpa na ha ga-arịọ nkwado site n’aka onye ndu ọkwa nchụaja.

18.12.2

Nkuzi niile

Ido mmanụ nsọ, onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek:

  1. Na-ejide mkpọ mmanụ oliv ghe oghe.

  2. Na-agwa Nna nke Eluigwe okwu dị ka n’ekpere.

  3. N’ekwupụta na ọ na-eme ihe site n’ikike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek.

  4. Doo mmanụ ahụ nsọ (ọ bụghị mkpọ ya) ma dopụ ya iche maka ite mmanụ na ngọzi onye ọrịa na onye ihe na-akpagbu.

  5. Mechie n’aha Jizọs Kraịst.

18.13

Inye onye Ọrịa ngọzi

Inye onye ọrịa ngọzi “site n’ịtụkwasị aka n’isi” nwere akụkụ abụọ: otite mmanụ jiri mmanụ na nrachi nke otite mmanụ site na-inye ngọzi. Ọ bụrụ ma mmanụ e doro nsọ adịghị, e nwere ike nye ngọzi site n’ikike nke Ọkwa Nchụaja Melkizedek n’enweghị otite mmanụ.

18.13.1

Onye Na-enye Ngọzi

Naanị ndị tozuru oke ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike inye onye ọrịa ma ọ bụ onye ihe na-akpagbu ngọzi. Ọdịghị mkpa na ha ga-arịọ nkwado site n’aka onye ndu ọkwa nchụaja. Ọ bụrụ ma o kwe omume, onye nna ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek ga-enye ndị otù ezi na ụlọ ya nọ na ọrịa ngọzi.

Dị ka o si adịkarị, mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek na-enye onye ọrịa ngọzi. Kosiladị, otu onye nwere ike mee ma otite mmanụ ma nrachi.

18.13.2

Nkuzi niile

Otite mmanụ ka otu onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek na-eme. Ya:

  1. Atụsa otu kpọm nke mmanụ e doro nsọ n’elu isi nke onye ahụ.

  2. Tụkwasị aka ya n’ụzọ dị mfe n’elu isi nke onye ahụ ma kpọọ onye ahụ n’aha ya n’uju.

  3. N’ekwupụta na ọ na-eme ihe site n’ikike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek.

  4. Na-ekwu na ya na-ete ya mmanụ nke e doworo nsọ maka otite mmanụ na ngọzi nke onye ọrịa na onye ihe na-akpagbu.

  5. Mechie n’aha Jizọs Kraịst.

Iji rachie otite mmanụ ahụ, otu onye ma ọ bụ karịa ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek na-atụkwasị aka ha n’ụzọ dị mfe n’elu isi nke onye ahụ. Mgbe ahụ onye nke na-arachi otite mmanụ ahụ:

  1. Na-akpọ onye ahụ aha ya n’uju.

  2. N’ekwupụta na ọ na-arachị otite mmanụ aahụ site n’ikike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek.

  3. Na-enye mkpụrụ okwu niile nke ngọzi dị ka Mmụọ si duo.

  4. Mechie n’aha Jizọs Kraịst.

18.14

Ngọzi Nkasi obi na Ndụmọdụ niile, Tinyekwara Ngọzi niile nke Nna

18.14.1

Onye Na-enye Ngọzi

Ndị ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike nye ngọzi nkasi obi niile ma dụọ ndị otù ezi na ụlọ ahụ ndụmọdụ na ndị ọzọ rịọrọ maka ha.

Onye nna ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike nye ụmụ ya ngọzi niile nke nna. Ndị nne na nna na-agba ụmụ ha ume ịrịọ ngọzi niile nke nna n’oge mkpa. Ngọzi niile nke nna ka e nwere ike ime rekọọdụ nihi iji mee ihe nke onwe.

Onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek ekwesịghị ịchọ nkwado site n’aka onye ndu ọkwa nchụaja iji nye ngọzi nke nkasị obi ma nye ndụmọdụ ma ọ bụ ngọzi nke onye nna.

18.14.2

Nkuzi niile

Na-inye ngọzi nkasi obi na ndụmọdụ ma ọ bụ ngọzi nke onye nna, otu onye ma ọ bụ karịa ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek na-atụkwasị aka ha n’ụzọ dị mfe n’elu isi nke onye ahụ. Mgbe ahụ onye nke na-eme dị ka olu:

  1. Na-akpọ onye ahụ na aha ya n’uju.

  2. N’ekwu na a na-enye ngọzi ahụ site n’ikike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek.

  3. Na-ekwu mkpụrụ okwu niile nke ngọzi, nkasi obi, na ndụmọdụ dị ka Mmụọ si duo.

  4. Mechie n’aha Jizọs Kraịst.

18.15

Ịrara Nye nke Ebe Obibi

Ndị otù Nzukọ nsọ nwere ike rara ebe obibi ha nye site n’ikike nke Ọkwa Nchụaja Melkizedek.

18.15.2

Nkuzi niile

Ịrara ebe obibi nye, onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek:

  1. Na-agwa Nna nke Eluigwe okwu dị ka n’ekpere.

  2. N’ekwupụta na ọ na-eme ihe site n’ikike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek.

  3. Rara nye ebe obibi dị ka ebe dị nsọ ebe Mmụọ Nsọ nwere ike ibi ma kwuo okwu ndị ọzọ dị ka Mmụọ si duo.

  4. Mechie n’aha Jizọs Kraịst.

18.16

Ịrara Nye nke Ala Ili

18.16.1

Onye Na-arara Ala ili nye

Onye nke na-arara ala ili nye kwesịrị iji Ọkwa Nchụaja Melkizedek ma enye ya ikike site n’aka onye ndu ji ọkwa nchụaja onye na-atụzi aka n’ofufe ahụ.

18.16.2

Nkuzi niile

Ịrara ala ili nye, onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek:

  1. Na-agwa Nna nke Eluigwe okwu dị ka n’ekpere.

  2. N’ekwupụta na ọ na-eme ihe site n’ikike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek.

  3. Rara nye ma doo nsọ ala ebe olili ahụ dị ka ebe ezumiike maka ahụ nke onye nwụrụ anwụ.

  4. Kpee ekpere ka ebe ahụ dị nsọ ma nwee nchekwa tutu ruo Mbilite N’ọnwụ (ebe ọ dabara adaba).

  5. Rịọ Nna nke Eluigwe inye ezi na ụlọ ahụ nkasị obi ma kwupụta echiche dị ka Mmụọ si duo.

  6. Mechie n’aha Jizọs Kraịst.

Ọ bụrụ na agbara ahụ nke onye otù ahụ ọkụ, onye ndu na-eduzi na-eji nghọta ya kpebie ma ọ ga-arara nye ebe edebere ntụ ahụ.

18.17

Ngọzi nke Onye Petrak

Onye otù ọbụla tozuru oke, mere baptizim nwere ikike ịnata ngọzị nke onye petrak, nke na-ewete ntuziaka mmụọ kwalitere si n’aka Nna nke Eluigwe (lee Jenesis 48:14–1649; 2 Nefi 4:3–11).

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ e nyere ọrụ na-agba ndị otù chọrọ ịnata ngọzi nke onye petrak ajụjụ ọnụ. Ọ bụrụ ma onye otù tozuru oke, onye na-agba ajụjụ ọnụ na-akwado Rekọmendị Ngọzi nke Onye Petrak. Ọ na-enyefe ya site na usoro Ngọzi nke Onye Petrak na ChurchofJesusChrist.org.

Onye ahụ na-enye Rekọmendị Ngọzi nke Onye Petrak na-ahụ na onye otù ahụ etowo nke ọma ịghọta mkpa na ọdịdị dị nsọ nke ngọzi ahụ.

18.17.1

Ịnata Ngọzi nke Onye Petrak

Mgbe anatasịrị rekọmendị, onye otù na-akpọtụrụ petrak ịhazi nzukọ ịnata ngọzi nke onye petrak. N’ụbọchi nke nzukọ ahụ, onye otù kwesịrị ịgakwuru onye petrak n’agwa ekpere na n’uwe Sọnde.

Ngọzi nke onye petrak ọbụla dị nsọ, dị nzuzo, ma bụrụ nke onwe. Ya mere, a na-enye ya ebe na-abụghị na ọha ewezuga maka ndị otù ezi na ụlọ ole ma ole nwere ike ịnọ ebe ahụ.

Onye nke na-anata ngọzi nke onye petrak kwesịrị iji okwu ya niile kpọrọ ihe, tulee ha, ma bie ndụ itozu oke iji nata ngọzi niile e kwere nkwa na ndụ nke a ma na mgbe ebighị ebi.

Ndị otù Nzukọ nsọ ekwesịghị iji ngọzị ha atụnyere nke ndị ọzọ ma ekwesịghị ikesa ha ewezuga nye ndị otù ezi na ụlọ dị n’obi. Ngọzi niile nke onye petrak ekwesịghị ka agụọ ya niime nzukọ niile nke Nzukọ nsọ ma ọ bụ n’ọgbakọ ọha.

Bipụta