Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
21. Ije ozi nlekọta


“21. Ije ozi nlekọta,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“21. Ije ozi nlekọta,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndịikom na-ebuli nkume

21.

Ije ozi nlekọta

21.0

Ndubata

Ije ozi nlekọta pụtara ijere ndị ọzọ ozi dị ka Onye Nzọpụta si mee (lee Matiu 20:26–28).

Onyenwe anyị chọrọ ka ndị otù Nzukọ nsọ Ya niile nata ụdị nlekọta a. N’ihi Ebumnoobi nke a, ndị ji ọkwa nchụaja ka a na-enye ọrụ dị ka ụmụnne nwoke n’eje ozi nlekọta nye ezi na ụlọ ndị otù ọbụla. Ụmụnne nwanyị n’eje ozi nlekọta ka a na-ekenyere dimkpa nwanne nwanyị ọbụla.

21.1

Oke na ọrụ niile nke Ụmụnne nwanyị na Ụmụnne nwoke n’Eje ozi nlekọta

Ụmụnne nwanyị na ụmụnne nwoke n’eje ozi nlekọta nwere oke na ọrụ ndị a sotere maka ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ ekenyere ha:

  • Nyere ha aka gbaa okwukwe ha ume niime Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ume.

  • Nyere ha aka kwadobe ime ma debe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ ha na Chineke mere dị ka ha na-anata emume nsọ niile.

  • Ghọta mkpa niile ma wete ịhụnaanya, nlekọta, na ije ozi yiri nke Kraịst.

  • Nyere ha aka nwete ndabere n’onwe niime mmụọ na nke anụ ahụ.

21.2

Ịhazi Ije ozi nlekọta

21.2.1

Ịhazi Inye Ọrụ

Otu ndịisi kworum ndị okenye na Otu ndịisi Enyemaka n’oke ekpere na-atule ọrụ niile nke ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị n’eje ozi nlekọta. Ha na-ekenyekarị ụmụnne nwoke abụọ ma ọ bụ ụmụnne nwanyị abụọ dị ka ndị nsiso. Ha na-achọ nkwado nke bishọp maka ọrụ niile na ndị nsiso nke ije ozi nlekọta.

E nwere ike kenye di na nwunye lụrụ alụ ijekọta ozi nlekọta nye otu mmadụ ma ọ bụ ezi na ụlọ.

Anaghị akpọ, tulie aka nkwado, ma ọ bụ dopụ iche ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị n’eje ozi nlekọta.

21.2.2

Ọrụ Ije ozi nlekọta enyere maka Ndị Ntoroọbịa

Otu onyeinyom nta nwere ike jee ozi dị ka onye nsiso ije ozi nlekọta nye otu nwanne nwanyị nke Otù Enyemaka mgbe onyeinyom nta ahụ dị njikere ma nwee ike. O nwere ike malite ije ozi n’afọ ọ ga-agba afọ 14.

Otu onyeikom nta na-eje ozi dị ka onye nsiso nye onye ji Ọkwa nchụaja Melkizedek mgbe echiri ya echichi n’ọkwa onye nkuzi ma ọ bụ onye nchụaja.

21.3

Ajụjụ ọnụ nke Ije ozi nlekọta

Onyeisi kworum ndị okenye na ndị ndụmọdụ ya na-agba ụmụnne nwoke ije ozi nlekọta ajụjụ ọnụ. Onyeisi Otù Enyemaka na ndị ndụmọdụ ya na-agba ụmụnne nwanyị ije ozi nlekọta ajụjụ ọnụ.

Ajụjụ ọnụ ndị a ka a na-eme opekampe otu ugboro kwa ọnwa atọ ọbụla.

Ebumnoobi ha bụ:

  • Ịdụ ndụmọdụ banyere ike niile, mkpa niile, na aka mgba niile nke ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ ekenyere ha.

  • Kparịta ụka ụzọ niile iji nyere ndị mmadụ aka kwadoo ịnata emume nsọ niile ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

  • Tulee otu kworum ndị okenye, Otù Enyemaka, kansụl ngalaba ukwu, na ndị ọzọ nwere ike isi nye aka.

  • Kuzie ma gbaa ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị ume ije ozi nlekọta.

21.4

Ịchịkwata Mbọ niile nke Ije ozi nlekọta

Otù ndịisi Otù Enyemaka na kworum ndị okenye na-ezukọ ọnụ opekampe otu ugboro kwa ọnwa atọ ọbụla. Ha na-enyochagharị ihe ha mataworo n’ajụjụ ọnụ ndị nke ije ozi nlekọta (lee 21.3). Ha nakwa achịkwata ọrụ niile nke ije ozi nlekọta.

Na ngalaba nwere ndị otù ole ma ole dị nkọ, otù ndịisi Otù Enyemaka na kworum ndị okenye nwere ike kpebie ịghara ikenye ma ụmụnne nwanyị ma ụmụnne nwoke ije ozi nlekọta nye ụfọdụ ndị otù.

Bipụta