Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
29. Nzukọ niile niime Nzukọ nsọ


“29. Nzukọ niile niime Nzukọ nsọ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“29. Nzukọ niile niime Nzukọ nsọ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
nne na nwaada nọ na nzukọ oriri nsọ

29.

Nzukọ niile niime Nzukọ nsọ

29.0

Ndubata

Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a na-ezukọta ọnụ ife ofufe, ịkwalite ibe ha elu, na ikuzi ihe ma mụọ ozi ọma (lee Alma 6:6; Moronaị 6:5–6). Onye Nzọpụta kwere nkwa, “Mgbe abụọ ma ọ bụ atọ gbakọrọ n’aha m, ebe ahụ ka M ga-anọ n’etiti ha” (Matiu 18:20). Izukọta ọnụ bụ otu ụzọ obi anyị nwere ike isi “jikọta ọnụ n’ịdị n’otu na n’ịhụnaanya” (Mozaya 18:21).

Kosiladị, ịdị na-eme nzukọ ekwesịghị ịnọchi ije ozi na ime nlekọta dị ka Jizọs Kraịst mere.

29.1

Ịtụ atụmatụ na Iduzi Nzukọ niile

Ndị ndu na-atụ atụmatụ ma na-eduzi nzukọ niile “dị ka eduru ha site na Mmụọ Nsọ, dị ka otu iwu nsọ niile na mkpughe niile nke Chineke siri dị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:45; leekwa Moronaị 6:9; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:2). Ha na-achọ ụzọ ndị esi akpọbata mmetụta nke Mmụọ na nzukọ ha.

Ndị ndu na-ahụ na ọnụọgụgụ na ogologo oge nke nzukọ niile anaghị ebunye ndị otù ma ọ bụ ndị ezi na ụlọ ha ibu arọ.

29.2

Nzukọ Ngalaba ukwu niile

29.2.1

Nzukọ Oriri nsọ

29.2.1.1

Ịtụ Atụmatụ Nzukọ Oriri nsọ

Otu bishọp na-atụ atụmatụ ma duzie nzukọ oriri nsọ. Ha na-ahụ na ebum n’obi nke nzukọ ahụ ga-abụ na oriri nsọ na mwulite okwukwe na Jizọs Kraịst.

Nzukọ oriri nsọ na-ewe otu awa. O nwere ike gụnye ndị a sotere:

  1. Egwu tupu mbido (lee 19.3.2 maka ntuziaka niile).

  2. Ekele na nnabata.

  3. Ịnakwere ndị nduzi ji ikike ma ọ bụ ndị ndu ndị ọzọ ndị na-abịa nleta.

  4. Ịma Ọkwa niile: Ekwesịrị idebe ihe ndị a n’ọhara pekarịchara mpe.

  5. Abụ na ekpere mmepe. Lee 19.3.2 na 29.6.

  6. Ọrụ Ngalaba ukwu na stek, dị ka ndị a sotere:

    • Ịkwado na ịtọghapụ ndị ọrụ na ndị nkuzi (lee 30.3 na 30.6).

    • Ịkpọpụta aha ụmụnne ndị nwoke a ga-echi echichi na ọkwa ọrụ dị na Ọkwa nchụaja nke Erọn (lee 18.10.3).

    • Ịmara ndị otù ọhụrụ, tinyere ndị atọghatara na nso nso a.

  7. Inye aha na ịgọzi ụmụntakịrị (lee 18.6). A na-emekarị nke a na nzukọ obubu ọnụ na ọgbụgba ama (lee 29.2.2).

  8. Ime ndị ọhụrụ atọghatara onye otù (lee 18.8).

  9. Abụ oriri nsọ na ịchịkwata oriri nsọ. Oriri nsọ bụ isi ebum n’obi nke nzukọ ahụ. Emume nsọ nke a bụ ohere nke ndị otù ji etinye echiche ha n’ebe Onye Nzọpụta nọ na aja Ya maka ha.

    Maka ihe ndị ọzọ banyere ime nkwado, ngọzi, na ibugharị oriri nsọ, lee 18.9.

  10. Ozi nke ozi ọma na ịgụ egwu ndị otù ma ọ bụ egwu ndị ọzọ.

  11. Abụ na ekpere mmechi.

  12. Egwu mgbe emechiworo

29.2.1.4

Ịhọrọ Ndị Ga-ekwu okwu

Otu bishọp na-ahọrọ ndị ga-ekwu okwu maka nzukọ oriri nsọ. Ọtụtụ mgbe ha na-akpọku ndị otù ngalaba, tinyere ndị ntoroọbịa.

Ndị na-ekwu okwu na-agba ama Jizọs Kraịst ma kuzie ozi ọma Ya site na akwụkwọ nsọ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:12; 52:9).

29.2.2

Nzukọ Obubu ọnụ na Ọgbụgba ama

Na nzukọ obubu ọnụ na ọgbụgba ama, enweghị ndị na-ekwu okwu enyere ma ọ bụ nhọrọ egwu ndị pụrụ iche. Kama, onye ahụ na-eduzi na-agba obere ama. Mgbe ahụ ya akpọkuo ndị otù ọgbakọ ahụ ịgba ama ha. Ịgba ama pụtara ịma ọkwa eziokwu niile nke ozi ọma dị ka mkpake nke Mmụọ Nsọ siri dị.

29.2.3

Ọgbakọ Ngalaba ukwu

29.2.4

Nzukọ Otu Bishọp

Okwu ndị a ga-atule nwere ike gụnye:

  • Ịchịkọta ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu na ngalaba ukwu.

  • Ịgba ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ nọ na ngalaba ukwu ume—tụmadị ndị ntoroọbịa na ụmụntakịrị.

  • Ịchọpụta ndị otù ndị nwere ike ikwado ịnata emume nsọ niile, tinyere echichi ọkwa nchụaja niile.

  • Ịchọpụta ndị otù a ga-akpọ n’ọkwa ngalaba ukwu niile.

29.2.5

Nzukọ Kansụl Ngalaba ukwu

Bishọp na-atụ atụmatụ, na-eduzi, ma na-atụzi aka nzukọ kansụl ngalaba ukwu. Kansụl ahụ anaghị eme mkpebi dị mkpa ọ bụrụ ma bishọp anọghị ya.

Ndị ndu otu ngalaba ukwu na-abịa nzukọ kansụl ngalaba ukwu n’ọnọdụ abụọ:

  1. Dị ka ndị otù kansụl ngalaba ukwu na-enyeaka gọzie ndị otù ngalaba ukwu niile.

  2. Dị ka ndị nọchitere otu ha niile.

Mgbe ha zukọtara ọnụ, ndị otù kansụl ngalaba ukwu na-akpa nkata okwu ndị ga-abara ha uru sitere na mgbalị dị n’otu nke kansụl dum. Onye otù kansụl ọbụla ka a na-agba ume ịkọwa echiche ya niile na mkpalimmụọ n’okwu ndị a.

Nzukọ kansụl ngalaba ukwu anaghị anọ karịa otu awa. Ha na-eji ekpere na nkenke nkọwada n’ọrụ ndị enyere sitere na nzukọ gara aga amalite. Bishọp na-ebute ụzọ kwuo maka okwu ndị kachasị dị mkpa iji gọzie ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ.

  • Ibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Inyere ndị otù niile aka wulite okwukwe, nara emume nsọ ndị na-azọpụta, ma debe ọgbụgba ndụ ha niile.

  • Ilekọta ndị ahụ nọ na mkpa. Ikekọrịta akụrụngwa niile na nka niile iji gọzie ndị mmadụ, ndị ezi na ụlọ, na obodo. Inyere ndị otù ngalaba ukwu aka nwee ndabere onwe. (Lee isi nke 22.)

  • Ịkpọku ndị niile ịnata ozi ọma ahụ. Inyochagharị ọganiihu nke ndị ahụ na-amụ ihe banyere ozi ọma, nakwa ndị otù ọhụrụ na ndị na-alọghachi. Na-akparịta ụka ụzọ niile ndị otù nwere ike isi kesaara ndị ọzọ ozi ọma. (Lee isi nke 23.)

  • Ịdị n’otu ezi na ụlọ maka ebighị ebi. Inyochagharị ọganiihu nke ndị otù na-akwado ịnata emume nsọ niile tempụl. Na-atụ atụmatụ ụzọ esi enyere ndị otù karịrị akarị aka tozuo maka rekọmend tempụl. Na-akparịta ụzọ ndị otù nwere ike isi sonye n’ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ. (Lee isi nke 25.)

Ndị otù kansụl ga-edeberịrị nzuzo ozi ọbụla bụ nke onwe ma ọ bụ nke na-emetụta uche (lee 4.4.6).

29.2.6

Nzukọ Kansụl Ntoroọbia Ngalaba ukwu

Tupu nzukọ ọbụla amalite, bishọp na onye nke n’eduzi na-enyocha ihe ndị a ga-ekwu maka ya.

  • Ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu.

  • Mkpa nke ndị ntoroọbịa na ụzọ ndị esi emezi ha.

  • Mgbalị niile iji zute ndị ntoroọbịa ndị na-adịghị ike n’ọrụ ma ọ bụ ndị otù ọhụrụ.

  • Ihe omume niile, gụnyekọta ohere niile iji jeere ndị nọ na mkpa ozi. Ọtụtụ niime atụmatụ ahụ ka a na-eme niime kworum ma ọ bụ nzukọ otu ndịisi klaasị niile (lee isi nke 20).

  • Ije ozi nlekọta (lee isi nke 21).

  • Ikuziri ndịisi kworum na klaasị akpọrọ ọhụrụ ihe.

29.2.8

Nhazi niile Nzukọ Sọnde

Ngalaba ukwu niile na-eji otu niime awa abụọ ndị a sotere maka nzukọ Sọnde niile.

Atụmatụ 1

Nkeji 60

Nzukọ oriri nsọ

Nkeji 10

Ịgafe na klas na nzukọ niile

Nkeji 50

Sọnde Nille: Praịmarị, gụnyere ọta akara

Sọnde Mbụ na nke atọ nke ọnwa: Ụlọ akwụkwọ Sọnde

Sọnde nke abụọ na nke anọ: nzukọ kworum ọkwa nchụaja niile, nzukọ otu enyemaka niile, na nzukọ Ndịinyom Nta niile.

Sọnde nke ise: nzukọ nke ndị ntoroọbịa na ndị okenye. Otu bishọp na-ekpebi isiokwu ma nye ndị nkuzi ọrụ.

Atụmatụ 2

Nkeji 50

Sọnde Nille: Praịmarị, gụnyere ọta akara

Sọnde nke Mbụ na nke atọ nke ọnwa: Ụlọakwụkwọ Sọnde

Sọnde nke abụọ na nke anọ: nzukọ kworum ọkwa nchụaja niile, nzukọ otu enyemaka niile, na nzukọ Ndịinyom Nta niile.

Sọnde nke ise: nzukọ nke ndị ntoroọbịa na ndị okenye niile. Otu bishọp na-ekpebi isiokwu ma nye ndị nkuzi ọrụ.

Nkeji 10

Ịgafe nzukọ oriri nsọ

Nkeji 60

Nzukọ oriri nsọ

29.3

Nzukọ Stek niile

29.3.1

Ọgbakọ Stek

29.3.2

Nzukọ Stek Zuruọha nke Ọkwa nchụaja

29.3.3

Nzukọ Ndị ndu Ọkwa nchụaja na Stek

29.3.4

Nzukọ niile nke Odudu Stek

29.3.5

Nzukọ Kworum Ndị Nchụaja Dị elu nke Stek

29.3.6

Nzukọ Otu Ndịisi Stek

29.3.7

Nzukọ Kansụl Dị elu

29.3.8

Nzukọ Kansụl Stek

29.3.9

Nzukọ Kọmitii nke ndị Ndu Okenye Stek

29.3.10

Nzukọ Kọmitii nke Ndu Ndị ntoroọbia Stek

29.3.11

Nzukọ Kansụl nke ndị Bishop nke Stek

29.5

Olili ozu na Nzukọ Ndị Ọzọ maka Onye Nwụrụ anwụ

29.5.1

Ụkpụrụ Izugbe

Otu Ebumnoobi dị mkpa nke nzukọ niile nke Nzukọ nsọ maka onye nwụrụ anwụ bụ ịgba ama nke atụmatụ nke nzọpụta, kachasị Aja mgbaghara mmehie na Mbilite N’ọnwụ nke Onye Nzọpụta. Ozi ndị a kwesịrị ịbụ nhụmiihe ime mmụọ nwere ùgwù.

Ndị ndu Nzukọ nsọ ekwesịghị ịtinye ntọala niile nke okpukperechi ndị ọzọ ma ọ bụ otu ndị ọzọ niime nzukọ niile nke Nzukọ nsọ maka ndị nwụrụ anwụ.

29.5.2

Inyere Ezi na Ụlọ Aka

Dị ka ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, ndị ndu Nzukọ nsọ na ndị otù na-eso ndị n’eru uju eru uju … ma nye nkasi obi ndị nọ na mkpa nkasi obi” (Mozaya 18:9). Mgbe onye otù nwụrụ, bishọp na-aga leta ezi na ụlọ ahụ inye ha nkasi obi.

Bishọp na-enye aka site n’aka ndị otù ngalaba ukwu, gụnyekọta kworum ndị okenye na Otu Enyemaka.

29.5.4

Nzukọ Olili niile (Ebe Ọ bụ Omenaala)

Olili bishọp duziri, ma ọ bụ niime ụlọ Nzukọ nsọ ma ọ bụ ebe ọzọ, bụ nzukọ nke Nzukọ nsọ ma bụrụ nzukọ okpukperechi. O kwesịrị ịbụ mmemme ime mmụọ.

Olili kwesịrị ibido n’oge. Nzọ niile, ha ekwesịghị ịnọ karịa awa 1.5, dị ka nkwanye ugwu nye ndị bịara abịa.

Nzukọ olili niile abụghị nke a na-emekarị na Sọnde.

29.6

Ekpere niime Nzukọ niile nke Nzukọ nsọ

Ekpere niime nzukọ niile nke Nzukọ nsọ kwesịrị ịdị nkenke, dịrị mfe, ma Mmụọ eduzie ya. Onye otù Nzukọ nsọ ọbụla mere baptizim nwere ike nye ekpere mmepe ma ọ bụ ekpere mmechi. Ụmụntakịrị ndị na-emebeghị baptizim nwere ike ikpe ekpere niime Praịmarị.

29.7

Izipụ Nzukọ niile N’Ikuku na Ime Nzukọ niile N’Ikuku

Bishọp nwere ike, dị ka ihe ngụpụ, nye ikike izipụ n’ikuku nzukọ oriri nsọ na nke olili na nke alụmdi na nwunye e mere na ụlọ ụka.

Izipụ n’ikuku nzukọ oriri nsọ ekwesịghị ịgụnye nchịkwa nke oriri nsọ.

Maka ụfọdụ nzukọ, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike nye ndị otù ikike ndị na-enweghị ike ịbịa na mmadụ isonye n’ikuku. Nzukọ ndị a gụnyere:

  • Nzukọ odudu niile, ụdị dị ka nzukọ otu ndịisi ma ọ bụ nzukọ kansụl niile.

  • Nzukọ niile nke kworum, Otu Enyemaka, na Ndịinyom Nta.

  • Klaasị Ụlọakwụkwọ Sọnde niile.

  • Klaasị Praịmarị niile na oge ịgụ egwu.

Bipụta