Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
31. Ajụjụ ọnụ niile na Nzukọ Ndị ọzọ ha na Ndị otù


“31. Ajụjụ ọnụ niile na Nzukọ Ndị ọzọ ha na Ndị otù,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“31. Ajụjụ ọnụ niile na Nzukọ Ndị ọzọ ha na Ndị otù,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndịikom na-ekwe na aka

31.

Ajụjụ ọnụ niile na Nzukọ Ndị ọzọ ha na Ndị otù

31.0

Ndubata

Jizọs Kraịst ọtụtụ mgbe jere ozi nlekọta nye ndị ọzọ n’otu n’otu (lee, n’ịmaatụ, Jọn 4:5-26; 3 Nefi 17:21). Ọ hụrụ ụmụ Chineke nke ọbụla naanya. Ọ na-enyere ha aka n’otu n’otu.

Isiakwụkwọ nke a nwere ike nyere ndị ndu niile aka ndị nwere ohere izukọta ha na ndị otù n’otu n’otu.

31.1

Ụkpụrụ niile nke Nduzi

31.1.1

Mee nkwado niime Ime Mmụọ

Kwadoo onwe gị niime mmụọ site n’ekpere, ọmụmụ akwụkwọ nsọ, na ibi ndụ ezi omume. Gee ntị na ntaka niile nke Mmụọ Nsọ.

31.1.2

Nyere onye otù ahụ aka Nwete Mmetụta Ịhụnaanya nke Chineke

Mgbe ndị otù bịakwutere gị maka ajụjụ ọnụ ma ọ bụ enyemaka maka aka mgba nke onwe, mgbe ụfọdụ ihe kwesịịrị ha karịsịa bụ ịmata na Nna nke Eluigwe hụrụ ha naanya.

Akwụkwọ nsọ na okwu niile nke ndị amụma ụbọchi ikpeazụ a na-akpọku Mmụọ ma na-akuzi ozizi n’enweghị ntụpọ. Jiri ha ji kpatee mmụọ ma gbaa ume, ọ bụghị iji maa ikpe, manye, ma ọ bụ mee ka egwu dịrị (lee Luk 9:56).

31.1.3

Nyere onye otù aka Dọrọ site n’Ike nke Onye Nzọpụta

Gbaa ndị otù ume ịtụgharị nye Ya. Nyere ha aka dọrọ site n’ike Ya iji gbaa ume, kasie obi, ma gbapụta.

31.1.4

Nyere onye otù aka Nwee Obi ruru ala na Nchekwa

Mgbe niile na-enye onye otù nhọrọ nke ichọ ka onye ọzọ nọrọ ebe ahụ n’oge ajụjụ ọnụ ma ọ bụ nzukọ. Mgbe ị na-ezukọta gị na onye otù nke okike nke ọzọ, otu nwata, ma ọbụ onye ntorobịa, kpachara anya na otu niime nne na nna mọbụ dimkpa ọzọ nọ ebe ahụ. Ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị nwere ike sonye nzukọ ahụ ma ọ bụ chere n’ofe ime ụlọ ahụ, dị ka ọ dabere na ihe ndị masịrị onye otù nke ị na-ezute.

Ekesakwarala onye ọbụla ozi nzuzo—tinyere di ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụ ndị ndu ọzọ nke Nzukọ nsọ—ọgwụla ma onye otù ahụ nyere nkwado.

31.1.5

Jụọ Ajụjụ ndị Mmụọ na-akpate ma Gee Ntị na Mkpachapụ anya

Mgbe ị na-ezukọ onye otù, jụọ ajụjụ ndị na-enyere gị aka ghọta ọnọdụ ya bụ nwoke ma ọ bụ ya nwanyị.

Mgbe onye otù na-ekwu okwu, kpachapụ anya gee ntị nke ọma.

31.1.6

Gbaa Ume Ndabere Onwe

Nihi ịhụnaanya gị nye ndị otù, ị nwere ike chọọ ịgwọta nsogbu ha ngwangwa. Kosiladị, ị ga-agọzi ha karịa site n’inyere ha aka chọta ngwọta nke onwe ha ma mee mkpebi nniile nke onwe ha (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 9:8).

31.1.7

Kwadoo Mbọ niile iji Chegharịa

Naanị bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike inyere mmadụ aka dozie njọ siri ike. Ụfọdụ ndị a ka edepụtara niime 32.6. Ọ bụrụ ma onye otù emewo njọ ọbụla niime ndị a, ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị kwesịrị izukọ ya na bishọp ma ọ bụ onyeisi stek ozugbo.

31.1.8

Zaghachi Mmetọ n’ụzọ Dabara adaba

Enweghị ike anabata mmetọ n’ụdị ọbụla. Were repọọtụ nke mmetọ ji kpọrọ ihe. Ọ bụrụ ma gị mara maka onye e mmetọwororịị, nye repọọtụ mmetọ n’aka ndị ji ikike obodo ma gị na bishọp a dụọ ndụmọdụ. Ntuziaka niile maka inye repọọtụ na nzaghachi maka mmetọ ka enyere niime 38.6.2.

31.2

Ajụjụ ọnụ niile

31.2.1

Ebumnoobi nke Ajụjụ ọnụ niile

N’ụzọ ọbụla, ndị ndu Nzukọ nsọ na-agba ndị otù ajụjụ ọnụ iji chọpụta ma ha:

  • A kwadowo ịnata ma ọ bụ sonye n’emume nsọ.

  • Kwesịrị ka a kpọọ ha n’ọkwa Nzukọ nsọ.

31.2.2

Ụdị Ajụjụ ọnụ niile

Onye nwere ike ịgba ajụjụ ọnụ

Ebumnoobi nke ajụjụ ọnụ ahụ

Onye nwere ike ịgba ajụjụ ọnụ

Naanị bishọp

Ebumnoobi nke ajụjụ ọnụ ahụ

  • Nye onye otù na-anata onyinye dị nsọ nke onwe ya ma ọ bụ a na-arachi nye di ma ọ bụ nwunye rekọmend tempụl (lee 26.3.1).

  • Nye onye atọghatara atọghata ọhụrụ rekọmend tempụl (lee 26.4.2).

  • Chie nwoke atọghatara ọhụrụ echichi n’ọkwa dị niime Ọkwa nchụaja nke Erọn.

  • Chie onyeikom nta ma ọ bụ onyeikom n’ọkwa nke nchụaja (lee 18.10.2).

  • Rọpụta otu nwoke a ga-echi echichi okenye ma ọ bụ onyeisi nchụaja (lee 31.2.6). Nkwado sitere n’aka otu ndịisi stek dị mkpa iji duzie ajụjụ ọnụ nke a.

  • Rọpụta onye otù ga-eje ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma n’uju oge (lee 24.4.2).

  • Kpọọ onye otù ga-eje ozi dị ka onyeisi otu ngalaba ukwu.

  • Kpọọ onye nchụaja ga-eje ozi dị ka onye enyemaka na kworum ndị nchụaja.

  • Nyere onye otù aka chegharịa site na njọ siri ike (lee isi nke 32).

  • Kwadoo onye otù ịnata Perpetual Education Fund loan, ebe ọ dị adị.

  • Kwe onye otù ikwupụta ọnọdụ ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị dị ka onye ọkwụụ otu ụzọ n’ụzọ iri (lee 34.3.1.2).

  • Nye ikike ka ejiri ego onyinye nke obubu ọnụ mee ihe(lee 22.6.1).

Onye nwere ike ịgba ajụjụ ọnụ

Bishọp na onye ndụmọdụ o nyere ọrụ

Ebumnoobi nke ajụjụ ọnụ ahụ

  • Megharịa ọhụrụ rekọmend tempụl (lee 26.3.1).

  • Nye rekọmend tempụl iji sonye na baptizim na Emume Nnabata nnọchi anya niile (lee 26.4.3).

  • Nye rekọmend tempụl iji rachie nye ndị nne na nna ma ọ bụ iji gbaa aka ebe nrachi nke ụmụnne nye ndị nne na nna (lee 26.4.4).

  • Kpọọ onye otù ije ozi n’ọkpụkpọ okù ngalaba ukwu dị ka egosipụtara niime 30.8.

  • Nye ikike baptizim na Emume Nnabata nke nwa afọ 8 onye bụ onye otù ndekọihe ma ọ bụ nwere nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye nlekọta onye bụ onye otù nke Nzukọ nsọ (lee 31.2.3.1).

  • Nye ikike echichi nke onyeikom n’ọkwa ọrụ nke dikọn ma ọ bụ onye nkuzi (lee 18.10.2).

  • Nye Rekọmend Ngọzi nke Onye Petrak (lee 18.17).

  • Nye onye ji ọkwa nchụaja ikike ime emume nsọ ọkwa nchụaja na ngalaba ukwu ọzọ, ọ bụrụ na o nweghị rekọmend tempụl. (Lee Rekọmend iji Mee otu ụdị Emume nsọ.)

31.2.3

Ajụjụ ọnụ Baptizim na Emume Nnabata

31.2.3.1

Ụmụntakịrị Ndị Bụ Ndị otù Ndekọihe

Bishọp na-eji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja maka ime ndị otù nke ndekọihe gbara afọ 8 baptizim na ngalaba ukwu ya. Nihi nke a, ya ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ na-agba ndị a sotere ajụjụ ọnụ maka baptizim:

  • Ụmụntakịrị gbara afọ 8 ndị bụ ndị otù ndekọihe.

  • Ụmụntakịrị gbara afọ 8 ndị na-abụghị ndị otù ndekọihe mana nwere onye otù nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye nlekọta.

  • Ndị otù ndekọihe gbara afọ 9 ma karịa ndị egburu oge baptizim ha n’ihi nkwarụ niile nke ọgụgụ isi.

N’ajụjụ ọnụ ahụ, onye otù bishọp na-ahụ na nwa ahụ ghọtara Ebumnoobi niile nke baptizim (lee 2 Nefi 31:5-20). Ọ nakwa ahụ na nwa ahụ ghọtara ọgbụgba ndụ nke baptizim ma na-agba mbọ ibi ndụ site na ya (lee Mozaya 18:8-10). O kwesịghị iji ndepụta ajụjụ ndị akọwapụtara. Nke a abụghị ajụjụ ọnụ iji chọpụta ntozu oke, ebe ọ bụ na “obere ụmụntakịrị enweghị mkpa nchegharị” (Moronaị 8:11).

31.2.3.2

Ndị Atọghatara atọghata

Onyeisi mishọn na-eji ọtụghe niile nke ime ndị atọghatara atọghata baptizim. N’ihi nke a, onye mgbasa ozi ọma n’uju oge na-agba ajụjụ ọnụ:

  • Ndị mmadụ gbara afọ 9 ma karịa ndị na-emetụbeghị baptizim na Emume Nnabata. Lee 31.2.3.1 maka ihe ngụpụ maka ndị ahụ nwere nkwarụ ọgụgụ isi.

  • Ụmụntakịrị gbara afọ 8 ma karịa ndị nne na nna ha na-abụghị ndị otù Nzukọ nsọ.

  • Ụmụntakịrị gbara afọ 8 ma karịa ndị nwere nne ma ọ bụ nna nakwa eme baptizim ma mee onye otù.

31.2.4

Ajụjụ ọnụ niile maka Ichi echichi n’Ọkwa dị niime Ọkwa nchụaja nke Erọn

Maka ozi ndị ọzọ, lee 18.10.2.

31.2.5

Ajụjụ ọnụ niile nke Rekọmend Tempụl

Tempụl bụ ụlọ nke Onyenwe anyị. Ịbanye niime tempụl na isonye n’emume nsọ niile n’ebe ahụ bụ ohere ọma dị nsọ. Ọhere ọma nke a ka edebeere ndị ahụ kwadoworo niime mmụọ ma na-agba mbọ ibi ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị, dị ka ekpebiri site n’aka ndị ndu enyere ikike.

Ime mkpebi nke a, ndị ndu ọkwa nchụaja na-agba onye otù ajụjụ ọnụ jiri ajụjụ ndị dị niime LCR (leekwa ntuziaka niile dị niime 26.3).

31.2.6

Ajụjụ ọnụ niile maka Ichi echichi n’Ọkwa ọrụ dị niime Ọkwa nchụaja Melkizedek

Onyeisi stek ji ọtụghe ọkwa nchụaja niile nke inyefe Ọkwa Nchụaja Melkizedek. O jikwa ọtụghe niile nke ichi echichi n’ọkwa niile nke okenye na ọkwa nchụaja dị elu.

Site nkwado nke otu ndịisi stek, bishọp na-agba onye otù ajụjụ ọnụ jiri ajụjụ niile enyere na Ndekọihe Echichi Ọkwa Nchụaja Melkizedek.

31.3

Ohere Ndị ọzọ maka Ndị Ndu Izute Ndị otù

  • Ndị otù nwere ike rịọ izute onye ndu Nzukọ nsọ mgbe ha chọrọ odudu nke ime mmụọ ma ọ bụ nwere nsogbu nke onwe ndị dị arọ.

  • Bishọp ma ọ bụ onye enyere ọrụ na-ezute ndị otù ndị nwere mkpa nke anụ ahụ (lee 22.6).

  • onye otù bishọp na-ezute onye ọbụla gbara afọ 11 dị ka ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị na-agafe site na Praịmarị baa na kworum ndị dikọn ma ọ bụ klaasị Ndịinyom Nta.

31.3.1

Ịna Ezute Ndị Ntoroọbịa

Bishọp ma ọ bụ otu niime ndị ndụmọdụ ya na-ezute onye ntoroọbịa ọbụla ugboro abụọ n’afọ. Opekampe otu niime nzukọ ndị a afọ ọbụla kwesịrị ịbụ ya na bishọp. Malite n’afọ ahụ nke onye ntoroọbịa ga-agba afọ 16, nzukọ abụọ ahụ n’afọ kwesịrị ị bụ ya na bishọp ọ bụrụ ma o kwe omume.

Onyeisi Ndịiyom Nta nwekwara oke na ọrụ ije ozi ilekọta Ndịiyom Nta ọbụla. O nwere ike ime nke a site n’izukọ ya na ndịiyom nta n’otu n’otu (ma ọ bụ na onye dimkpa ọzọ nọ ebe ahụ).

31.3.1.2

Isiokwu niile a Ga-akpa

Isi mbunobi nke izukọ ya na ndị ntoroọbịa mgbe niile bụ iwulite okwukwe na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ma nyere ndị ntoroọbịa ahụ aka soro Ha. Nzukọ niile ndị a kwesịrị ịbụ maka mbulite nhụmiihe niile nke ime mmụọ.

31.3.2

Izukọ Ndị Dimkpa Nta Na-anọghị n’ọlụlụ

Bishọp na-eme ka ọganiihu ime mmụọ nke ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ dị niime ngalaba ukwu ya bụrụ nke kachasị mkpa. Ya ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ na-ezukọ ya na ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ ọbụla opampe otu ugboro n’afọ.

31.3.3

Nzukọ ndị otù Ịkpa maka Ọkpụkpọ okù na Oke na Ọrụ Ha niile

Ndịisi stek, ndị otù bishọp, na ndị ndu ndị ọzọ na-ezukọ otu otu ha na ndị otù ndị na-enye ha repọọtụ banyere ọkpụkpọ okù ha.

Onye ndu na-ekwupụta obi ekele maka ije ozi nke onye otù ma nye mgbam ume.

31.3.6

Ndụmọdụ na Ọgwụgwọ ọrịa Ọkachamara

Akpọghị ndị ndu Nzukọ nsọ ị bụ ndị ndụmọdụ ọkachamara ma ọ bụ iwete ọgwụgwọ ọrịa. Enyemaka ha na-enye bụ nke ime mmụọ, nke lekwasịrị anya na mgbam ume, nkasi obi, ike mgbapụta nke Jizọs Kraịst. Na mgbakwunye nye enyemaka nke a dị mkpa na-akpatemmụọ, ụfọdụ ndị otù nwere ike rite uru site na ndụmọdụ ọkachamara ebe ọ dị adị.

31.4

Izute ndị otù n’Ikuku

Mgbe niile, ndị ndu na-ezute ndị otù na mmadụ maka ajụjụ ọnụ na inye enyemaka ime mmụọ na ije ozi nlekọta. Kosiladị, dị ka ihe mwezuga, ha nwere ike zute site na ikuku mgbe izute na mmadụ ekweghị omume.

Bipụta