Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
32. Nchegharị na Kansụl niile nke Ịbụ onye otù Nzukọ nsọ


“32. Nchegharị na Kansụl niile nke Ịbụ onye otù Nzukọ nsọ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“32. Nchegharị na Kansụl niile nke Ịbụ onye otù Nzukọ nsọ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

ndịikom na-ekwu okwu

32.

Nchegharị na Kansụl niile nke Ịbụ onye otù Nzukọ nsọ

32.0

Ndubata

Nchegharị ndị kachasị na-eme na-agbata otu onye, Chineke, na ndị ahụ nweteworo mmetụta site na mmehie niile nke otu onye. Kosiladị, mgbe ụfọdụ bishọp ma ọ bụ onyeisi stek kwesịrị inyere ndị otù Nzukọ nsọ aka niime mgbalị ha ichegharị.

Mgbe a na-enyere ndị otù aka maka nchegharị, ndị bishọp na ndịisi stek na-enwe ịhụnaanya na nlekọta anya. Ha na-esoro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta, onye buliri ndị mmadụ elu ma nyere ha aka tụgharịa pụọ site na mmehie ma tụgharịa chee ihu na Chineke (lee Matiu 9:10–13; Jọn 8:3–11).

32.1

Nchegharị na Mgbaghara

Iwetazu atụmatụ nke ebere Ya, Nna nke Eluigwe zitere Ọkpara Ọ Mụrụ Naanị Ya, Jizọs Kraịst, ịkwụ ụgwọ maka mmehie anyị (lee Alma 42:15). Jizọs nagidere ntaramahụhụ nke iwu ikpe ziri ezi chọrọ maka mmehie anyị (lee Ozizi na Ọgbụgbandụ niile 19:15–19; lee kwa Alma 42:24-25). Site na aja nke a, ma Nna na Ọkpara ahụ gosịrị ịhụnaanya Ha na-enweghị ọgwụgwụ maka anyị (lee Jọn 3:16).

Mgbe anyị na-enwe “okwukwe ruo nchegharị,” Nna nke Eluigwe na-agbaghara anyị, na-emere anyị ebere site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst (Alma 34:15; leekwa Alma 42:13). Mgbe asachapụrụ ma gbaghara anyị, anyị pụrụ ikete alaeze Chineke n’ikpeazụ (lee Aịzaya 1:18; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:42)

Nchegharị karịrị ịgbanwe agwa. Ọ bụ ịtụgharị site na mmehie ma chee ihu na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist. Ọ na-eduba na mgbanwe nke obi na echiche (lee Mozaya 5:2; Alma 5:12-14; Helaman 15:7). Site na nchegharị, anyị na-abụ ndị ọhụrụ, kpeziri ha na Chineke (lee 2 Ndị Kọrịnt 5:17-18; Mozaya 27:25-26).

Ohere ichegharị bụ otu niime ngọzi ndị kachasị nke Nna nke Eluigwe nyeworo anyị site na onyinye nke Ọkpara Ya.

32.2

Ebumnoobi niile nke Mgbochi niile ma ọ bụ Mwepụ aha nke Ịbụ onye otù Nzukọ nsọ

Ọ bụrụ na otu onye otù e mee njọ dị egwu, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-enyere ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị aka chegharịa. Dị ka akụkụ usoro nke a, o nwere ike dị mkpa na o gbochiri ụfọdụ ihe ùgwù nke ịbụ onye otù Nzukọ nsọ na nwa oge. N’ọnọdụ ụfọdụ, o nwere ike dị mkpa iwepụ ịbụ onye otù nke mmadụ na nwa oge.

Igbochi ma ọ bụ iwepụ ịbụ onye otù nke mmadụ abụghị na-ebu n’obi ịta ahụhụ. Kama, emereme ndị a mgbe ụfọdụ dị mkpa iji nyere mmadụ aka chegharịa ma nwete nhumiihe mgbanwe nke obi. Ha nakwa enye mmadụ oge ikwado niime mmụọ iji megharịa ohụrụ ma debe ọgbụgba ndụ ya.

Ebumnoobi atọ nke mgbochi ịbụ onye otù ma ọ bụ iwepụ aha bụ ndị a sotere.

32.2.1

Na-enye aka Ichekwa Ndị ọzọ

Ebumnoobi nke mbụ bụ inye aka chekwaa ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ mmadụ na-eyi egwu nke anụ ahụ ma ọ bụ nke ime mmụọ. Akparam agwa nrugbu niile, mmerụ ahụ, mmetọ mmekọ ahụ, iṅụbiga ọgwụ oke, mpụ, na ngọnarị okwukwe bụcha ụfọdụ ụzọ ndị nke a nwere ike isi mee. Site na mkpatemmụọ, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-eme ihe iji chekwaa ndị ọzọ mgbe mmadụ na-eyi egwu n’ụzọ ndị a na ndị ọzọ siri ike (lee Alma 5:59-60).

32.2.2

Na-enyere Mmadụ aka Inwete Ike Mgbapụta nke Jizọs Kraịst site na Nchegharị

Ebumnoobi nke abụọ bụ inyere mmadụ aka nwete ike mgbapụta nke Jizọs Kraịst site na nchegharị. Site n’usoro nke a, ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị nwere ike ịdị ọcha ma tozuo oke ọzọ ịnata ngọzi niile nke Chineke.

32.2.3

Chekwaa Eziokwu nke Nzukọ nsọ

Ebumnoobi nke ato bụ ichekwa eziokwu nke Nzukọ nsọ. Igbochi na iwepụ aha ịbụ onye otù Nzukọ nsọ nke mmadụ nwere ike dị mkpa ma ọ bụrụ ma agwa ya merụọ Nzukọ nsọ ahụ n’ebe ọ dị ukwuu (lee Alma 39:11). Iguzosi ike n’eziokwu nke Nzukọ nsọ enweghị nchekwa site n’ikpuchite ma ọ bụ ibelata mmehie niile dị egwu—mana site n’ilebara ha anya.

32.3

Ọrụ nke Ndị Ikpe niime Izrel

Ndị bishọp na ndịisi stek ka akpọrọ ma dopụ iche ịbụ ndị ikpe niime Izrel (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:72-74). Ha ji ọtụghe niile iji nọchite anya Onyenwe anyị n’inyere ndị otù Nzukọ nsọ aka chegharịa (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13:1; 107:16–18).

Mgbe ụfọdụ ndị bishọp na ndịisi stek na-enye aka na ncheharị site na ndụmọdụ nke onwe. Enyemaka nke a nwere ike gụnye igbochi na-edeghị n’akwụkwọ ụfọdụ ihe ùgwù nke ịbụ onye otù Nzukọ nsọ na nwa oge.

Maka ụfọdụ mmehie dị njọ, ndị ndu na-enye aka maka nchegharị site na-ime kansụl ịbụ onye otù (lee 32.6). Enyemaka nke a nwere ike gụnye igbochi n’akwụkwọ ụfọdụ ihe ùgwù nke ịbụ onye otù Nzukọ nsọ ma ọ bụ iwepụ aha ịbụ onye otù nke mmadụ na nwa oge.

Ndị bishọp na ndịisi stek na adị ịhụnaanya ma na-elekọta dị ka ha na-enyere ndị otù aka ichegharị. Nkwukọrịta okwu nke Onye Nzọpụta na nwanyị ahụ enwetere na ịkwa iko bụ ihe odudu (lee Jọn 8:3-11). Na-agbanyeghị na O kwughị na agbagharawo ya njọ niile, Ọ maghị ya ikpe. Kama, Ọ gwara ya “emekwala njọ ọzọ”—ka ọ chegharịa ma gbanwee ndụ ya.

Ndị ndu ndị a na-akuzi na enwere “ọṅụ … n’eluigwe maka otu onye mmehie nke chegharịrị echegharị” (Luk 15:7). Ha na-enwe ndidi, na-akwado, ma nwee ezi uche. Ha na-akwalite olile anya. Ha na-akuzi ma na-agba ama na niihi aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, onye ọbụla pụrụ ichegharị ma dịrị ọcha.

Ndị bishọp na ndịisi stek na-achọ nduzi sitere na Mmụọ ịmata otu esi enyere mmadụ ọbụla aka chegharịa. Naanị maka mmehie ndị kachasị njọ ka Nzukọ nsọ jiri nwee ọkọlọtọ ehiwere maka ihe ndị ndu ya ga-eme (lee 32.6). Ọdịghị ọnọdụ abụọ yiri otu. Ndụmọdụ nke ndị ndu na-enye na usoro nke nchegharị ha na-akwado ka mmụọ ga-akpaterịrị ma nwere ike ịdị iche maka onye ọbụla.

6:18

32.4

Nkwupụta njọ, KeNzuzo, na Ịrepọọtụrụ Ndị ji ikike Gọvmentị

32.4.1

Nkwupụta njọ

Nchegharị na-achọ na a ga-ekwupụta njọ nye Nna nke Eluigwe. Jizọs Kraịst kwuru, “Site na nke a ka unu nwere ike ịmara ma mmadụ o chegharịwo site na njọ ya niile—lee, ọ ga-ekwupụta ha ma jụ ha” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:43; leekwa Mozaya 26:29).

Mgbe ndị otù Nzukọ nsọ mere mmehie dị njọ, nchegharị ha gụnyekwara ikwupụta nye bishọp ha ma ọ bụ onyeisi stek. Mgbe ahụ o nwere ike iji ọtụghe niile nke ozi ọma nke nchegharị n’ọnọdụ ha (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13:1; 84:26–27; 107:18, 20). Nke a na-enyere ha aka nwete ọgwụgwọ ma laghachị n’ụzọ nke ozi ọma site n’ike nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta.

Ebumnoobi nke nkwupụta njọ bụ iji gbaa ndị otù ume ibupụ onwe ha ibu arọ ka ha nwee ike chọta n’uju enyemaka nke Onyenwe anyị na-inwe mgbanwe na ọgwụgwọ. Iwulite “obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị” ka nkwupụta njọ na-enyere aka (2 Nefi 2:7). Nkwupụta njọ n’onwe na-egosi na onye ahụ chọrọ ichegharị.

Mgbe otu onye otù kwupụtara njọ, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-eso ntuziaka niile nke ndụmọdụ dị niime 32.8. Ọ na-achọ nduzi site n’ekpere banyere ntọ dabara adaba maka inyere onye otù ahụ aka chegharịa. Ọ na-atụle ma kansụl ịbụ onye otù ọ ga-enye aka. Ọ bụrụ na atụmatụ Nzukọ nsọ ga-achọ kansụl ịbụ onye otù, ọ na-akọwa nke a (lee 32.6).

Mgbe ụfọdụ onye otù emejọwo di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ dimkpa ọzọ. Dị ka akụkụ nke nchegharị, o kwesịrị nnọọ ikwupụta njọ nye onye ahụ ma chọọ mgbaghara. Onye ntoroọbịa nke mere njọ dị egwu ka a na-agbakarị ume inwe ndụmọdụ ya na nne na nna ya.

32.4.4

Ke Nzuzo

Ndị Bishọp, ndịisi stek, na ndị ndụmọdụ ha nwere oke na ọrụ dị nsọ iji chekwaa ozi nzuzo niile ekesaara ha. Ozi nke a nwere ike bịa na-ajụjụ ọnụ niile, ndụmọdụ, na nkwupụta niile nke njọ. Otu ụdị ọrụ nke kenzuzo metụtara ndị niile na-eso na kansụl niile nke ịbụ onye otù. Kenzuzo dị oke mkpa n’ihi na ndị otù nwere ike ghara ikwupụta njọ niile ma ọ bụ chọọ ntuziaka ma ọ bụrụ ma ihe ha na-ekesa abụghị nke a ga-edebe na nzuzo. Ịda iwu ntụkwasị obi na-arara ntụkwasị obi nke ndị otù ma mee ka ha tụfuo ntụkwasị obi na ndị ndu ha.

Ịnọgide n’ọrụ nke kenzuzo ha, bishọp, onyeisi stek, ma ọ bụ ndị ndụmọdụ ha nwere ike kesaa ụdị ozi ahụ naanị dị ka ndị a sotere:

  • Ha kwesịrị ịjụtụ onyeisi stek, onyeisi mishọn, ma ọ bụ bishọp nke onye otù ahụ banyere ime kansụl ịbụ onye otù ma ọ bụ ihe ndị ọzọ metụtara ya.

  • Onye ahụ na-agafe na ngalaba ukwu ọhụrụ (ma ọ bụ atọghapụ onye ndu ọkwa nchụaja ahụ) ebe emereme ịbụ onye otù ma ọ bụ nchegbu ndị ọzọ siri ike ka na-eche.

  • Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-amụta na onye otù Nzukọ nsọ onye bipụrụ na ngalaba ukwu ma ọ bụ stek ahụ nwere ike ịbụ na o tinyewo aka na mmehie siri ike.

  • Ọ dị mkpa ịkpa ozi ahụ na-anwụ mgbe a na-eme kansụl ịbụ onye otù.

  • Onye otù na ahọrọ inye ikike maka onye ndu ikesa ozi ya na ndị ahụrụ ama.

  • O nwere ike dị mkpa ikesa ozi ebelatara ebelata banyere mkpebi nke kansụl ịbụ onye otù.

Iji nyere ndị ndu aka n’ichekwa ndị ọzọ ma rube isi n’iwu, Nzukọ nsọ na-ewete enyemaka sitere na ndị ọkachamara azụrụ azụ. Ịnata nduzi nke a, ngwa ngwa ndị ndu na-akpọtụrụ ekwe ntị enyemaka mmetọ nke Nzukọ nsọ ebe enwere ya (lee 38.6.2.1). Ebe a na-enweghị ya, onyeisi stek na-akpọtụrụ ndụmọdụ iwu mpaghara dị na ụlọọrụ mpaghara.

Naanị n’otu ọnọdụ ka bishọp ma ọ bụ onyeisi stek kwesịrị ikpughe ozi nzuzo na-achọghị ibute ụzọ chọọ ụdị nduzi ahụ. Nke ahụ bụ mgbe ikpughe ihe dị mkpa iji gbochie ihe ọjọọ n’eyi ndụ egwu ma ọ bụ nnukwu mmerụ ahụ ma enweghị oge iji nduzi. N’ụdị ọnọdụ dị otu ahụ, ọrụ iji chekwaa ndị ọzọ dịkarịrị mkpa karịa ọrụ nke kenzuzo. Ndị ndu kwesịrị ịkpọtụrụ ndị ji ikike obodo ngwa ngwa.

32.6

Ịdị oke njọ nke Mmehie na Atụmatụ nke Nzukọ nsọ

Ịdị oke njọ nke mmehie ọbụla bụ ntule dị mkpa n’ikpebi ntọ nke ga (1) enye aka chekwaa ndị ọzọ ma (2) nyere mmadụ aka chegharịa. Onyenwe anyị ekwuwo na Ọ “nweghị ike ilekwasị mmehie anya jiri ogo ohere kachasị nta” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:31; leekwa Mozaya 26:29). Ụmụ odibo Ya ekwesịghị ileghara ihe aka ebe ọbụla nke mmehie siri ike anya.

Mmehie ndị siri ike bụ isi njọ akpachapụrụ anya mee nke megidere iwu niile nke Chineke. Ụdị dị iche iche nke mmehie ndị siri ike ka edepụtara n’okpuru.

  • Omume ime ihe ike niile na mmetọ

  • Mmekọahụ rụrụ arụ

  • Omume aghụghọ niile

  • Imebi ntụkwasị obi niile

  • Omume ụfọdụ ndị ọzọ

Mgbe Achọrọ Kansụl Ịbụ onye otù ma ọ bụ Nwere ike Ịdị Mkpa

Ụdị Mmehie

Achọrọ Kansụl Ịbụ onye otù

Kansụl Ịbụ onye otù Nwere ike Ịdị Mkpa

Ụdị Mmehie

Omume Mmegbu niile na Mmetọ

Achọrọ Kansụl Ịbụ onye otù

  • Igbu mmadụ

  • Idina mmadụ n’ike

  • Ikpe ọmụma nke mbuso agha mmekọahụ

  • Mmegbu nwata ma ọ bụ ntoroọbịa

  • Omume nrigbu dị ọjọọ

Kansụl Ịbụ onye otù Nwere ike Ịdị Mkpa

  • Nwara igbu mmadụ.

  • Mmegbu mmekọahụ, tinyere mbuso agha na mmekpa ahụ (lee 38.6.18 maka mgbe kansụl dị mkpa)

  • Mmegbu nke di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ dimkpa ọzọ (lee 38.6.2.4 maka mgbe kansụl dị mkpa)

Ụdị Mmehie

Mmekọahụ Rụrụ arụ

Achọrọ Kansụl Ịbụ onye otù

  • Ndina ụgwa

  • Nziakwụna nwata

  • Ọtụtụ alụmdi na nwunye

  • Omume nrigbu mmekọahụ

Kansụl Ịbụ onye otù Nwere ike Ịdị Mkpa

  • Akwam iko, akwam iko n’etiti ndị na-alụbeghị ọlụlụ, otu ụdị mmekọahụ niile, na mmekọrịta mmekọahụ niile ọbụla na-anọghị n’alụmdi nke dị n’okpuru iwu n’etiti otu nwoke na otu nwanyị, tinyekwara nzute mmekọahụ niile dị n’intanet ma ọ bụ site n’ekwe ntị

  • Ibikọ ọnụ, njikọ niile na nrụkọ ọrụ niile nke obodo kwadoro, na alụmdi otu ụdị okike ahụ

  • Ịle nziakwụna n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ ma ọ bụ n’ụzọ mmanye nke kpataworo mmerụ ahụ pụtara ihe nye alụmdi ma ọ bụ ezi na ụlọ nke onye otù

Ụdị Mmehie

Omume Aghụghọ niile

Achọrọ Kansụl Ịbụ onye otù

  • Omume nrigbu ego, ụdị dị ka mpụ na ihe omume niile yiri ya (lee 32.6.3.3 ọ bụrụ ma onye otù so na iri ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ arịa n’ụzọ n’ezighị ezi)

Kansụl Ịbụ onye otù Nwere ike Ịdị Mkpa

  • Mpụnarị, ohi nkụka ụlọ, izu ohi, ma ọ bụ iri ego n’ụzọ n’ezighị ezi (lee 32.6.3.3 ọ bụrụ ma onye otù so na iri ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ arịa n’ụzọ n’ezighị ezi maka mkpa onwe)

  • Aka ebe ụgha

Ụdị Mmehie

Imebi Ntụkwasị obi niile

Achọrọ Kansụl Ịbụ onye otù

  • Mmehie siri ike mgbe eji ọkwa pụtara ìhè na Nzukọ nsọ

Kansụl Ịbụ onye otù Nwere ike Ịdị Mkpa

  • Mmehie siri ike mgbe eji ọkwa nke ikikere ma ọ bụ ntụkwasị obi na Nzukọ nsọ ma ọ bụ n’obodo (lee 32.6.3.3 ọ bụrụ ma onye otù so na iwere ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ arịa n’ụzọ n’ezighị ezi maka mkpa onwe)

  • Mmehie siri ike nke a maara ebe niile

Ụdị Mmehie

Omume Ụfọdụ Ndị ọzọ

Achọrọ Kansụl Ịbụ onye otù

  • Ikpe ọmụma mpụ ndị kachasị

Kansụl Ịbụ onye otù Nwere ike Ịdị Mkpa

  • Ite ime (ọ gwụla ma e nwere ihe ewezugara niime 38.6.1 gụnyere)

  • Usoro nke mmehie ndị siri ike

  • Ịkpachara anya hapụ oke na ọrụ niile nke ezi na ụlọ, tinyere akwụghị ụgwọ nkwado nke nwa na ego ọnwa maka alụkwaghịm

  • Ire ọgwụ ndị iwu megidere

  • Omume mpụ ndị ọzọ siri ike

32.6.3

Mgbe Onyeisi Stek na Otu Ndịisi Mpaghara dụkọrịtara ọdụ gbasara Ma Kansụl Ịbụ onye otù ma ọ bụ Emereme Ndị Ọzọ Bụ ihe Dị Mkpa

Ụfọdụ ihe chọrọ uche na ntuziaka ọzọ pụrụ iche. Ịmata otu esi enye aka karịsịa, onyeisi stek ga-adụrịrị ọdụ ya na Otu Ndịisi Mpaghara banyere ọnọdụ ndị dị niime nkeji nke a.

32.6.3.2

Ngọnarị okwukwe

Ihe ndị gbasara ngọnarị okwukwe ọtụtụ mgbe na-enwe mmetụta fere oke niile nke ngalaba ukwu ma ọ bụ stek. Ọ dị mkpa na-ekwuziri ha ngwa ngwa iji chekwaa ndị ọzọ.

Bishọp na onyeisi stek na-adụkọrịta ọdụ ọ bụrụ ma ya chee na emereme nke onye otù nwere ike ibute ngọnarị okwukwe.

Dị ka e kwuru ebe a, ngọnarị okwukwe na-arụ aka n’onye otù n’etinye aka niime otu niime ihe ndịa sotere:

  • Na-eme ihe ugboro ugboro n’ụzọ doro anya akpachapụrụ anya mee n’ihu ọha megide Nzukọ nsọ, ozizi ya niile, atụmatụ niile, ma ọ bụ ndị ndu ya.

  • Ịnọgide n’ikuzi dị ka ozizi nke Nzukọ nsọ ihe na-abụghị ozizi nke Nzukọ nsọ mgbe bishọp ma ọ bụ onyeisi stek meziworo ya

  • Ịgosi usoro nke ịkpachapụanya na-eme ihe iji mee ka okwukwe na mgbasike n’ọrụ nke ndị otù Nzukọ nsọ da mba

  • Ịganiihu na-eso nkuzi niile nke otu gọnarịrị okwukwe mgbe bishọp ma ọ bụ onyeisi stek gwara ya nke bụ eziokwu

  • Isonye nzukọ nsọ ọzọ na ịkwalite nkuzi ha niile n’ụkpụrụ iwu

32.6.3.3

Iri Ego Nzukọ nsọ.

Ọ bụrụ ma onye otù rie ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ zuo aria bara uru nke Nzukọ nsọ, onyeisi stek na Otu Ndịisi Mpaghara na-ekwukọrịta banyere ma kansụl ịbụ onye otù ma ọ bụ ihe ọzọ nwere ike ịdị mkpa.