Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
34. Ego niile na Nnyocha niile


“34. Ego niile na Nnyocha niile,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“34. Ego niile na Nnyocha niile,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
nwata ji envelop

34.

Ego niile na Nnyocha niile

34.0

Ndubata

Otu ụzọ n’ụzọ iri niile na onyinye niile na-ekwe Nzukọ nsọ rụọ ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu nke Onyenwe anyị (lee 1.2). Ego ndị a dị nsọ. Ha nọchitere anya aja na okwukwe nke ndị otù Nzukọ nsọ (lee Mak 12:41–44).

34.2

Odudu Ego Ngalaba ukwu

34.2.1

Otu Bishọp

Bishọp nwere oke na ọrụ ndị a sotere maka ego ngalaba ukwu niile. Ọ na-enyepụ ụfọdụ ọrụ nke a n’aka ndị ndụmọdụ na ndị klak ya.

Bishọp:

  • Na-akuzi ma na-akwalite mmụọ ndị otù ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri n’uju ma nye onyinye nyepụ aka (lee 34.3).

  • Na-ahụ na ego ngalaba ukwu niile ka edoziri nke ọma ma nye nkọwa maka ha (lee 34.5).

  • Na-enyocha ndepụta ego ọnwa ọbụla ma na-ahụ na nsogbu ọbụla ka edoziri ngwa ngwa.

  • Na-ahụ na ndị ndu otu na ndị klak mụrụ oke na ọrụ ha maka ego Nzukọ nsọ dị nsọ.

  • Na-akwado ma na-ejikwa atụmatụ mmefu ego ngalaba ukwu kwa afọ (lee 34.6).

  • Na-ezute ndị otù ngalaba ukwu kwa afọ ịnata nkwupụta nke otu ụzọ n’ụzọ iri ha.

34.2.2

Ndị Klak Ngalaba ukwu

Bishọp na-ekenye klak ngalaba ukwu ma ọ bụ onye enyemaka klak ngalaba ukwu ọrụ inye aka na ndebe ndekọihe nke ego ngalaba ukwu. Ndị klak na mkpachapụ anya na-esoro atụmatụ niile nke ugbua iji chekwaa ego niile nke Nzukọ nsọ ma hụ na ndekọihe niile nke Nzukọ nsọ dị otu esi chọọ.

Klak nwere oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Na-edekọ ma kwunye ego ọbụla a natara n’aka onye otù bishọp.

  • Na-enyocha ndepụta ego ọnwa ọbụla ma hụ na nsogbu ọbụla ka edoziri ngwa ngwa.

  • Nyere otu bishọp aka kwadoo atụmatụ mmefu ego ngalaba ukwu kwa afọ (lee 34.6.1 na 34.6.2).

  • Hụ na ndị otù nwere ike ịhụ ndepụta niile nke onyinye ha ma nye enyemaka dị ka achọrọ.

Ndị klak kwesịrị iji Ọkwa nchụaja Melkizedek ma nwee rekọmend tempụl dị ire.

34.3

Onyinye niile

34.3.1

Ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri

Ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri bụ onyinye nke otu ụzọ n’ụzọ iri nke ego mmadụ nye Nzukọ nsọ nke Chineke (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 119:3-4; ọ mụrụ nwa ka aghọtara ị bụ uru si na ahịa). Ndị otù niile ndị nwere uru si na ahịa kwesịrị ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri.

34.3.1.2

Nkwupụta Otu ụzọ n’ụzọ iri

Bishọp na-ezute onye otù ọbụla n’oge ọnwa ole ma ole ikpeazụ nke afọ ọbụla ịnata nkwupụta otu ụzọ n’ụzọ iri ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.

Ndị otù niile ka a na-akpọku izute bishọp:

  • Ikwupụtara bishọp ọnọdụ ha dị ka ndị na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri.

  • Na-ahụ na ndekọihe onyinye ha ziri ezi.

Mgbe ọbụla o kwere omume, ndị otù ezi na ụlọ niile, gụnyere ụmụntakịrị, kwesịrị ịgakọta ọnụ.

34.3.2

Onyinye nke Ibu ọnụ

Ndị ndu Nzukọ nsọ na-agba ndị otù ume ibi ndụ iwu nke ibu ọnụ. Nke a gụnyere inye onyinye ibu ọnụ na-adịghị aka ike (lee 22.2.2).

Ntuziaka niile maka ojiji ego onyinye nke ibu ọnụ ka ewetere na 22.5.2.

34.3.3

Ego Ndị Mgbasa Ozi ọma

Onyinye n’ego mgbasa ozi ọma ngalaba ukwu ka a na-eji kacha mkpa izute nkwa onyinye niile nke ndị mgbasa ozi ọma sitere na ngalaba ukwu ahụ.

Onyinye niile nye Ego Mgbasa Ozi ọma Izugbe ka Nzukọ nsọ na-eji eme ihe na ozuzu mgbalị mgbasa ozi ọma ya niile.

34.3.7

Enweghị ike Akwụghachi Onyinye ọbụla

Mgbe enyere Nzukọ nsọ otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye ndị ọzọ, ha abụrụ nke Onyenwe anyị. Edoro ha nsọ nye Ya.

Ndịisi stek na ndị bishọp na-agwa ndị nyere otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye niile na enweghị ike akwụghachi onyinye ndị a.

34.4

Ịdị Nzuzo nke Ịkwụ Otu ụzọ n’ụzọ iri na Onyinye Ndị Ọzọ niile

Ego ole nke otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye ndị ọzọ akwụrụ site n’aka onye na-enye na-adị nzuzo. Naanị bishọp na ndị ahụ enyere ikike ijide ma ọ bụ lee onyinye ndị a anya kwesịrị inwe ohere n’ozi nke a.

34.5

Njikwa Ego Nzukọ nsọ

Onyeisi stek na bishọp na-ahụ na ego Nzukọ nsọ niile ka ejikwara nke ọma. Otu ndị bishọp na ndị klak ka agbara ume inyocha vidiyo “Ego Dị Nsọ, Oke na Ọrụ niile Dị Nsọ” opekampe otu ugboro n’afọ.

34.5.1

Ụkpụrụ Nsiso

Ụkpụrụ nsiso na-achọ mmadụ abụọ—onye otù bishọp na klak, ma ọ bụ ndị otù otu bishọp abụọ—ga-esorịrị mgbe a na-edekọ ma na enyefe ego Nzukọ nsọ niile.

Ndị ndu kwesịrị ichekwa ma ghara ikesa password ha ma ọlị (lee 33.9.1.1).

34.5.2

Ịnata Otu ụzọ n’ụzọ iri na Onyinye Ndị Ọzọ

Onyenwe anyị enyewo ndị bishọp ntụkwasị obi dị nsọ nke ịnata na inye nkọwa maka otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye ndị ọzọ nke Ndị nsọ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:30-33; 119). Naanị bishọp na ndị ndụmọdụ ya nwere ike ịnata otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye ndị ọzọ. Enweghị ọnọdụ ọbụla nwere ike ime ka ndị nwunye ha, ndị otù ezi na ụlọ ha ndị ọzọ, ndị klak, ma ọ bụ ndị otù ngalaba ukwu ndị ọzọ nata onyinye ndị a.

34.5.3

Ịchọpụta eziokwu na Idekọ Otu ụzọ n’ụzọ iri na Onyinye Ndị ọzọ

Inye onyinye kwesịrị ka achọpụta eziokwu ma dekọọ na Sọnde a natara ha. onye otù otu bishọp na onye klak, ma ọ bụ ndị otù bishọp abụọ, na-esokọta emepe envelop nke ọbụla. Ha na-achọpụta eziokwu ma ego etinyere bụkwa otu ihe dị ka nke edere na fọm Otu ụzọ n’ụzọ iri na Onyinye Ndị Ọzọ. Ha na-edekọ onyinye nke ọbụla nke ọma. Ọ bụrụ ma ego na ihe e dere dị iche, ha na-akpọtụrụ onye nyere ozugbo enwere ike iji mezie ndịiche ahụ.

34.5.4

Ịkwụnye Otu ụzọ n’ụzọ iri na Onyinye Ndị Ọzọ

Ekwesịrị ikwado nkwụnye mgbe a hụchara na ego ole e dekọrọ dabara ya na ego ndị anatara.

Ebe e nwere ebe nkwụnye ụlọ akụ na-arụ ọrụ ruo awa 24, onye otù ndị bishọp na onye ọzọ ji Ọkwa nchụaja Melkizedek na-akwụnye ego niile niime ụlọ ọba ego ụbọchi ahụkwa emepere ma chọpụta eziokwu ego niile.

Ebe a na-enweghị ebe nkwụnye ụlọ akụ na-arụ ọrụ awa 24 ma ụlọ ọba ego mechiri na Sọnde, bishọp na-ezipụ onye ji Ọkwa nchụaja Melkizedek ịkwụnye ego ahụ n’ụbọchi azụmahịa nke ọzọ na-abịa. O kwesịrị:

  • Ịhụ na-echekwara ego niile tutu ruo mgbe akwụnyere ya.

  • Ịnata mpempe akwụkwọ gosiri ego akwụrụ na-egosi ụbọchi na ego ole akwụnyere.

34.5.5

Ichekwa Ego Nzukọ nsọ niile

Ndị otù na-ahụ maka ego Nzukọ nsọ agaghị ma ọlị ahapụ ha n’ụlọ nzukọ chi abọọ ma ọ bụ hapụ ha n’emeghị ihe ọbụla n’oge ọbụla, dị ka n’oge nzukọ niile na ihe omume niile.

34.5.7

Ijikwa Ego ndị Stek na Ngalaba ukwu Kwụrụ

Ọ dịghị mmefu stek ma ọ bụ ngalaba ukwu ndị nwere ike imete ihe ego ma ọ bụ akwụọ ụgwọ n’ejighị ikike nke onyeisi nduzi.

Ndị ndu abụọ enyere ikike ga-akwadorịrị ịkwụ ụgwọ ọbụla. Otu niime ha ga-abụrịrị onye otù ndịisi stek ma ọ bụ otù bishọp. Na-agbanyeghị enwere ike inye ndị ndụmọdụ ikike ikwado ịkwụ ụgwọ, onyeisi stek ma ọ bụ bishọp garịrị enyochagharị ịkwụ ụgwọ nke ọbụla. Ndị ndu ekwesịghị ikwado ịkwụ ụgwọ nye onwe ha.

Nkwado ederede nke onyeisi stek dị mkpa tupu bishọp e nwee ike jiri onyinye nke ibu ọnụ ma ọ bụ kwadoo arịrịọ nke bishọp maka onwe ya ma ọ bụ ezi na ụlọ ya. Fọm nkwado ederede sitere n’aka onye otù Ndịisi Mpaghara dị mkpa tupu bishọp e nwee ike jiri onyinye nke ibu ọnụ ma ọ bụ kwadoo arịrịọ nke bishọp maka onyeisi stek ma ọ bụ ezi na ụlọ ya. Lee 22.5.1.2 maka ntuziaka niile.

onye otù na-arịọ nkwụghachi ego na-ewete akwụkwọ ngosi ịkwụ ụgwọ nke akwụkwọ ma ọ bụ kọpị eletrọniki nke na-egosi ụgwọ ndị akwụrụ. Ya bụ nwoke ma ọ bụ ya nwanyị nakwa agụnye Ebumnoobi, ego ole, na agụgụ ụbọchi nke azụmahịa.

Ọ bụrụ na aga ebu ụzọ nye ego, onye otù ahụ na-ewete fọm arịrịọ ịkwụ ụgwọ, n’edepụta nzube, ego ole, na agụgụ ụbọchi. Mgbe akwụsịworo ụgwọ ahụ, onye otù mgbe ahụ (1) na-ewete akwụkwọ ngosi azụmahịa niile ma ọ bụ akwụkwọ ọnụahịa niile maka ego ndị emefuru na (2) na-eweghachi ego niile ọbụla a na-emefughị. Ego ndị a eweghachitere kwesịrị ka akwụghachi ha n’ụlọakụ.

34.5.9

Idebe Ndekọihe niile nke Ego

Stek na ngalaba ukwu ọbụla kwesịrị idebe ndekọihe niile nke ego dị ugbua, ziri ezi.

Maka ozi banyere ojiji na njide nke ndekọihe niile na repọọtụ niile, ndị klak kwesịrị ịrụtụ aka na nkuzi niile sitere n’isi ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ ma ọ bụ ụlọ ọrụ mpaghara. Ndekọihe niile nke ego ka ekwesịrị ijide ruo opekampe afọ atọ tinyere afọ nke ugbu a.

34.6

Atụmatụ Mkpata na Mmefu ego niile

Atụmatụ mkpata na mmefu na-ewete ego izugbe Nzukọ nsọ iji kwụọ ụgwọ maka ihe omume niile na atụmatụ niile nke stek na ngalaba ukwu niile.

Ọtụtụ ihe omume kwesịrị ịdị mfe ma nwee obere ọnụ ahịa ma ọ bụ enweghị ọnụ ahịa.

34.6.1

Atụmatụ mkpata na mmefu ego Stek na Ngalaba ukwu

Stek na ngalaba ukwu ọbụla na-akwadobe ma na-arụ ọrụ jiri atụmatụ mkpata na mmefu ego kwa afọ. Onyeisi stek na-ejikwa atụmatụ mkpata na mmefu ego stek, ma bishọp na-ejikwa atụmatụ mkpata na mmefu ego ngalaba ukwu.

Ntuziaka niile ka edepụtara n’okpuru:

  • Nyochaa ego ole e mefuru n’oge afọ gara aga iji hụ na mmefu ndị na-abịa ọzọ ka a tulere.

  • Gwa otu niile idepụta ihe ndị dị ha mkpa na atụmatụ mmefu ego ha n’ozuzu.

  • Dekọta atụmatụ mkpata na mmefu niile jiri omume atụmatụ ime mkpata na mmefu niile akwadoro.

34.6.2

Ego ole ekwere na Atụmatụ Mkpata na Mmefu ego

34.6.2.1

Nkenye Atụmatụ mkpata na mmefu

Ego atụmatụ mkpata na mmefu ego ka a na-ekenye kwa ọnwa anọ ọbụla nke dabeere na ọbịbịa nkewa ndị a sotere:

  • Nzukọ oriri nsọ

  • Ndịikom nta

  • Ndịinyom nta

  • Ụmụntakịrị Praịmarị gbara afọ 7-10

  • Ndị dimkpa na-anọghị n’ọlụlụ

Ọ dị mkpa inye repọọtụ ọbịbịa n’ụzọ ziri ezi ma n’oge (lee 33.5.1.1).

34.6.2.2

Ojiji Atụmatụ mkpata na mmefu Dabara adaba

Ndịisi stek na ndị bishọp na-agba mbọ ị hụ na ego atụmatụ ole ndị enwere ka emefuru nke ọma.

Ego atụmatụ mkpata na mmefu nke stek na ngalaba ukwu kwesịrị ka eji ya kwụọ ụgwọ maka ihe omume niile, mmemme niile, akwụkwọ ọmụmụ ihe niile, na ihe ndị ọzọ.

34.6.2.3

Atụmatụ mmata na mmefu Gafere Oke

Ego atụmatụ mkpata na mmefu gafere oke ekwesịghị ka emefuo ya. Ego ngalaba ukwu gafere oke kwesịrị ka eweghachi ya na stek.

34.7

Nnyoocha niile

34.7.1

Kọmitii Nnyocha Stek

Onyeisi stek na-ahọpụta otu kọmitii nnyocha stek. Kọmitii nke a na-ahụ na ego niile nke stek na nke ngalaba ukwu ka ejikwara dị ka otu atụmatụ Nzukọ nsọ siri dị.

34.7.3

Nnyocha maka Ego

Ndị nnyocha stek na-enyocha ndekọihe niile nke stek, ngalaba ukwu, na ogige agụgụala ezi na ụlọ niile ugboro abụọ n’afọ.

Onyeisi nduzi nke ngalaba ahụ na klak enyere ọrụ ego kwesịrị ịnọ anọ ịza ajụjụ niile n’oge nnyocha.

34.7.5

Nfunarị, Ohi, Iri ego, ma ọ bụ Iji Ego Nzukọ nsọ N’ụzọ Na-ekwesịghị ekwesị

Onyeisi stek ma ọ bụ onyeisi oche nke kọmitii nnyocha stek kwesịrị ka agwa ya ozugbo ma ọ bụrụ ma:

  • Ego Nzukọ nsọ efuwo ma ọ bụ na ezuwo ya.

  • Onye ndu eriwo ego ma ọ bụ jiri ego Nzukọ nsọ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.

Bipụta